Akwụkwọ njem afọ iri ekpuchighi onye ọbụla - Ngalaba na-ahazi njem

Aha onyonyo, Akwụkwọ njem afọ iri ekpuchighi onye ọbụla - Ngalaba na-ahazi njem

Ọ bụ n'afọ 2016 ka onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọpụpụ na mbata nke a kpọrọ Nigerian Immigration Service na Bekee bụ Muhammad Babandede kwuru na ha chọrọ imegharị usoro e ji eme akwụkwọ e ji ama onye, nke a kpọrọ Passport n'asụsu Bekee.

Ụlọ ntaakụkọ Premium Times dere na Babanded sị, "anyị enyela onyeisiala akwụkwọ ma na-enwe olileanya na ọ ga-aza anyị nso nso."

Nso nso ahu bụzị afọ abụọ, dika onyeisiala Muhammadu Buhari nyere nkwado ka e megharịa ihu akwụkwọ e ji amata ụmụ Naịjirịa, afo a mere ya afo iri Naịjirịa mepụtara akwụkwọ a n'usoro a kpọrọ e-passport na Bekee.

Mmegharị a metụkwara afọ ole yabụ akwụkwo ga-adị ire.

Ugbua ọ ga-adị ire ruo afọ iri, nke pụtara na e tinyere afọ ise n'afo ole ọ na-adịbu na mbụ.

Ọdọ ụgbọelu na Legọs

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndi na-aga njem ọfụma so na ndị ga-erite uru kachasịa na atumatu ọhụru a

Babandede sị na ihe a mere so na nhaziagharị Buhari nyere ha ikike ime, nke ga-enye akwụkwọ a nchekwa tọrọ atọ.

"Ka afọ iri e mepụtara akwukwọ a gara, anyị kwesiri ihaziagharị ya, mana nke bu nnukwu ozi bụ na akwụkwọ a ga na-adị ire ruo afọ iri," Babandede kwuru.

Babandede kwukwara na ego a na-akwụ n'isi akwụkwọ a ga-arị, mana ọ siri na uru ga adị ya.

Onyeisi ụlọọrụ ọpụpụ na mbata dị n'Ikoyi nke di na Legọs kọwara na ọ bụghị mmadu niile ka akwụkwọ ọhụru a ga-eru aka.

O kwuru na ọ bụ ndị ruru afọ iri na asatọ ka erere a ga erute aka. Ya bụ na ọ bu maka ndị gọọmentị che na ha bu okenye.

Gee ya ntị ọfụma na ihe onyonyo dị n'elu.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: