Chuba Okadigbo: Ihe ise mere Igbo agaghị eji echefu ' Oyi of Oyi'

Chuba Okadigbo

Ebe foto si, Chuks Nwanne

Taa bụ abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Septemba ka o mere afọ iri na asaa Chuba Okadigbo bụ aha onye ọbụla ma ihe ekwe na-akụ na ndọrọndọrọ ọchịchị Naijirịa ma nke ọma, jiri laa mụọ.

Dike Igbo a bụ ọkammụta n' okwu ndọrọndọrọ ọchịchị bụ onyeisi ndị Ụlọomeiwu Ukwu nke Naijirịa site n'afọ 1999 rụo afọ 2000.

Ọ bụ mgbe Olusegun Obasanjo nọ n'oche dịka onyeisiala Naijirịa ka Okadigbo banyere n'ọkwa onyeisi ndị Ụlọomeiwu Ukwu nke Naijirịa.

Na-agbanyeghị na ọ nwụrụ mgbe ọ di afọ iri isii na abụọ, ndụ o biri mere na ọtụtụ ndi Naijirịa ọkachasị, nfdị Igbo agaghi echefu ya.

Lee ihe ise gbara ọkpụrụkpụ e ji echeta ya:

1. Njem ya n'ime Gọmenti na ndọrọndọrọ ọchịchi Naijirịa

E mere Chuba Okadigbo onye ndụmọdụ onyeisiala Naijirịa mgbe Shehu Shagarị bụ onyeisi obodo n'afọ 1979.

O soro na otu 'Social Democratic Party' mgbe a chọrọ i nyefe ndị nkịti ọchịchị n'afọ 1993.

Okadigbo nọ n'otu 'Peoples Democratic Movement' mgbe Sani Abacha chọrọ inyefe ndị nkịtị ochịchị.

Mgbe gọọmentị nke Fourth Repuplic nọ n'ọchịchị ka a hopụtara ya dịka onye omeiwu na-anọchịte mpaghara Anambra North.

Ụfọdụ na-atụ anya na ọ bu ya ga-abụ onyeisi ndị omeiwu kama ọ bụ Evans Enwerem ka ndị omeiwu họpụtara dịka onyeisi ha.

Kama o rughị otu afọ e wepụ Enwerem dịka onyeisi ndị ụlọ omeiwu maka ebubo nrụrụaka.

E mechara jiri Okadigbo dochie anya Evans Enwerem.

Ndụ ụlọomeiwu mechara wepụ Okadigbo dịka onyeisi ndị ụlọ omeiwu maka ebubo nrụrụaka.

Mana Okadigbo bụ a-kwaa-a-kwụrụ, e meechara ọ laghachịrị dịka onye omeiwu na-anọchịte ndị mpaghara Anambra -South n'Ụlọomeiwu Ukwu.

N'afọ 2003 ka Okadigbo na Muhammadu Buhari soro zọọ ọkwa onyeisiala Naijirịa dịka osote Buhari n'ọkọlọtọ 'All Nigeria Peoples Party' mana Olusegun Obasanjo na Atiku Abubakar nke 'PDP meriri ha.

Chuba Okadigbo

Ebe foto si, The Sun Nigeria/Facebook

2. Mgbe mkpọrọ ọchịchị ụlọomeiwu Naijirịa larụrụ Ogbunike.

Otu ihe mere nke ndị mmadụ aghaghị echefu bụ na Chuba Okadigbo dịka onyeisi Ụlọoimeiwu Sineti bu ọfọụlọomeiwu laa n'ụlọ ya n'afọ 2000.

Akụkọ na-akọwa na ọ bụ ka Okadigbo nụtara kepukepu na a chọrọ iwepụ ya dịka Onyeisi Sineti, ya emechie ọgbakọ ha nwa oge, buru ọfọ ụlọmeiwu nke Bekee kpọrọ 'Mace' laa n'obodo ya bụ Ogbunike n'abalị iri atọ na otu ọnwa Maachị afọ 2000.

Dịka iwu siri dị, enweghị mkpebi ọbụla e mere ga-enwe isi ma ọ bụru na ya bụ ọfọ ụlọomeiwu anọghị ya.

Mgbe ndị uweojii bịara ụlọ ya ị nara ya ọfọ ọchịchị ahụ, ọ gwara ha na ọ ga-anwụ tupu o kwere ka ha were ya.

Aha onyonyo, Ụmụaka Biafra: Etu ndị etobeghi ntoroọbịa jiri hụ agha

Mana mbọ ahụ ọ gbara amịtachaghị mkpụrụ n'ihi nkata a kpaara ya nke ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị na-arụ onyeisiala oge ahụ bụ Olusegun Obasanjo aka, mechara kpudo ya.

E mechara wepụ ya n'ọchịchị dịka onyeisi Sineti.

3. Oyi bụ onwe maara etu e si ahazi okwu

Ihe ọzọ ndị mmadụ ji mara Okadigbo bụ na ọ bụ onye nwere nka ịhazi okwu ọ na-atọ ka nnu na ntị ma juputa na nnukwu amamihe.

Iji maa atụ, ọ sị "Ọ bụrụ na ịhụnanya agbụrụ maọbụ okpukperechi maọbụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị mechiri gị anya nke na ịgaghị akwado eziokwu maọbụ ikpe kwụ ọtọ, mara na agụmakwụkwọ ma amamihe gị lara n'iyi. Ọ bụrụ na inweghị ike ichemi echiche dị ka onye nwere akọnuche, mara na ị bụ ọghọm."

4. Agụmakwụkwọ Chuba Okadigbo

Dịka onye agụm akwụkwo na-amasị, Chuba Okadigbo nwetara asambodo Masters na Political Science, ma nweta kwa asambodo dịka ọkammụta na Philosophy na Political sceince.

Okadigbo rụru ọru dịka onye nkụzị na mahadum Howard University nke mba Amerịka.

5. Chuba Wilberforce Okadigbo ( Disemba 17, 1941 - Septemba 25, 2003)

Chuba Okadigbo bụ nwaafọ Umueri, nke dị n'obodo Ogbunike n'okpuru ọchịchị Oyi nke di na Anambra steeti. A mụrụ ya n'Asaba Delta steeti n'afọ 1941.

Okadigbo nwere asambodo ndọrọndọrọ ọchịchị nke Mahadum nke Catholic Universoty Of America dị na Washington DC, ma tụru ugo dịka ọkammụta n'agụmagụ Philosphy na Political Science.

Dịka ezigbo nwaafọ Oyi ọ bụ, e chịrị ya echichi dịka 'Oyi Nke Oyi'.

Okadigbo nwụrụ n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Sepụtemba afọ 2003 site n'aka nsogbu iku ume.

Aha onyonyo, Biafra at 50": Kaduna Nzeogwu na-ebugharị ogbunigwe n'akpa ya mgbe ọ dị ndụ"

O mere ihe ndi a nile n'ime afọ abụọ site n'afọ 1973 ruo afọ 1975.

Okadigbo rụkwara ọrụ na Mahadum nke University Of Nigeria nke di na Nsụkka dịka ọka nkụzi nke Political Sceince ma rụọ kwa dịka ọkankụzi na Bigard Memorial Senior Seminary nke dị n'Enwugwu Steeti.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: