Kenneth Amukamara: Gulak na ndị ọzọ nwere agba 'unknown gunmen' gburu n'otu ịzụaka

Ebe foto si, Greg Nwadike/ Ahmed Gulak/Facebook
Ndị bu egbe egbuola otu onye ndu ndị ntorobia PDP n' Imo steeti n'ụbọchị Tuzde.
A wakporo Kenneth Amukamara, na be nna ya n'Owamama dị n' Oru-East, Imo Steeti, gbagbuo nwa amadị ahụ ma gbaa ụlọ ya ọkụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uwerojii Imo steeti bụ Elkanah azaghị ekwentị ya nke ọ na-asa ozi e zigara ya n-ekwentị .
Mana otu onye nọ ezinaụlọ ahụ nso achọghị ka a kpọọ aha ya gwara onye ntakụkọ BBC na o mere n'ezie.
Amukamara, a sorola na ndị welitere isi, ndị bu egbe gbagburu n'otu ịzụ ụka .
Kemgbe abalị ole na ole gara aka, nsogbu ndị omekome ndị a kpọrọ 'unknown gunmen' adagharịala site na ndị uweojii dịka a malitere igbu ndị nwere agba na Naijiria.
Lee ụfọdụ ndị nwụrụ n'aka ndị ekperima bu egbe:
Ahmed Gulak

Ebe foto si, Screengrab
Dịka ndị uweojii siri kwuo, mmadụ isii bu egbe chebiri ma gbagbuo Ahmed Gulak n' Umueze Obiangwu dị n'Okpuru Ọchịchị Ngor-Okpala Ụbọchịụka ( 30/5/2021) dịka aa kwọ ya agaghachi ọdọụgbọelu Sam Mbakwe ka ọ bịachara ọgbakọ ịnụ olu ọha maka nhazigharị iwu.
Onye Madagali dị n'Adamawa steeti, Gulak bụbu onye enyemaka Goodluck Jonathan n'okwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị tupu ọ hapụ PDP banye APC, ebe ọ rụrụ dịka onyeisioche komịti haziri ntuliaka imeụlọ APC n'Imo steeti n'afọ 2018.
Ụfọdụ ndị mmadụ dịka Gọvanọ Hope Uzodinma na-ekwu na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị gburu Gulak.
Mana ụfọdụ gụnyere ndị uweojii na steeti ahụ na-arụ otu Ipob na ESN aka maka ọnwụ Gulak ,
Otu Ipob aghọọla na aka ha adịghị ya.
Stanley Nnaji
Ndị a maghị ndị ha bụ bu egbe gbabidoro Jọstis Stanley Nnaji bụbụ Ọkaikpe Enugwu steeti lara ezumike nka na mgbede ụbọchịụka(30/5/2021) dịka ọ kwọ ụgbọala ya aga na nso Ebeanọ Tunnel,dị n'Enugwu, kpụpụta ya n'ụgbọala ya gbagbuo.
Onye Nike, dị n'Enugwu steeti, Nnaji bụ ọkpaikpe otu Nigeria judicial Commission napụrụ ọkwa ya dịka e nyechara mkpesa maka etu o siri wepụ Chris Ngige n'ọkwa dịka gọvanọ Anambara steeti.
Okiemute Mrere
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ndị bu egbe gbagburu Okiemute Mrere bụ Osote onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọpụpụ na mbata(Nigeria Imigration Service) nke Imo steeti n'abalị satọde (29/5/2021) n'okporoụzọ si Owere gawa Pọtakọt.










