Ndị Sierra Leone na-enwe aṅụrị dịka ha na-eme mbinyeaka

Ebe foto si, Reuters
Ọtụtụ ndị mba Sierra Leone pụtara n'igwe ga ibinyeaka maka onye ga-abụ onyeisiala ha na ndị nnọchite anya ha n'ogo dị icheiche.
Onyeọrụ BBC bụ Umaru Fofana nọ n'isi obodo Sierra Leone bụ Freetown dịka ọ na etinye anya n'etu ihe si aga.
Otu onye na ndị binyere aka gwara BBC: "Obi dị m ụtọ maka ohere m nwere ị rụ ọrụ m dịka nwaamala".
Dịka mbinyeaka na-aga n'ihu, enwebeghi akụkọ ọgbaghara ọbụla dịka ndị na-ekiri ka o si aga kwuru na ọ na-aga nkeọma.
Onye chịburu mba Liberia bụ Amos Sawyer kwuru na ya nwere olileanya nke ukwu.
A ga-egosiputa ndị meriri na ntuliaka ahụ n'otu izuuka ma ọ bụrụ na onweghi onye meriri n'ime mmadụ iri na isii zọrọ ọkwa onyeisiala ha, ị mara na mmadụ abụọ nwetakarịrị votu ga-aga ntuliaka ọzọ.
A ga-eme nke ahụ nime izụụka abụọ ka emechara ntuliaka nke a.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:






