Mgbe a ga-eweda ego ọkụ larịk - Odeakwụkwọ NLC
Emma Ugboaja bụ odeakwụkwọ Nigeria Labour Congress atụrisiela nkwekọrịta ha na gọọmenti etiti nwere gbasara nkwụsị ọrụ.
Ugboaja kwuru na NLC ebidobeghị gụwa ụbọchị ga-eru izu ụka abụọ maka mbụtụ ọnụ ego ọkụ latrịk gọọmenti weliri elu n'ihi na ha ahụbeghị akwụkwọ gosiri na ndị kwesiri ibutu ego a amatala maka mkpebi ahụ.

Ebe foto si, @NLCHQ_ABUJA
Lee ka o si kọwaa ya n'ihe nkiri dị n'elu.
Ndị ọrụ a nabatara nkagbu abụbụọrụ Sept. 28? Lee ihe ha gwara anyị
Ụfọdụ ndị ọrụ ekwuola na ha nabatara etu Nigeria Labour Congress si kagbuo abụbụọrụ ha kwadoburu ime taa bụ ụbọchị Sepụtemba 28 maka mbuli ụgwọ ọkụ latrịk na mmanụ ụgbọala.
Otu onye ọrụ na ministrị Tekịnụzụ nke Abia steeti bụ Chukwuma Igwe, kwuru na ọ gaghị adị mma ịfanye aka n'ụkwụ ebe a ka sicha nnọrọ n'ụlọ maka covid-19 wee pụta.
O kwuru na nke a agaghị enyere akụnaụba obodo aka. Igwe kwuru na o kwenyere na gọọmenti etiti ga-emezu ihe ha kwere na nkwa n'izuụka abụọ ha nyere.
Mana onyeisi otu NLC n'Enugu bụ Virginus Nwobodo, kwuru na ya nabatara mkpebi a kama na ọ bụrụ na gọọmenti etiti emezughi nkwa ha ma izuụka abụọ gafeecha, na ha ga-agbazị abụbụọrụ.
O kwuru na ọ bụrụ na ha ekwughi maka abụbụọrụ a, na o nwereike ma ha enwetala n'ihe niile a gọọmenti kwuru na ha ga-eme.
Nwobodo kwuru na o nweghị onye abụbụọrụ na-amasị makana ọ na-enye akụnaụba obodo nsogbu.

Ebe foto si, Nlc
Ihe ise gbara ọkpụrụkpụ gọọmenti etiti na NLC kwekọrịtara kpatara nkagbu abụbụọrụ a
- Gọọmenti etiti kwetere na ha ga-eweghachị ọnụ ego ọkụ latrik etu ọ dịbu na mbụ ka ha lee anya ka ọ ga-esi gaa mgbe izuụka abụọ gachara
- Ha nyere ikike ka Nigerian National Petroleum Corporation (NNPC) malite ịrụ ọrụ 'refinery' niile dị na Naịjirịa bido ugbua ruo ngwụcha afọ na-abịanụ
- Ndị ọrụ agaghị akwụ ụgwọ ụtụisi n'elu ụgwọ ọnwa opekatampe ọhụrụ gọọmenti etiti wepụtara
- Nkewapụta ego maka ndị ọrụ ga-achọ ibanye azụmahịa nke ọrụ ubi site na ntuziaka Central Bank of Nigeria nakwa Ministrị na-ahụ maka ọrụ ubi
- A ga-etinye ego ụlọ ruru pasenti 10 n'elu ụgwọ ụlọ a na-akwụbu ndị ọrụ mbụ
Ihe ndị mere NLC ji kagbuo abụbụọrụ ha yiri maka Sept. 28

Ebe foto si, NLC social media
Gọọmentị na otu jikọtara ndị ọrụ bụ Nigerian Labour Congress ekpebiela ka ha kwụsịtụ abụbụọrụ ha chọrọ ịgba ruo izuụka abụọ.
Nke a na-abịa dịka gọọmentị kwụsịrị mbuli elu nke ọkụ latrik ma kwee nkwa inyere ndị ọrụ aka n'ụzọ dị iche iche.
Mịnista ọrụ nke steeti bụ Festus Keyamo depụtara n'akara twiter ya na NLC na gọọmenti etiti nwere nkwekọrịta n'elekere abụọ na ụma nke ụzụ ụtụtụ taa bụ ụbọchị iri abụọ na asatọ.

Ebe foto si, Festus keyamo twitter
Keyamo kwuru na ọnụ ego mmanụ ụgbọala ka dị n'aka ndị na-ere ya mana gọọmenti dịka gọọmenti wepụtara enyemaka maka ndị otu ruo izu ụka abụọ.
O kwukwara na gọọmenti kwetara ibutu ụgwọ ọkụ latrịk ruo izu ụka abụọ mana ha hibere otu ga-elebanya na atụmaatụ mbụtụ ego a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Taa bụ ụbọchị 28 nke ọnwa Septemba ka otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) kpebibụrụ na ha ga-amalite abụbụọrụ ha maka mbuli ego ọkụ latrik nakwa nke mmanụ ụgbọala.
Ụnyahụ bụ ụbọchị 27 ka ụfọdụ ndị otu NLC na gọọmenti nọ na-enwe mkparịtaụka ka a mara ma a ga-emere ha ihe kpatara ha ji aga abụbụọrụ.
Mana ruo ugbua, otu NLC edepụtabeghị maọbụ kwuputa ma ya bụ nzụkọ amịtara ha mkpụrụ ka ọ mịtaghị.
Cheta na otu jịkọtara ndị orụ na Naịjiria bụ NLC nyeburu gọọmenti etiti izu ụka abụọ ibutu ọnụego mmanụ ụgbọala maọbụ nke ọkụ latrịk.
Lee akwụkwọ ahụ Keyamo wepụtara dịka nke gọọmenti na otu jịkọtara ndị ọrụ binyere aka.
Nke mbụ

Ebe foto si, Festus Keyamo
Nke abụọ

Ebe foto si, Festus Keyamo
Nke atọ

Ebe foto si, Festus Keyamo
Anyị ka na-eche ịnụ n'ọnụ ndị isi otu jịkọtara ndị ọrụ kpọmkwem maka nkwụsị abụbụọrụ.










