Anyị amaghị maka ogbugbu mmadụ ọhụrụ sitere n'esemokwu Ezza na - Ndị Uweojii

Ọnu na-ekwuru ndi uweojii n'Ebonyi steeti bụ Loveth Ọdah ekwuola na ha amaghị maka ogbugbu mmadu ọbụla mere na esemokwu dị n'etiti ndị Ezza na ndị Effium.
Odoziakụ Odah kwuru nke a ka ọ na-aza ajụjụ BBC Igbo banyere akụkọ pụtara na esemokwu ahụ na na-abawanye dika ọ "tara isi nwaanyị dị ime na mamdụ 16 ọzọ".
Anya si na ya hụrụ ihe a sịrị na mkpa mkpa kpara n'obodo Effium n'ubọchị Wenezde dịka ọ kụru elekere asatọ nke abalị.
Mana Odah si na dịka ha siri mara, obodo abụo ahu adaala juu dịka gọọmneti wepụtere aha ndi na-enye nsogbu n'ebe ahụ.
"Anyị gara nzukọ ebe anọ wepụta aha ndị na-ebute nsogbu ma si ka anwụchie ha. kemgbe ahụ, udo adịla n'obodo abụọ," bu ihe Odah gwara BBC.
Onye ntaakụko BBC nọ n'Ebonyi zitere akụko dịka o jiri site n'ọnụ otu onye agha achọghị ka ekwuo aha.
Ọ sị na nsogbu malitere oge ndị Ezza na ndị Effium zutere iji họpụta ndị ga-esonye n'otu udo dịka gọọmnetị Ebonyi siri sị ka ha mee.
Onye agha a siri na egbuwara nwaanyị ahụ di ime isi ma gbukachaa ya ahụ.
Ọ sị; "Ọ bu dịka isi obodo abụọ a nọ na-eme nzukọ iji họpụta ndị otu udo ka otu mpaghara n'ime ha malitere ikwu na ndị si mpaghara nke ọzọ na nke ha. Ọ bu ihe butere ogbugbu mmadụ a."
Onye agha si na ha amaghi obodo nke malitere okwu a.
Ọ gakwara n'ihu kwuo n'obodo Effium ka na-agba ọkụ ugbua.
Ọ sị; " Ihe chọrọ ikwu bụ ndị isi obodo ndị adaala. ekwesiri ịnwụchi ha nille kpụpụ ha ụlọ ikpe. Ma ruo ugbua ụfọdụ ụlọ ka na-agba ọkụ.
Ọ sị na ndi ntoroọbịa bu nwaanyi ahụ gawa ụlọọgwụ dị nso n'oke ala Ebonyi na Benue steeti, mana tupu ha eruo, nwaanyị ahụ anwụọla.
Onye aghabara mba maka ihe ha hụru na ya bụ obodo.
Ọ kwuru sị; "Ihe a ekwesighi ma ncha. Leezianu igbu nwaanyị dị ime. Onye ọbụla gbajọrọ nke ahụ. I kwesiri ị bịa hụ etu ozu siri ju n'obodo ahụ niile ụnyaahụ. Ọ bụrụ maka esemokwu maka onye ga-abụ onyeisi ọdọ ụgbọala."
Kọmịshọna na-ahụ maka mgbasa ozi na steeti ahụ bụ ọkaiwu Uchenna Orji gwara ndị ntaakụkọ n'ụbọchị Wenezde na gọọmentị steeti ahụ ga-akpọghachite ndị isi ha sepụtere n'obodo ndị a maka ịmalite ikpe udo ọzọ.
Mkpa mkpa kpara dịka ọ mechara otu ụbọchị ndọ obodo a binyere aka n'akwụkwọ maka udo n'obi gọọmentị dị n'Abakiliki.












