Ghana: Ndị LGBT si ka emere ntuliaka gbasara mmekọ ha

Ebe foto si, Philcollins Agbedanu Kröger
Otu LGBT na Ghana akpọkuola ndị omee iwu mba ahụ ka ha mee ntuliaka nye ụmụ Ghana ohere ikwu okwu gbasara ndị na-enwe mmekọ n'etiti ndị dị ka ha.
Ha kwuru na nke a bụ iji gosi ha na ezie, e nwere ụdị ndị a na mba ahụ.
Onye nkwuchiteọnụ ndị LGBT na Ghana kwuru na ndị na-enwe ụdị mmekọ a na Ghana juru ebe niile mana ha enweghi ike ịpụta maka ụjọ na-eso mkpagbu ndị mmadụ na-enye ha maka ụka maọbụ omenaala.
N'okwu ya : "Okwu gbasara ime ka mmekọ nwoke nwoke maọbụ nwaanyị na nwaanyị abụghị okwu otu onye, ka ha kpaa ya n'ụlọ omeeiwu nye anyị ohere ime ntuliak gbasara ya", ọ gwara BBC Pidgin.

Ebe foto si, Philcollins Agbedanu Kröger
Onye na-anọchite anya mba US na Ghana bụ Rober P Jackson nime ngwụcha izuụka gara aga kwuru ka ọnụọgụgụ ndị LGBT na Ghana karịrị etu ndị mmadụ si eche.
O kwukwara na Ghana nwere ike ime iwu ikwado her tupu afọ iri na-abị mana na Naịjirịa, oney ọbụla ejidere na-enwe ụdị mmekọ a, ga-aga nga afọ iri na anọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:







