ESN vs Ebubeagu: "Anyị kwadoro ndị ọbụla pụtara ichekwa ala Igbo" - Ohaneze Ndị Igbo

Njirimara Ohaneze

Ebe foto si, Ohaneze

Otu Ohaneze Ndigbo etiela mkpụ na ndị agha Naijirịa na-anwụchi ndị ntoroọbịa n'ala Igbo na nzuzo ọkachasị n'obodo Ohaji na Ugwuta dị n'Imo steeti.

Ha katọkwara nnwụchi a na-anwụchi ndị otu Ipob na Eastern Security Network na enweghị ngwaọgụ a hụrụ n'aka maọbụ ihe gosiri na aka ha ịdị na mpụ.

Ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere otu a bụ Alex Ogbonnia gwara BBC na ọ bụ ihe ọ gụtara n'akụkọ ma na-ajụ, " Enwere ihe dị njo ndị agha a hụrụ ndị ntoroọbịa anyị na-eme ha jiri kpọchie ha? Ọ dịghị mma".

O kwukwara kama na enweghị onye jidere gọvanọ Bala Mohammed oge o kwuru ka ndị ọchị ehi buru egbe na-agagharị.

Aha onyonyo, Eastern Security Network: 'Ọ bụ ndị Gọvanọ ọwụwa anwanwụ ka ụta dịịrị maka ESN'

Enyinnia kwuru na ha chetakwa na mba Ingland ekwuola na ha ga-anabata ndị otu Ipob a na-emegbu na Naijirịa nke mere na ụmụ ntoroọbịa Igbo nwereike ịgbaga mba Ingland.

Gịnị ka Ohaneze nwere ikwu maka iwu mmachi ngagharị na ntuliaka Nnamdi Kanu nyere?

Ogbannia kwuru sị " ihe Ohaneze na-agwa Nnamdi Kanu bụ ya mee ka ya na ndị nna na-akpa nkata tupu ekwuo ihe ga-eme. Mana ịkuli tie iwu ihe ga-eme; mbanụ, ọ bụrụ etu e si eme."

Ọ kọwara na onwereike ọbụrụ na ihe o jiri tie ya bụ iwu bụ ihe ziri ezi kama ekwesịrị ịkpa ya akpa.

Kedụ maka ESN na ebube agụ?

Alex Ogbonnia kọwara na ọ bụ ọrụ gọọmentị ka ọ dịịrị ichekwa obodo.

O kwuru sị" anyị enweghị nsogbu ọbụla gbasara otu ọbụla na-echekwa obodo, kama ọnye ọ bụ ọrụ ha ichekwa ma ndị Ipob na ndị ESN bụ ndị gọọmentị".

Ọ kọwara na onye ọbụla kwadoro ịchekwa ala igbo abụghị ihe ọjọọ.

Ogbonnia kwuru sị, " Ndị bụ ndị Ipob maọbụ ESN bụ ndị Igbo, umụ okoroboa anyị. Anyị chọrọ ka ụmụ okorobia na-echekwa ala anyị. ọ bụ ihe anyị choro, ọ bụ ihe ọma".