Ntuliaka onyeisiala na-eme na Mali ugbua

Ebe foto si, AFP
Ihe karịrị mmadụ nde asatọ na mba Mali ga-achọpụta onye ga-anọchi ọkwa onyeisiala mba ha dịka ha na-eme ntuliaka taa.
Ibrahim Boubacar Keita bụ onyeisiala ha ekwuola na o nweghi nrụrụaka ga-adị na ntuliaka ahụ nke na-eme ugbua.
Onye ga-emeri ntuliaka a kwesiri ị nweta ihe karịrị vootu ọkara na mgbakọ ọnụgụgụ vootu niile atụnyere taa.
Gọọmentị mba Mali na-ekwu na ha ezigala ndị nchekwa puku ịrị atọ n'ebe dị icheiche na mpaghara ala ahụ.
Ha kwuru na nke a bụ iji mee ka obi rue ndị mmadụ ala ebe ndị oyiegwu otu JNINM kwuru na ha ga-ebute ọgbaaghara na ntuliaka ahụ.
Ọ bụrụ na Boubacar Keita dị afọ 73 merie, ọ ga-achị mba Mali afọ ise ọzọ.






