Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mwakpo ụlọ gọvanọ Imo steeti

Ulọ Uzodinma

Ebe foto si, Screen grab

Otu jịkọtara ndị gọvanọ niile akpọrọ Nigeria Governors' Forum (NGF) akatọla mwakpo ndị omekome wakporo ụlọ Hope Uzodimma bụ gọvanọ Imo steeti.

N'akwụkwọ onyeisi otu ahụ bụ gọvanọ Kayode Fayemi depụtara, ndị gọvanọ kọwara mwakpo ahụ mere n'Epreelu iri abụọ na anọ dịka iwego mwakpo ruo ogo ọzọ jọgburu onwe ya.

N'okwu ha, ndị na-eme mwakpo a mara na ọ bụghị sọ ha nwereike ịnawakpo ndị mmadụ.

Ha kwuru na a ga-agba mbọ hụ na onye ọbụla nyere aka chọpụta ndị kpara mkpa mkpa a.

"Ndị a na-eme ihe bụ obere ọgbakọ na-achọ ka mebie idin'otu Naịjirịa.

Ha chere na kama ndị mmadụ ga na-aga eme udiri mwakpo ahụ n'oge, ọ ga-adị mma ka ha chụọ udo na idinotu ma gbajọọ ihe ọjọ na ihe ike ọbụla na-ebute ịlaniyi.

Ralph Uwazurike bụkwa onyeisi Massob katọkwara ya bụ mwakpo ma kwuo na ọ bụ onye igbo ka e gburu na mwakpo ahụ.

O kwuru na ihe ga-aka mma bụ ikwụsị mmanụ ụgbọala ịpụ n'ọwụwaanyanwụ gawa n'ugwu awụsa.

Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuru ndị otu Indigenous People of Biafra kwuru na ndịagha Naịjirịa enweghị ike ibatali ogbe ndị otu Eastern Security Network wakpoo ha dịka ha si kwu mgbe mkpamkpa a kpachara.

O gwara ụlọọrụ Channels na ndị otu ya ga-emesi gọvanọ Hope Uzodimma nke Imo steeti ike maka etu o si gwa ndị agha ka ha gbagbuo ndị otu ha bụ Ikonso.

Otu onye na-ekwukarị maka ihe na-eme na mpaghara ọwụwa anyanwụ bụ Chukwuka Ofoegbu e ji Ijele speaks mara katọkwara ya bụ mkpa mkpa ma kwuo na ọ bụrụ na op nweghị ihe mere maka ya bụ ihe, ọ ga-esi n;ikwe n'aka gafere mara ọgọdọ.

Cheta na Kọmịshọna mgbasa ozi nke Imo steeti bụ Declan Emelumba kwuru na ọ bụ ndị omekome ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-akwado chọrọ iwakpo ụlọ gọvanọ.

Akụkọ ka na-abịa.