Nollywood: E gwuru m chandum mgbe m bidoro - Obi Emelonye
Obi Emelonye bụ onye ntuziaka n'emume ihe nkiri Nollywood kọwara etu o si malite nakwa aghụghọ ndị mmadụ ghọrọ ya n'oge ahụ.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Emelonye sị na ọ bụ ọkaiwu na mba ofesi mana ọ hapụrụ ya banye n'ime ihe nkiri.
Ọ sị na mgbe ọ lọtara n'afọ 2000 ka o bido ime ihe nkiri na Naịjirịa na a ghọrọ ya aghụghọ nke mere o ji laghachị ala Bekee gaa mụọ etu e si atụziaka n'ime ihe nkiri.
Ọ gara n'ihu nye ndụmọdụ na "ọ bụ nwayọọ ka e ji aracha ofe dị ọkụ" n'ihe ọbụla mmadụ na-achọ ime na ndụ ya.
Kirie ihe onyonyo ya n'uju;
Akụkọ ndị ga-amasị gị: