SC Genotype - Gịnị ka ọ bụ?

Ebe foto si, Laycon Instagram
Soshal midia enwurula ọkụ maka etu ndị mmadụ si ekwu na Olamimlekan eji Laycon mara bu genotype SC.
Nke a mere ka ndị mmadụ jụwa maka ihe SC pụtara.
Dọkịta ahụike bụ Chidi Akaghara kwuru na ọ bụ udiri genotype na-anaghị ada ụda ka genotype ndị ọzọ dịka AA, AS nakwa SS.
O kwukwara na adaghị ụda ya mere ka ndị mmadụ ghara ị na-eme nchọpụta maka ya kamgbe.
Mana dọkịta Mcginger Ibeneme kwuru na SC bụ udiri sickle cell ọzọ enwere, inwereike ịkpọ nwanne "sickle cell."
O kwuru na onye bu SC genotype na-esi n'aka otu ndị mụrụ ya nweta S ma nweta C n'aka onye ọzọ .
Njirimara ya yitekwara nke SS makana onye ahụ ga na-aya ahụ mgbe ọbụla.
O kwukwara na anaghị ahụkarị udiri genotype a na Naịjirịa kama a na-ahụkarị ya n'etiti ndị si mba Carribean.
Dọkịta Ibeneme kwuru na iron na-akọkarị n'ahụ onye bu SC nke mere na a ga-agbado anya na-achịkwalata ahụike onye ahụ.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Ihe ise mere ndị 'NGO' jiri gbajọọ iwu 'sickle cell bill' Sam Egwu wepụtara

Ebe foto si, Uche Akolisa
A gụrụ akwụkwọ iwu maka mgbochi ọrịa okponọbara nke Bekee kpọrọ 'sickle cell' agba nke abụọ ya n'Ụlọomeiwu Ukwu ụbọchị Tuzde.
Mana ọtụtụ otu abụghị nke gọọmenti na-agba mbọ maka ọdịmma ndị nwere ọrịa 'Sickle cell' gbajọrọ iwu ahụ nke Sam Egwu bụ Sinetọ na-anọchite Ebonyi-North n'Ụlọomeiwu Ukwu wepụtara.
Ha kwuru na ndị haziri ya bụ akwụkwọ iwu akpọghị ndị ya bụ okwu ahụ metụtara (stakeholders) oku ka ha tụnye alo ga-eme ka iwu ahụ mịta ezi mkpụrụ.
Ha rụtụkwara aka na okwu igbochi ụfọdụ mmadụ ịlụ onwe ha n'ihi ụdị ọbara ha nwere megidere ikike dịrị onye dị n'iwu Naijiria.

Ebe foto si, Sam Ominyi Egwu/Facebook
Akwụkwọ iwu 'Sickle cell' Sam Egwu wepụtara n'ụlọomeiwu Naijiria chọrọ ka a enwee iwu nke ga-eme ọtụtụ ihe maka ọrịa okponọbara gụnyere :
- Inye ndị ọrụ ministrị ahụike gọọmenti etiti ikike ihọta ụlọọgwụ gọọmenti na nke ndị nkiti bụ ndị ọ ga-abụ ọrụ ha ịgbasa ozi maka mgbochi, na ịhazị ọrụ gbasara 'sickle cell'
- Inye ministrị ahụike ikike ịnata ihe onyinye maọbụ ụtụ ewetara maka ịgwọ ọrịa 'Sickle cell' nakwa ike ya ka o kwesiri na-enweghị muchi muchi ọbụla
- Ime ka ndị ọnụ na-eru n'okwu gbasara ọrịa 'Sickle cell' nwee ike igbochi nakwa izisa ozi gbasara 'Sickle cell' ma meekwa ka ewepụta otu ụzọ aga esi na-agwọ ya bụ ọrịa.
- Ịhụ na a gbasara ozi gbasara 'Sickle cell' n'obodo niile iji kwụsị ndị bu ọrịa n'ime ahụ ịlụkọrịta onwe ha.
Mana ndị otu abụghị nke gọọmenti kwuru na ya bụ akwụkwọ iwu adabachaghị n'ihi ụdị asụsụ e jiri dee ya, na ihe ndị kwesịrị ka etinye adịghị na ya nakwa ihe dị na ya ekwesịghị ịdị ya.
Lee ebe ụfọdụ ha kwuru iwu ahụ si eri mperi:
1. Ịkpụ mmadụ isi mgbe ọ nọghị ya
Onye nchikọta National Sickle Cell Foundation bụ Dkta Annette Akinsete sị na ọ bụrụ na ha chọrọ ime ihe ndị mmadụ ga-anabata, na ha kwesiri ịkpọ ndị ya bụ ọrịa metutara na ndị ọkachamara n'ihe gbasara "genetic counselling" n'olu Bekee ka ha tụnye alo na ya bụ okwu a maka na anaghị akpụ mmadụ isi n'azụ ya.
Toyin Adesola, onyeisi otu 'Sickle Cell Management and Advocacy Initiative' kwadoro ihe Akinsete kwuru sị,"Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ihe gbasara ọrịa okponọbara, ị kpọọ ndị maa maka ya, ndị na-arụ ọrụ gbasara ya nakwa ndị ya bụ ọrịa na-enye nsogbu."

Ebe foto si, Sickle Cell Foundation of Nigeria
2. Ime ka ọ bụrụ ịda iwu mmadụ ịlụ onye masịrị ya
Dkta Annette Akinsete sị na akwụkwọ iwu ahụ chọrọ i me ka ọ bụrụ ịda iwu mmadụ iso obi ya n'ihe gbasara ịlụ onye masịrị ya.
"Nke a megidere ikike dịrị onye dịka o siri dị n'iwu Naijiria. A ma m na ọ gaghị enwe isi."
Akinsete ji mgbe ndị agha na-achị n'Oyo steeti, mgbe ha chọrọ iti ụdị iwu ahụ bụ nke ọ sị mara afọ n'ala mgbe ahụ maa atụ.
Akinsete kọwara mkpa nkuzi na mgbazi maka ọrịa okponọbara dị mkpa ma sị na ụfọdụ mmadụ na-esi onwu na ha ga-anụrịrị agbanyeghị ntuziaka niile e nyere ha.
"Nchọpụta gosiri na ụfọdụ na-ekpebi na ha agaghị amụ nwa, ha gaa kuru nwa."
"O kwesiri inye ndị dị otu a ohere ikwu ka ha ga-esi jikọrọ onwe ha."
Winifred Otokhina nke TonyMay Foundation jụrụ ajụjụ sị na ọ bụrụ na e mee ya iwu na onye ọbụla ga-eme nnyocha ọbụla tupu ha alụọ, ma gbochie ndị nwere AS maọbụ SS ilụ onwe ha,"Kedụ maka ndị chee na ha nwere AA mana ndị lab edehie mpụtara ụdị ọbara ha nwere nke Bekee kpọrọ 'misdiagnosis'.
3. O kwesịrị ịbụ 'ibelata' ọ bụghị 'ikpochapụ' ọrịa okponọbara
Ndị otu na-agba mbọ maka ọdịmma ndị nwere ọrịa okponọbara sịrị na ọ bụrụ na ndị omeiwu chọrọ ime ihe nke ọma, na "ọnụ okwu ha kwesiri ịna-ekwu bụ maka 'igbochi', 'ịkwado ịgbasa ozi' na 'ịgbazị ụzọ' ọ bụghị 'ikpochapụ" ọrịa okponaọbara, maka na ọrịa ahụ enweghị mkpochapụ.
"Ị nụ mkpochapụ, kedụ ihe ị chọrọ ime? Ị ga-egbuchapụ ndị niile nwere ọrịa ahụ?"
Akinsete sị na ọ bụrụgodi na e nwere ike ikpochapụ ndị nwere ike ibute ọrịa okponaọbara site na alụmdinanwunye, kedụ maka ndị na-amụta nwa na alụbeghị di?
4.Iwu ahụ ekwughị maka nsogbu dịrị ndị nwere ọrịa sickle cell

Ebe foto si, Toyin Adesola/Facebook
Toyin Adesola nke Sickle Cell Management and Advocacy Initiative onye tụrụ arịrị sị na 'o nweghị ndị ọrịa a metụtara a kpọrọ oku sị n'iwu ahụ ezughị oke.
Adesola sị na akwụkwọ "iwu nke a elebaghị anya n'ọnọdụ ndị nwerela ọrịa okponaọbara na nsogbu ha na-ahụ inweta nleta ahụike zuru oke na Naijiria."
Ọ gara n'ihu kọwa na iwu ahụ na-ekwu maka naanị ndị nwere AS na SS ma chezọọ na e nwere ndị enweghị ụdị ọbara mana ha nwere ike ịmụta nwa nwere ọrịa okponọbara.
"Ụfọdụ amaghị ndịiche dị na-etiti "genotype' na 'Blood Group.'"
Adesola gara n'ihu rịọ ka "Ụlọoemiwu kpo oku ndị na-arụ ọrụ n'ihe gbasara ọrịa okponaọbara ka a kpa maka akwụkwọ iwu ahụ."

Ebe foto si, Winifred Otokhina
5. O nwere ndị agụpụrụ n'iwu ahụ
Winifred Otokhina nke TonyMay Foundation kwuru na akwụkwọ iwu ahụ ekwụghị maka etu a ga-esi enyere ndị nwere ọrịa okponọbara aka ịnata nleta na oke luru ha dịka mmadụ.
Otokhina tụrụ arịrị na "Ndị nwere okponaoba anaghị enweta ohere inweta ọrụ dịka ndị ọzọ" mana iwu ahụ ekwughị maka ya.
Mbọ BBC gbara inweta ọsịsa Sam Egwu amịtaghị mkpụrụ dịka ọ zaghị ekwentị ya nke ọ na-asa ozi e zigara ya n'ekwenti.










