Ethiopia Coup: 'Egbuola' onyeisi ndị mere 'coup' n'Ethiopia

Ebe foto si, YOUTUBE/ALEM GENA TUBE
Onye bụ isi miri atụmatụ ịchụtụ aka na-achị mpagara Amhara n'Etiopia anwụọla, dịka ndị ntaakụkọ na mba ahụ na-akọ.
Akụkọ ahụ sị na ndị uweojii gbagbụrụ Ọchịagha Asaminev Tsige na gburugburu isi obodo Amhara bụ Bahir Dar.
Ndị chọrọ ịchụtụ onyeisi Amhara gburu onyeisi Seare Mekonnen ka ọ na-achọ ịkwụsị njem ndị a chọrọ ịchụtụ gọọmentị.
Aka na-achị Etiopia bụ Abiy Ahmed si ka ndị mba ahụ makọọ onwe ha iji megide ndị ajọ obi.
Onye ga-eweghachita akụ Bauchi steeti

Ebe foto si, Facebook/Bala Mohammed
Gọvanọ na-achị Bauchi Steeti bụ Bala Mohammed etiela mkpu na onye chiburu steeti ahụ bụ Mohammed Abubakar mefuru nde naira abụọ na ụma n'ihe gbasara akwamozu.
Bala Mohammed ṅụrụ iyi na gọọmentị ya ga-eweghachite ego nile ndị chịburu steeti ahụ zupuru.
Onye ji ibe ya ụgwọ nsọpụrụ?
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Nkwanye ugwu na-ewu na soshal midia Naịjirịa ka ọtụtụ mmadụ na-etinye ọnụ n'omume ekwuru na otu okorobịa kpasara Ọkammụta Wole Soyinka.
Akụkọ a dị na Twitter sị na nwaokorobịa ahụ ekweghị ịhapụrụ Soyinka oche n'ụgbọelu.
Ma omere etu kwesiri ma omeghị bu ihe ndị mmadụ kpụzị n'ọnụ.
N'egwuregwu
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Otu bọọlụ Ivory Coast ji otu ọkpụ asatghị emeri mba Sawụt Afrịka dịka ha na-achịpụ ya ugbua
Ebe anyị nụrụ na ọgba bọọlu Naijiria bụ Shehu Abdullahi agaghị eso n'egwu mgbe ndị Super Eagles ga-ezute mba Guinea maka ahụ ọ merụrụ.
Onweghị ndị ọchị ehi anyị bunyere ngwaagha - NAF

Ebe foto si, NAF/Website
Ndị agha ụgbọelu nke Naịjirịa agọọla ụkwụ na aka ha na onweghi ngwaagha ọbụla ha ji ọgbọelu helikọpta bunye ndị na-achị ehi n'obodo Akwuke dị n'Engugu Steeti.
Ọnụ na-ekwuru ndị agha ụgbọelu nke Enugwu Steeti bụ Faith Aigbeoghain sị na ebubo a eboro ndịagha bụ ezigbo asị katara ahụ.
Akụkọ kwuru na ngwụcha izuụka gara aga, ndị Enugwu nọ n'oke ụjọ n'ihi ụgbọelu helikọpta ndị agha nọ na-efegharị n'obodo.
Akụkọ gara n'ihu kwuo na ụgbọelu a mechara fedata ala n'obi ndị ọchị ehi dị n'Akwuke ma bunye ha ngwaagha.
Mana Aigbeoghain akatọọla ebubo a ma gwa ndị bi n'Enugwu ka ha gbara ịtụ ụjọ ọbụla na o nweghi nsogbu dị.
Super Eagles ekeela nkwụcha n'ụlọ ndina ha

Ebe foto si, @NGR PRESIDENT/TWITTER
Akụkọ kwuru na otu nwoke a na-akpọghị aha ya batara n'ụlọ ndịna ndị Super Eagles na mba Ijipt ma soro ha hie ụra na-enweteghi ikike ọbụla.
Nke a mere eji nye ndị nkaakụkọ ndụmọdụ ka ha kpọtụrụ Toyin Ibitoye tupu ha gara ịhụ ndị Super Eagles ma ọ bụ atụọ one ahụ mkpọrọ.
Obi adala unu mba - Buhari gwara ndị Zamfara Steeti

Ebe foto si, @bashirahmad
Onyeisiala Muhammadu Buhari akpọkuola gọọmentị Zamfara Steeti na ndị bi na ya ka ha ghara ịda mba n'ihi mwakpo a na-eme ha.
N'ozi si n'aka onye enyemaka ya bụ Garba Shehu, Buhari sị ka ndị bi na Zamfara nyere gọọmentị etiti aka n'ịchọpụta ndị na-eyi ndụ egwu na Steeti ahụ.
Buhari kwuru nke a n'ozi nkasi obi o zigara ndị steeti ahụ maka mwakpo e mere ha na nso nso a, nke tara isi ọtụtụ mmadụ n'okporoọchịchị Tsafe.
Seriake Dickson adọọla ndị ntọrị aka na ntị

Ebe foto si, Seriake Dickson/Facebook
Gọvanọ Bayelsa Steeti bụ Seriake Dickson ekwuola na ọ ga-etinye aka n'akwụkwọ ikike maka igbu ndị ntọrị ọbụla a mara ikpe ọnwụ na steeti ahụ iji dọọ ndị ntọrị aka na ntị.
Dickson kwara arịrị na ndị a na-atọrị ndị mmadụ a bụ ndị otu na anọghị n'ochịchị nyere ngwa ọgụ n'oge ntuliaka.
N'ofesi

Ebe foto si, AFP
Oke ọdachi mere na mba India mgbe ọke ifufe na mmiri ozizo kwaturu akwa mbochi bụ Tent ma gbuo ihe ruru mmadụ iri na anọ merụọ iri ise ahụ na Rajasthan.
Ụfọdụ n'ime ha bụ ndị a sị na ọkụ latrik dọgburu ebe ndị ọzọ bụ ndị igwe eji arụ ụlọ dagburu.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
N'asọmpi Iko mba Afrịka, Ọọjerịa ji ọkpụ goolu abụọ menyụọ ndị Kenya anya iji bụrụ ndị mbụ na tebulu ha.
N'aka nke ọzọ Ajentina jisiriike gafe n'agba ọzọ nke asọmpi Copa Amerịka site n'iji ọkpụ abụọ merie Qatar.











