Mbazulike Amechi: Ọ bụrụ na ndị ọbụla eketeghi oke ha na Naịjirịa ọ ga-ekewa

Aha onyonyo, Ọgụ Biafra kwesịrị ịbụ ọgụ akọnuche, ọ bụghị nke egbe na mma - Mbazulike Amechi

Mbazulike Amechi bụ otu onye so gbaa mbọ maka nnwereonwe Naịjirịa ebe afọ 1960 etinyela ọnụ n'ihe gbasara ọchịchọ Biafra.

O kwuru sị na otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ ndị na-achọ nnwereonwe Biafra selitere isi ugbua n'ihi iwe maka etu ha si hụ obodo Naịjirịa.

Ma kwuo na ebe ihe masịrị ha bụ ka ha nọrọ ma chịa onwe ha, na ọ ga-adị mma ka a tụọ vootu mara ma ha a ga-apụ na Naịjirịa maọbụ ha a ga-anọ.

Amechi kwuru sị na agaghịzị eji ọgụ na mma lụọ agha Biafra, kama na ọ bụzị akọnauche ka a ga-ejizi alụ ya.

Ọ gara n'ihu kwuo sị na ọ bụrụ na agaghị eme ndị Igbo ka e mere ibe ha na Naịjiria, na ọ ga-aka mma ka a hapụ ndị Igbo ka ha gawara onwe ha, n'agbanyeghi na ọ gaghị amasị ya ka Naịjiria kewaa.

Ndị mere akụkọ a bụ Ebere Ekeopara na Nnamdi Agbanelo