Ntuliaka onyeisiala na-eme na Mali ugbua

Ibrahim Boubacar Keïta

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ibrahim Boubacar Keïta n'agwa ndị ntaakụkọ ọkwụ tupu o binye aka na ntuliaka taa.

Ihe karịrị mmadụ nde asatọ na mba Mali ga-achọpụta onye ga-anọchi ọkwa onyeisiala mba ha dịka ha na-eme ntuliaka taa.

Ibrahim Boubacar Keita bụ onyeisiala ha ekwuola na o nweghi nrụrụaka ga-adị na ntuliaka ahụ nke na-eme ugbua.

Onye ga-emeri ntuliaka a kwesiri ị nweta ihe karịrị vootu ọkara na mgbakọ ọnụgụgụ vootu niile atụnyere taa.

Gọọmentị mba Mali na-ekwu na ha ezigala ndị nchekwa puku ịrị atọ n'ebe dị icheiche na mpaghara ala ahụ.

Ha kwuru na nke a bụ iji mee ka obi rue ndị mmadụ ala ebe ndị oyiegwu otu JNINM kwuru na ha ga-ebute ọgbaaghara na ntuliaka ahụ.

Ọ bụrụ na Boubacar Keita dị afọ 73 merie, ọ ga-achị mba Mali afọ ise ọzọ.

Ụfọdụ ebe na mba Mali anọghịzị n'aka gọọmentị dịka ndị nche UN na-echekwa ya n'aka ndị nnupu isi.
Nkọwa foto, Ụfọdụ ebe na mba Mali anọghịzị n'aka gọọmentị dịka ndị nche UN na-echekwa ya n'aka ndị nnupu isi.
Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: