Herdsmen Attacks in Ebonyi, Enugu states: Ipob sị na ndịagha Naijiria na-ekpuchi ndị Fulani ochiehi - Ipob

Ebe foto si, Getty Images
Otu nnwereonwe Biafra a kpọrọ 'Indigenuous People of Biafra' eboola ndịagha Naijiria ebubo iji nkata ekpuchi ihe ndị ọchịehi na-eme dịka ha na-egbusi ndị mmadụ aghara agharana Ọwụwa Anyanwụ nakwa Ndida Ndịda.
N'ozi nke odeakwụkwọ otu ahụ bụ Emma Powerful zigara ndị ntaakụkọ ụbọchị Tọzde, Ipob kwuru na ogbugbu ndị ọchịehi gburu ndị Biafra enweghị ihe ha mere n'Enugu na Ebonyi steeti gosiri ewu na ọkụkọ na ndị agha Naijiria na-adọnyere ha ukwu.
Ipob gara n'ihu n'ozi ahụ sị, "Ọnyụpa ndị ọrụ nchekwa Naijria gbara n'ịchụ ma nwuchie ndị kpara mkpamkpa ahụ bụ ihe gosiri n'ezie ihe anyị na-ekwu na ndị ọrụ nchekwa bụ ha na-ekpuchi ndị oyindu egwu na-akpagharị n.Ndida Naijiria ka ha abụ ndị Fulani Ọchịehi."
Ha jụrụ n'ajụjụ sị, "Kedụ ebe ụgbọelu helekọpta ndị agha n'efegharị n'Ọlụ n'ọnwa Febụwarị na-achọ ndị ESN nọ? Kedụ ebe ndịagha gburu ndị Biafra enweghị ngwaọgụ ha ji na-eme mgbatị ahụ n'Emene nọ?operatives in February? Kedụ ebe ndị uweojii nzuzo DSS na-achụgharị ndị Ipob na ndịị na-agba mbọ maka nwereonwe Biafra nọ?"
Cheta na ndị a na-enyo na ha bụ ndị ọchịehi wakporo ma gbuo ọtụtụ ndị mmadụ n'Enugwu nakwa Ebonyi na nsonso a.
Hibenu ndị ọrụ nchekwa nke mpaghara Ọwụwa Anyanwụ - Ohaneze Ndigbo

Otu Ohaneze ndị Igbo akatọọla mwakpo nke ndị a na-eche na ha bụ ndị ọchịehi wakporo ma gbuo ọtụtụ mmadụ n'Ebonyi steeti n'ụbọchị Mọnde, abalị iri atọ nke ọnwa Maachị afọ 2021.
Onyeisi Ohaneze ndị Igbo bụ George Obiozor wepụtara akwụkwọ ozi iji katọọ ya bụ ihe ma kpọọ oku ka ndị gọvanọ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ hibe otu nchekwa nke ha.
O kwuru sị: "Ọ bụ ihe jọgburu onwe ya na gọọmentị etiti achọghị ige ntị n'ihe Ohaneze Ndigbo na-ekwu gbasara ihazigharị ọchịchị Naịjirịa ka mpaghara ọbụla nwee ike ichekwa onwe ha etu o kwesịrị ekwesị."
"N'ihi nke a, anyị bụ ndị Ohaneze Ndigbo n'ụwa niile na-agwa ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ka ha mee ngwangwa hibe otu nchekwa nke ha."
CAN katọkwara mwakpo a

Ebe foto si, Dr. Goddy Okafor/Facebook
Otu jikọrọ ndị okpukpere Christ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bụ 'Christian Association of Nigeria' katọkwara mwakpo a emere n'Ebonyi Steeti.
Onyeisi ndị CAN na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bụ Goddy Okafor kwuru na ya bụ ihe na-awụ akpata oyi ma bụrụkwa nnukwu ihe ọjọọ.
Goddy Okafor gwara ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ka ha kulie n'ụra ma rụọ ọrụ ha iji gbochie ụdị ihe a n'ọdịnihu.
Anyị achọtala ndị gburu mmadụ 15 n'Ebonyi steeti, ha ga-ata ahụhụ dị na ya - David Umahi

Aka na-achị Ebonyi steeti bụ Gọvanọ David Umahi agaala mgbaru ebe ndị a na-eche bụ ndị ọchịehi wakporo ma gbuo ọtụtụ mmadụ n'Ebonyi steeti.
Umahi bụ onye ya na Kọmishọna uweojii nke steeti ahụ na ụfọdụ ndị ọrụ gọọmentị so gaa ya bụ mgbaru, kwuru na ọ bụ mmadụ 15 ka e gburu na ya bụ mwakpo mere n'obodo Nkalaha, Obegu, Umuhuali na Amaezu dị n'Okpuru Ọchịchị Ishielu dị na steeti ahụ.
Umahi kwukwara na ha amatala ndị kpara mkpamkpa a na ndị dunyere ha, ma kwuo na iwu megidere na ha ga-ata ahụhụ dị na ya.
O kwuru ka ọ na-agwa ndị obodo ndị a ihe metụtara okwu, dịka ọ na-arịọkwa ha ka ha ghara iji iwe jiri aka ha mee ihe iwu akwadoghi.
Umahi kwukwara na ọ dị mwute na ụdịrị ihe a na-eme n'Ebonyi, ma kwuo na ọ tụrụ ya n'anya na ndị na-achị ehi n'okpuru ọchịchị Ishielu si ebe ahụ kwapụ ọsịsọ, nke pụtara na ha ma ihe gbasara ogbugbu ndị obodo ahụ, "ha kwapụrụ n'agbanyeghi mbọ niile gọọmentị m, gọọmentị mpaghara Ọwụwa-Anyanwu na ndị ọrụ nchekwa na-agba ịhụ na e nyere ha ezi nchekwa na mpaghara Ọwụwa-Anyanwụ niile."
"Ọ dị mma na anyị achọtala ndị dunyere ndị bịara ebe a kpaa mkpamkpa a. Agaghị m ekwuputa ya, mana aga m ewega aha ndị mere ihe a n'aka ndị isi ma chebiri ihe ha ga-eme. Mana anyị na-akatọ mwakpo a, ọ bụghị naanị n'Ebonyi ka ọ na-eme, mana ọ bụrụ na a hapụ ya ka o mere gaa n'ihu, o nwereike ibute agha imeụlọ na Naịjiria".
Cheta na Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi steeti kwuru ụnyaahụ na ọ bụ mmadụ isii ka ha ka hụrụ nwụrụ.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Odah kwukwara ụnyaahụ na ha ka na-eche ka ndị uweojii ezigara ebe ahụ bịa kpesa ihe ha hụrụ, tupu ha ekwuo ihe mere n'uju.
Mkpamkpa a tara isi ndị mmadụ butekwara mmebi ọtụtụ ngwongwo ndị mmadụ, dịka a gbara ọtụtụ ụlọ, ụgbọala na ọgbatumtum ọkụ.

Otu onye hụrụ mgbe ihe mere ma na-achọghị ka a kpọọ ya aha, kwuru na ndị a a na-eche na ha bụ ndị ọchịehi wakporo obodo ha ma jiri mma wakasịa ndị mmadụ ahụ.
O kwukwara na ha gburu otu ụkọchukwu nke ụlọụka Metọdist, ma burukwa ụfọdụ ngwongwo ndị mmadụ gbafuo.

Onyeisioche Okpuru Ọchịchị Ishielu bụ Sunday Eze na Kọmishọna na-ahụ maka mmelite achụmntaego bụ Dkta. Stephen Odo bụ onye obodo ahụ, du ndị ọrụ nchekwa gaa iji anya ha hụ ihe mere.
Ha kwara arịrị maka mkpamkpa ndị a a na-eche na ha bụ ndị ọchịehi na-akpa, ma tie ezinaụlọ ndị ihe metụtara aka n'obi.
Gọọmentị kwere nkwa na ha ga-enyocha ya bụ mkpamkpa ma nwụchie ndị ọbụla aka ha dị na ya.









