Victor Olaiya: Lee ihe ndị a ga eji echeta otiegwu a larala mmụọ

Ebe foto si, Youtube
Chaị! Ala eriela ihe o! Otiegwu Victor Olaiya alaala mmụọ.
Olaiya nwụrụ n'mgbede ụbọchị Wenezde bụ abalị iri na abụọ nke ọnwa Febrụwarị 2020.

Ebe foto si, Youtube
Ọ bụ n'ụlọọgwụ mahadum Legọs ka ọ nọrọ nwụọ ka ọ rịachara ọrịa nwa oge.
Ọ gbara afọ 89 tupu ọ wụsa ọwara.
Victor Olaiya - Onye egwu

Ebe foto si, Youtube
Akọwa akụkọ ndị mere ka a na-anụ aha Naịjirịa n'ihe gbasara iti egwu, a ga-akpọrịrị aha Victor Olaiya.
Ihe e ji mara ya bụ igbu opi Bekee na-akpọ "trumpet".
Olaiya bụ onye Ijesha-Ishu dị n'Ekiti steeti, mana ọ bụ na Calabar ka a mụrụ ya.
Ka ọ gụchara akwụkwọ sekọndịrị na Legọs, nna ya zipuru ya mba Amerịka ka ọ gaa ọzụzụ dịka Njinia, mana Olaiya ruru ebe ahụ mụwa maka iti egwu.
Nke a wutere nne na nna ya nke ukwu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
O hibere otu egwu ya nke ọ kpọrọ 'cool cats' n'afọ 1954.
Oge Ezenwanyị mba Briten bụ Elizabet bịara Naịjirịa na 1956, ọ bụ Olaiya na ndị egwu ya tiri egwu iji nabata ya.
Egwu ya gụnyere "Ọmọ Pụpa", "Baby Jọwọ", "Sisi Eko", na ọtụtụ ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Akụkọ kọrọ na Fela Kuti so na ndị otu egwu Victor Olaiya tupu o mechaa pụọ malite otu egwu nke aka ya.
Efere egwu Olaiya tipụtara karịrị 20.
Oge ikpeazu o tiri egwu dara ụda bụ na 2013 mgbe ya na Tuface Idibia tigharịrị 'Baby Jọwọ'
Victor Olaiya lụrụ ọtụtụ nwaanyị ma nwekwaa ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ bụ ndị na-eru ụjụ ọnwụ ya.
Gọọmentị Naịjiria kwanyekwara Olaiya ugwu ma nye ya nzere 'Officer of the Order of the Niger' (OON).

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:















