'Kanu anọghị mgbe Ohanaeze na Ipob nwere nzukọ nke o ji ebo ha ebubo'

Nzukọ Ipob na Ohanaeze

Ebe foto si, Ohanaeze/Getty

Onyeisi Ohanaeze Ndigbo n'Anambra Steetị bụ Ichie Damian Okeke Ogene asaala okwu ebubo onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu boro ha maka ịgba mkparịtaụka ha nwere n'anwụ.

Ọ sị na otu n'ime ha kpara bụ etu a ga-eme ka gọọmentị wepu aha Ipob dịka ndị na-eyi ndụ egwu maka na ha anaghị eyi ndụ egwu.

Na Ohanaeze n'uju kwetere na Ipob abụghị ndị na-eyi ndụ egwu na ọ bụ ihe a na-akpa ka a mara etu a ga-esi wepu aha ha.

Ọ sị na ọ bụ ihe a ka ndị Ipob bịara ọgbakọ a gụnyere ọkaiwu ha gwara Ohanaeze ka e mere ha.

Ogene sị na ọ maghị nke bụ na Nnamdi Kanu na-abịaghị nzuko ha nwere ji na-ebo Ohanaeze ebubo.

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu agbarụrụ ihu sị na Ohanaeze gbara mkparịtaụka ha nwere n'anwụ

Ọ sị na ọ na-eche mgbe otu n'ime ndị bịara nzuko a ga-apụta sị na ọ bụghị ihe ha kpara na nzuko a.

Ogene gara n'ihu kwuo na onweghi mgbe ha nyere ndị ntaakụkọ ozi banyere ihe kwuru na ọ bụ odeakwụkwọ Ipob zitere ozi banyere ihe ha kpara na nzuko.

Cheta na onye ndu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu katọrọ etu Ohanaeze ji gbaa mkparịtaụka ha nwere n'anwụ.

O kwuru nke a mgbe ọ na-agbasa ozi n'akara Facebook ya n'ụbọchị Wenesde sị na otu onye ntaakụkọ na-arụrụ 'Vanguard' ọrụ wepụtara na Ipob garOhanaeze na-agba mbọ.

Ọ sị na otu onye ntaakụkọ na-arụrụ 'Vanguard' ọrụ dere na Ipob rịọrọ Ohanaeze ka ha gwa gọọmentị ka e wepu aha ha na ndị na-eyi ndụ egwu.

Nnamdi

Ebe foto si, Getty Image

Kanu sị na ọ bụ eziokwu na ha na Ohanaeze na-enwe mkparịtaụka ugboro abụọ n'Anambra nakwa Enugwu kama na ọ bụghị maka ịrịọ ha arịrịọ n'ụdị ọbụla.

Ọ sị na ọ bụ naanị mkparịtaụka udo bụ ebe ha kwerịkọtara na a gaghị ewepụta ozi ọbụla banyere mkparịtaụka a.

O boro Ohanaeze Ndigbo ebubo na ọ bụ ha nyere onye ntaakụkọ ahụ ikike ka o bipụta ụdị 'akụkọ ụgha' a banyere ndị Ipob.

Kanu gara n'ihu kwuo na ihe mere o ji kwe ka Ipob na Ohanaeze nwee mkparịtaụka n'isi mbụ bụ maka arịọrịọ na okwu ụfọdụ ụmụafọ Igbo ọ na-akwanyere ugwu gwara ya.

Ndị a gụnyere Mbazuluike Amaechi, Pat Utomi, Onyeka Onwenu, Ngozi Odumuo, ọkammụta Nwala, Achịbishọp Obinna, Achịbishop Chukwuma, Achịbishọp Ede na ndị ọzọ.

Kanu dọrọ aka na ntị na o nwere ozi niile banyere mkparịtaụka na ọ bụrụ Ohanaeze kpaa ụdị agwa ọzọ na ọ ga-agba ihe niile n'anwụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Say No To Rape: 'Etu ụmụagbọghọ si dinaa m n'ike mgbe m dị afọ ise'