Onyeisiala mba Liberia George Weah baịra Naịjirịa taa

Ebe foto si, EPA
Onyeisiala mba Liberia bụ George Weah gara Aso Rock taa ị hụụ onyeisiala Muhammadu Buhari.
Nke a bụ mbụ onyeisiala ahụ na-abịa ala Naịjirịa kamgbe o were oche dịka onyeisiala mba Liberia.
Ndị isiala abụọ ahụ nwere ọgbakọ pụrụ iche nke ana anabataghị ndị mmadụ.
Onyeisiala Weah bụbụ onye ọgba bọọlụ ṅụrụ iyi ọrụ dịka onyeisiala mba Liberia ụbọchị 22 January afọ 2018.
Ọchịchị ya bụ nke mbụ a na-enyefe ọchịchị n'aka onye ejiri ntuliaka onye kwuo uche ya webata kamgbe afọ 1944.
Onye nyefere Weah ọchịchị bụ Ellen Johnson Sirleaf onye nọrọ n'ọchịchị afọ iri na abụọ.
Sirleaf bụkwa onye napụtara m,ba Liberia n'agha ha na-alụ tupu o were ọchịchị.
Ụlọọrụ onyeisiala ekwubeghi ihe Weah jiri bịa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










