Ebidola nnyocha maka ebubo na onye uweojii gburu onyeisi ya n'Eziorsu Oguta LGA dị n'Imo Steeti

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Ebere Ekeopara
- Ndị mere akụkọ a, Reporter, Igbo Service
Kọmịshọna ndị uweojii n'Imo steeti bụ Isaac Olutayo Akinmoyede enyela iwu ka ebido nyocha ma chọpụta ihe mere dịka akụkọ na-ekwu na otu onye uweojii gbagburu onyeisi ya n'okpuru ọchịchị Eziorsu Oguta nke dị n'Imo steeti.
Akụkọ na-ekwu na ọ bụ mgbe ha nọ n'ọrụ ka ya bụ ihe mere.
Ihe anyị maara maka ebubo a

Akụkọ si Ugwuta, Imo steeti eru anyị ntị na-ekwu na ndị Eziorsu nọ na mgbagharị ugbua n'ihi na otu onye uweojii nọ na "checkpoint" werela egbe ya gbapụ onye uweojii ibe ya isi, ọ nwụnyụọ anya pịị.
Mazi Godson Ezike bụ onye Eziorsu gwara BBC na ya bụ mkpa mkpa mere n'ehihie Tọzde, ụbọchị 24 nke ọnwa Sepụtemba.
Ọ kọrọ na ya bụ ihe sotere nghọtahie malitere oge uweojii kwụsịrị nwaafọ Eziorsu bụ Onyeka Ukachukwu na mgbochi ụzọ ha Bekee na-akpọ "checkpoint" were malite ịmaja ya sị na ọ ga-agbagbu ya.
"Ka ndị uweojii na-amaja ya, nwaokorobia ahụ gara zoo n'akụkụ ụgbọala ndị uweojii dị ebe ahụ. Ka onye uweojii ahụ chọrọ ịgba ebe, ọ bụzị onyeisi ya nọ ebe ahụ ka ọ gbara egbe."
Ọ sị na onye uweojii ahụ mere ka ọ gbaa ọsọ mana nwaokorobịa ahụ ọ na-atụ egbe gbatara ọsọ jide ya.

Ebe foto si, Getty/AFP
"Ndị uweojii mechara bịa Eziorsu ime nnyocha maka ihe a mere. Ka ọ dị ugbua ndị uweojii abịala buru ozu onye uweojii a gbagburu ma kpụrụkwa onye uweojii gbagburu mmadụ nakwa ụmụnne abụọ ahụ Onyeka na Ugonna Ukachukwu ya na ha nwere nsogbu ahụ."
Ugbua, Maazị Ezike sị na nwanne nwaokorobia ahụ bụ Ugochukwu Ukachukwu na-arịọ ndị uweojii ka ha hapụ ya n'ihi na ọ bụghị ndị "bunkering" ha na-achọ.
Nkọwa ya bụ na Onyeka Ukachukwu ahụ ya na onye uweojii a nwere nsogbu tupu ọ gbaa egbe, bụ onye agha elu Naịjirịa.
Ọ sịkwa na onye uweojii ahụ e gburu bụ onye mpaghara Egbema dịkwa na steeti ahụ.
Ezike na-arụtụ aka na okporo mmanụ agbịdị si be ha gafee so ebute ụdịrị nsogbu a.










