Anyị ga-akwado onye ga-arụrụ ndị Igbo ọrụ - Ntoroọbịa Ohanaeze Ndigbo

Aha onyonyo, Anyị chọrọ mmepe ala Igbo

Onye na-arụ ọrụ dịka onyeisi ndị ntoroọbịa Ohanaeze Ndigbo n'ụwa niile bụ Kingsley Dozie ekwuola na onweghibeghi pati ọbụla ha na-akwado n'ime ntuliaka na-abịa.

O kwuru nke a mgbe BBC Igbo gbara ajụjụ banyere kepukepu na otu a gwara pati PDP ka ha nye ndị ọwụwanya osote onyeisiala na ntuliaka afọ 2019.

Dozie kwuru na ọ bụ ndị otu ha akwụsịrị ọrụ na-enweghi ezigbo ntuziaka kwuru ụdị okwu dị etu ahụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na onye ha ga-akwado bụ onye ga-aghazigharịobodo Naịjiịa, nke ọzọ bụ onye ga-eme ka ọnọdụ ndị Igbo dị mma n'azụmaahịa nakwa ihe niile.

O kwuru na agbanyeghi mpaghara onyeisiala na osote ya si pụta, na ọ bụrụ na onye ahụ ga-ezi ndị Igbo anya nke ọma, na ha ga-akwado ya.

N'okwu ya "Ọ bụghị naanị ndị ntoroọbịa ga-ekpebi nke a, kama Ohanaeze Ndigbo nke Nnia Nwodo bụ onyeisi ha, Imeobi Ndigbo gụnyere ndị gọvanọ, ndị Eze Igbo na ndị ichie n'ala Igbo."

Dozie sị na ọ bụ naanị ya nwere ikike ikwuchite ọnụ ndị ntoroọbịa Ohanaeze Ndigbo dịka ọ dị ugbua.

"Anyị e degara pati abụọ kachasị na Naịjirịa ugbua akwụkwọ ozi bụ nke rụtụrụ aka n'ihe Ndigbo chọrọ, iji nweta nkwado si n'aka Ndigbo "

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: