Kunle Afolayan na Mike Ezuruonye: Ndo Kunle Afolayan gwara m esighi ya n'obi

Aha onyonyo, Gịnị na-esere Mike Ezuruonye na Kunle Afolayan?
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Mike Ezuruonye kwuru na ọ wụsala ihe mere n'etiti ya na Kunle Afolayan ebe Afolayan wepụtara ebe mmadụ boro ya ebubo igwu ya wayo, n'ihi na ndị mmadụ rịọrọ ya ka o wetuo obi.

O kwuru na okwu Afolayan jiri saa ya ka nsogbu a dapụtara, nke Afolayan kpọrọ 'arịrịọ', egheghi eghe, na ọ bụ "okwu mkparị".

O kwuru na ihe Afolayan mere ya bụ imebisi ọrụ ya na ihe e ji mara ya, na ọ bụ okwu ka a chọrọ ya.

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

Afolayan na onwe ya gwara BBC na ọ wụsakwuola okwu a, na ọ naghị eme ihe ndị Ezuruonye boro ya, na ọ bụrụ na ọ hụghị ndị Igbo n'anya, na ya na "ndị dị ka Zack Orji, Patience Ozokwor, Ken Erics na ndị ọzọ agaghị emekọ ejije".

Nke a na-abịa dịka Afolayan hichapụrụ ma ihe o dere butere okwu a, ma nke ọ sara dịka Ezuruonye bachara mba ya.

Gịnị na-esere Afolayan na Mike Ezuruonye?

Mike Ezuruonye na Kunle Afolayan

Ebe foto si, Instagram

Ezuruonye bụ onye na-eme ejije na Nollywood na Afolayan na-emepụta ejije, nwere nsogbu dịka Afolayan mere ya ihe ọ kpọrọ ihe adịghị mma n'elu soshal midia.

N'ọnụ Ezuruonye:

Afolayan biputara ozi otu nwaanyị degaara ya n'Instagram ebe o kwuru na Ezuruonye gwuru ya wayo ma napụ ya ọtụtụ ego; na mbiputa okwu ahụ, Afolayan wee dee sị "Hapụkwanụ m o, gịnị gbasara m?"

Nke a kpasuru Ezuruonye ezigbo iwe, mere o ji dee sị "Nkwanye ugwu m nwere n'ebe ị nọ anwụọla pịị... ị na-achọ ime ka ọ bụ na ị maghị na ndị na ndị wayo na-eji aha ndị ome ejije/otiegwu/ndị ndọrọndọrọ ọchịchị/ndị na-ewu ewu anapụ ndị mmadụ ego n'ụwa gbaa gburugburu?

Ka ọ bụ na ị hụbeghị ndị nke ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ na Naịjiria jirila maka m nwụchie...?"

Gịnị mere na ị kpọghị m n'ekwentị maọbụ jụọ m ajụjụ tupu i kesawa ụdịrị akụkọ a n'elu Instagram na Twitter."

Ọ gara n'ihu bo Afolayan ebubo na ọ na-akpaso ndị Igbo oke.

Ezuruonye

Ebe foto si, Instagram

N'ọnụ Afolayan:

Afolayan na onwe ya gwara BBC na ọ wụsakwuola okwu a, na ọ naghị eme ihe ndị Ezuruonye boro ya, na ọ bụrụ na ọ hụghị ndị Igbo n'anya, na ya na "ndị dị ka Zack Orji, Patience Ozokwor, Ken Erics na ndị ọzọ agaghị emekọ ejije".

'Ihe a abụghị nnukwu ihe, agwala m ya ndo n'ihi na Mike aghọtaghị ihe m kwuru'.

Ezuruonye

Ebe foto si, Instagram

Ezuruonye

Ebe foto si, Instagram

Akụkọ ka na-abịa.