Cyprian Ekwensi: Dike si n'ọkwa 'Director' malite ire komkom rọba n'ihi ịhụnanya Biafra

Cyprain

Ebe foto si, Youtube screengrab

Nkọwa foto, Ekwensi bụ onye isiojii mbụ nwetara ọkwa 'director' na mịnịstrị mgbasaozi na Nịjirịa, mana ọ hapụrụ ọrụ ahụ sonyere Biafra
    • Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Aha Cyprian Ekwensi bụ aha na-ada ụda, ọbụghị sọ na Naịjirịa nakwa Afrịka, kama n'ụwa niile.

Ihe e jikarị mara Ekwensi bụ ide akwụkwọ, mana ọrụ ọ rụrụ oge a lụrụ agha Naịjirịa na Biafra sokwa n'ihe e ji mara ya.

Lee ihe ndị ị kwesịrị ịma maka Cyprian Ekwensi:

Cyprain Ekwensị

Ebe foto si, Youtube screengrab

Nkọwa foto, Cyprian Ekwensị bụ onye nkuzi, onye nlekọta ọhịa (forester), onye mmepụta ọgwụ (pharmacist), onye mgbasa ozi (broadcaster) nakwa onye mmepụta ejije (film maker)
  • Aha ya niile bụ Cyprian Odiatu Duaka Ekwensi
  • A mụrụ ya n'abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Sepụtemba afọ 1921 (Sept. 26, 1921), na Minna, isi obodo Niger State
  • Ọ bụ onye Nkwelle Ezunaka dị n'okpuru ọchịchị Oyi n'Anambra Steeti
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na 'Government College' dị n'Ibadan, nakwa 'Achimota College' nke dị na Ghana
  • Ọ gụkwara na 'School of Forestry dị n'Ibadan
  • Ekwensi mechara nweta ọmụmụ dịka 'Pharmacist' n'ụlọakwụkwọ 'Yaba Technical Institute' na Legọs
  • Ọ lụrụ nwaanyị (Eunice Anyiwo) ma mụta ụmụ ise
  • Ọ nwụrụ n'abalị anọ nke ọnwa Nọvemba afọ 2007
  • Ọ dị afọ 86 oge ọ nwụrụ

Cyprian Ekwensi na agha Biafra

Cyprian Ekwensi na ndị agha Biafra

Ebe foto si, Youtube screengrab

Nkọwa foto, Cyprian Ekwensi bụ onyeisi mgbasa ozi mba Biafra n'oge ahụ

Oge ọgụ Biafra malitere, Ekwensi hapụrụ nnukwu ọkwa o ji na ngalaba mgbasaozi nke gọọmentị Naịjirịa, wee sonyere Biafra.

E nyere ya ọkwa onyeisi mgbasaozi nke Biafra n'oge ahụ.

Lee onyonyo gosiri nke a dị ka ụlọọrụ ntaakụkọ 'Africa Press' si wepụta:

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Oge agha kwụsịrị, Ekwensi malitere ire komkom rọba iji chụta ihe ọ na-eri, n'ihi na ọrụ ya na ngalaba mgbasaozi Naịjirịa alaala.

Lee ihe o kwuru oge otu onye ntaakụkọ n'oge ahụ gbara ya ajụjụ ọnụ maka ya:

Skip YouTube post
Hapụ Google YouTube ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Google YouTube. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Google YouTube iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of YouTube post

Akwụkwọ Cyprian Ekwensi degara

Akwụkwọ Cyprain Ekwensi

Ekwensi dere ọtụtụ akwụkwọ a nụrụ aha ha anụ n'ụwa niile.

Akwụkwọ mbụ o dere bụ n'afọ 1947, mana tupu ọ nwụọ, o bipụtara akwụkwọ karịrị iri anọ (40).

Malite n'afọ 1960 Naịjirịa nwetara nnwereonwe ya, Ekwensi na-ede opekatampe otu akwụkwọ kwa afọ.

Akwụkwọ ya bụ 'Jagua Nana' bụ nke a ga-asị kacha wuo ewuo.

Lee ụfọdụ akwụkwọ ndị o bipụtara:

Cyprain

Ebe foto si, Youtube screengrab

  • When love whispers
  • Jagua Nana
  • Jagua Nana's daughter
  • People of the city
  • Drummer boy
  • Burning grass
  • Samankwe and the highway robbers
  • An African night's entertainment
  • Passport of Mallam Ilia
  • Coal camp boy
  • Juju Rock
  • The Leopard's Claw
  • The Boa Suitor
  • Beautiful Feathers
  • Rainmaker
  • The Great Elephant Bird
  • Gone to Mecca... dịrị gawazie

Cyprian Ekwensi ji akwụkwọ ya bụ Jagua Nana wee rite nturuugo pụrụ iche a kpọrọ 'Dag Hammarskjöld International Prize in Literature', n'afọ 1968.

Ka afọ ya gbagotewere, Ekwensi sonyekwara ụlọọrụ ntaakụkọ 'Drum Magazine' dịka onye odee nke bekee kpọrọ 'columnist'.

Na 2001, Naịjirịa nyekwara ya nkwanye ugwu dịka 'Member of the Federal Republic' (MFR)

George Ekwensi
Nkọwa foto, Nwa Cyprain Ekwensi bụ George Ekwensi bụ onyeisi otu 'Cyprain Ekwensi Foundation'

Nwa ya nwoke bụ George Ekwensi kwuru na nna ya abaghị oke ọgaranya.

Ọ bụ nwa ya nwoke a na-elekọta otu a kpọrọ 'Cyprain Ekwensi Foundation'.

Ọrụ ha bụ ime ka agụmakwụkwọ na-abawanye na Naịjirịa, nakwa inyere ndị nwunye ndị ọrụ nchekwa di ha nwụrụ anwụ aka.

Cyprian Ekwensi na Chimamanda Adichie

Chimamanda Adichie

Ebe foto si, Instagram/Chimamanda

Nkọwa foto, Chimamanda Adichie, ada Igbo e ji ide akwụkwọ mara, kwuru na Cyprian Ekwensi

Ndụ Ekwensi metụrụ ndụ ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa.

Otu onye n'ime ha bụ Chimamanda Adichie, onye kwuru na Cyprain Ekwensi bụ onye kachasị metụta ndụ ya nakwa ọrụ ya dịka ode akwụkwọ.

Na mkparịtaụka o nwere ọtụtụ afọ gara aga, Chimamanda kwuru na ọbụ Ekwensi ka ọ na-elegara anya oge ọ na-eto eto.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Uche Azikiwe: 'Etu Nnamdi Azikiwe si lụọ m'