Dyslexia, Autism na ọrịa ndị ọzọ ndị Naịjirịa na-aghọtaghie ma jiri akpaso ndị na-arịa ya oke

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
N'oge mbu, ha dị ọtụtụ ọrịa nke ndị Igbo na-aghọtachaghị nke ọma nke mere na ha anaghị elebara onye nwere ụdị ọria ndị a anya nke ọma.
Oge ụfọdụ ndị mmadụ na-emekpa ndị na-arịa orịa ndị a ahu, dịka a ga-asị na ọ bụ ha mere onwe ha ihe ha na-arịa.
Mana ugbua, dịka nnyocha ahụike na-abawanye, o doola anya na ihe ndị nnanna anyi ha chere gbasara ụfọdụ ọria abụghị ya n'eziokwu.
Lee ụfọdụ ọrịa ndi ahu nakwa etu e kwesịrị isi meso onye nwere ya omume:
Dyslexia

Ebe foto si, Getty Images
Nke a bụ ọrịa ụbụrụ nke nwere ike ime ka nwata ghara i na-amụta akwukwo dika ibe ya si amụta.
Ọ bụrụ na nne na nna akpachapụghị anya, ha agaghị ama na nwa ha nwere 'dyslexia', ha ga na-asị na nwata ahụ bụ iti bọrịbọ.
Mana nchọpụta gosiri na ndị nwere 'dyslexia' na-aka eji ihe eserese amụta ihe ngwangwa karịa ihe ederede.
O dochabeghi anya ihe na-akpata ọrịa 'dyslexia' mana nnyocha egosila na umuaka nwere oria a na-enwekwa onyinye pụrụ iche.
Ọ dịịrị nne na nna nwata dị otu a itinye anya na mmiri chọputa onyinye ahụ nwa ya nwere.
Sickle Cell Anaemia (Ogbanje)
N'oge gboo, ọ bụrụ na nwa mmadụ nwụọ ugboro ugboro, ndi mmadu ga asi na nwa ahụ bụ ọgbanje.
A ga-asị na nwa ahụ si n'ala mmụọ abịa emekpa ndị mụrụ ya ahụ.
Nwa di otu a nwụọ, a na-eji mma dị nkọ kawachaa ya ahụ, maọbụ pịa ozu ya ụtarị nke oma, buru n'uche na nke ahu ga-egbochi ya ịlọghachi ọzọ.
Mana ihe ndị a abụchaghị eziokwu.
Nnyocha egosila na nwa dị otu a nwere ike inwe ọrịa 'sickle cell' nke bụ ọrịa ọbara ọ natara site n'aka nne na nna ya.
Ihe na-akpata 'sickle cell' bụ mgbe nne na nna nwere ụdị obara 'AS', nwa ha nwere ike bụrụ 'SS'.
Ụdị nwa dị otu a kwesiri ka a kpachapụrụ ya anya nke ọma, maka na nnyocha gosiri na o nwere mgbe ọ ga-etoruo, o toffee ya bụ ọrịa.
Ndị mmadụ kwesịkwara ịga nnyocha tupu ha alụọ onwe ha iji mata ma ọbara ha abụọ ọ ga-agakọ.
Mental health
Mgbe ọbụla mmadụ kpawara agwa n'ụzọ dị aṅaa, ọtụtụ na-eche na onye ahụ apụọla ara.
Ihe ọzọ bụ ịtụ onye ahụ ịga, maọbụ ịkpọrọ ya gawa ụlọ dibia maọbụ ụlọ ekpere.
Mana nnyocha egosila na ọbụghị ọrịa isi niile bụ isi mgbaka.
Ọtụtụ n'ime ha bụ ihe a ga-eji nke bekee kpọrọ 'psycho-therapy' gwọọ.
'Psycho-therapy' pụtara iji okwu ọnụ na ajụjụ dịgasị icheiche chọpụta ihe mmadụ na eche ma mara etu a ga-esi soo ya.
Ha dị ọtụtụ ihe nwere ike ime ka isi gbaṅaa mmadu mana ọpụtaghị na onye ahụ agbapụla ara.
Ihe ndị a gụnyere: Obi mmapu, obi ịda mba, nnukwu ihe mwute, dgz.
Ihe e kwesiri ime bụ ịkpọga onye di otua ebe ndi ọkacha mara n'ọrịa isi ga-elebara ya anya.
Autism
'Autism' bụ ọrịa na-emetụta ụbụrụ ọkachasị mgbe mmadụ ka na-eto eto.
O dochabeghi ndi ọkacha mara anya ihe na-akpata ya bụ ọrịa, mana nnyocha egosila na ụbụrụ ndị nwere 'autism' na nke ndị ọzọ anaghị abụcha otu ihe.
Mana ọ dị mwute na ọtụtụ na-akpọ ndị nwere ọria 'imbecile' ma were ha na-eme ihe ọchị.
Nke a jọgburu onwe ya. Ndi nwere 'autism' bụ mmadu zuru oke ma nwee uche zuru oke.
Naanị ihe di iche bụ na etu ha si ahụta ihe dị iche n'etu ndi ọzọ si ahụta ya.
Ọ bụrụ na a kpachapụrụ ha anya ma nye ha ọzụzụ kwesịrị ekwesị, ndi nwere 'autism' na-eme ihe gbara mmadu gharịị maka na ụbụrụ ha bu ọpụrụiche.
Speech impairment

Ebe foto si, Getty Images
O nwere ọrịa nwere ike ime mmadụ anaghị ekwucha okwu ọfụma dịka ndị ọzọ.
Ịsụ nsụ (stammering) nakwa nke bekee kpọrọ 'stuttering' bụcha ọnọdụ nwere ike imetụta etu mmadu si ekwu okwu.
Mana oge ụfọdụ, ndị mmadụ na-achị ndị dị otu a ọchị ma were ha na-eme ihe akaje.
Oge ufodu kwa, a na-agwa onye na asụ nsụ ka o were ogele na-aṅu mmiri ka nsụ ya laa.
Ihe ndị a abụghị etu o kwesiri ịdị.
E nwere ndị ọkacha mara ga-elebara ndị nwere ụdị ọnọdụ a anya ma nye ha ọgwụgwọ zuru oke ka ha kawanye mma.
















