US Election 2020: Iwu anọ Donald Trump tinyere nke Joe Biden ga-emegharị n'egbughị oge

Joe Biden na Donald Trump
Nkọwa foto, Onyeisiala Donald Trump ekwetebeghi na Joe Biden emeriela ya na ntuliaka ahụ.

Joe Biden, onye meriri ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Amerịka, amalitela iwepụta atụmatụ ya maka oge ọ ga-arigoro n'oche onyeisiala n'ọnwa Jenụwarị afọ 2021.

Nke a na-abịa n'agbanyeghị na onyeisiala Donald Trump ekwebeghị ekweta na ntuliaka nke afọ a akwaala ya.

Aha onyonyo, Daddy Hezekiah: E meghi m ihe m meere Donald Trump maka "Visa"

Dịka ụlọ ntaakụkọ dị icheiche na mba Aemrịka si depụta, Biden ga-agbanwe ọtụtụ iwu Trump tinyere n'egbughị oge ọbụla.

Ụfọdụ iwu ndị a gụnyere:

  • Biden ga-etinyeghachi aha Amerịka na nkwekọrịta mba ụwa gbasara mgbanwe ihu eligwe bụ nke Trump wepụrụ aha Amerịka n'oge mbụ
  • Amerịka ga-esonyekwara otu ahụike mbaụwa bụ 'World Health Organisation' bụ nke Trump wepụburu aha Amerịka
  • Biden ga-ewepu mmachi Trump machiri mba ndị ụka alakụba asaaa ịbata mba ahụ
  • Biden ga-etinyeghachi iwu nke onyeisiala Barrack Obama tinyeburu gbasara ndị mbịarambịara batara mba Amerịka oge ha ka dị na nwata. Cheta na Trump wepụrụ iwu a oge ọ nọ n'ọchịchị

Ndị ha na Joe Biden na-arụkọ ọrụ kwuru na ihe mbụ ọ ga-amalite bụ etu a ga-esi butuo ọnụọgụgụ ndị na-ebute nje coronavirus n'Amerịka.

Ihe nke abụọ Biden ga-agbakwasa ụkwụ bụ iwulite ọnọdụ Akụnụba nke mba Amerịka.

Nke atọ bụ ibu agha megide ịkpa oke agbụrụ nke Bekee kpọrọ 'racism'.

Ebe nke anọ bụ ileba anya n'okwu gbasara mgbanwe ihu eligwe (climate change).

Ihe isii Naịjirịa nwereike ịmụta na ntuliaka mba Amerịka

Trump na ndí Naíjiría

Echi ka kpọtọkpọtọ ga-agba n'ihu ehi na ntuliaka mba Amerịka.

Echi ka aga amata mbe naabọ nke bụ oke n'ime Onyeisiala Donald Trump nke Republican na Joe Biden nke Democrat.

Ezigbo ihe ịrịbaama mere na ntuliaka a maka etu ndị mmadụ siri were iwe na ọnụma pụta ịme ya bụ ntuliaka.

Onyeisi ntụliaka mba ahụ bụ ọkammụta mahadum nke Florida bụ Michael McDonald sị na ihe dịka nde mmadụ iri itoolu na atọ, otu narị na iri na atọ, na iri asaa (93,131,017) atụọlarị vootu kemgbe Sụnde bụ ụnyaahụ. Ọnụọgụ a akarịala otu ọkara n'ime atọ bụ ndị debere aha ha maka ya bụ ntuliaka.

Ụdị ihe a menubeghị na narị afọ Amerịka tụwara vootu.

Nke a ga-abụ maka ndọrọndọrọ nke afọ a siri taa akpụ n'etiti Trump na Biden.

Tupu ntuliaka a azọnye ukwu, nrụrịta ụka mba Biden na Trump mere dị ka ha aga alụ ọgụ.

Mana nke abụọ ha mere gosiri na ha nabatara ndụmọdụ ndị otu ha nyere ha.

Ọnweghị udi ọnụ Trump akọghị Biden.

Ọnwekwaghinụ ụdị ọnụ Biden akọghị Trump.

Mana n'etiti egbe ọnụ n'ile a, e nwere ihe mmụta dị na ntuliaka mba Amerịka.

BBC Juru ndị ụfọdụ bị mba Amerịka ajụjụ maka ihe mmụta ụfọdụ dị na ntuliaka a Naịjirịa kwesiri ịṅọmiri.

Chidozie Ugochukwu bụ onye nkụzị n'Amerịka sị na ihe mmụta ka nkụ na ya bụ ntuliaka.

Ihe mmụta Ise na ntuliaka mba Amerịka

  • Iziga akwụkwọ ntuliaka maọbụ ịga tụọ vootu tupu oge eruo - Maka agha Coronavirus, Amerịka malitere ịme ntuliaka site n'iziga ha n'ụlọọrụ ndị na-ahazị ya bụ agụm vootu.
  • Amerịka na-ata onye ọbụla aka ya dị na nrụrụaka ntuliaka oke ahụhụ.
  • Onye ọzọ bụ Nwaada Igbo bi na Washington DC bụ Chidi Azikiwe sị "ejighị ụra atụrụ ọnwụ n'ebe ntulịaka Amerịka na nke Naịjirịa", maka na ihe dị iche na egbe na egbe karịrị akarị.
  • Chidi sị na agbanyeghị na echị bụ ya bụ ntuliaka, na ebe ahụ ha bi bụ ebe onyeisiala Amerịka bikwa juru oyi ka ọnweghị ihe na-eme.

Ọ sị na tigbo zogbuo adịghị na ntulịaka mba Amerịka, na ọ ga-adị mma ma Naịjirịa mụta iwepu tigbo zọgbuo na ndọrọndọrọ ọchịchị.

  • O kwukwara na ọtụtụ ụmụnwaanyị na-esonye na ndọrọndọrọ chịchị Amerịka, na ọ ga-adịkwa mma ma Naịjirịa mụta ya.
  • "Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-abịa agwa anyị ihe ha ga-emere anyị". Chidi sị na ọ bụ n'ime ihe ndị ndọrọndọrọ gwara ha ka ha ga-eji a mara ka ha aga atụnyere ha ọzọ.