Miyetti Allah: Nwodo sị 'ndị na-wakpo' Ọwụwa Anyanwụ abụghị ndị ga-echekwa ya
Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a
Ohaneze si Miyetti ekwuzikwana na ha chọrọ ichekwa Ọwụwa Anyanwụ

Nnia Nwodo bụ onyeisi Ohaneze Ndịgbo awụọla mmiri oyi n'atụmatụ ndị Miyetti Allah wepụtara n'Enugwu mgbe ha zutere aka ndị na-achị steeti dị n'Ọwụwa Anyanwụ,
Maazi Nwodo sị na ihe gbagwojuru anya n'atụmatụ a bụ na ọ bụ ndị ọ sị na-wakpo Ọwụwa Anyanwu na-ewete ya.
"Ọ bụ ndị a na-emebi ugbo anyị, edina ụmụnwaanyị anyi n'ike am na-egbu di ha. Onweghị ihe na-eme ndị makana ọ dị ka ha karịri obodo ike."
Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu bu onyeisi otu Ipob bụ Nnamdị Kanu bu onye sị na ya amaghị etu otu ndị na-atụ mgbere dịka Miyetti bụ ga-eji na-eme nzukọ nchekwa n'Ọwụwa Anyanwu nke ndị na-achị Ọwụwa Anyanwụ ga na enye ha ohere ịbịa ụdịrị nzukọ a."
Osote Odeakwụkwọ Ohaneze bụ Chuks Ibegbu tinyekwara ọnụ gwara BBC Igbo na ya bụ ihe agaghị ekwe omume belụsọ ma ndị Ugwu enyere ohere ka otu Ipob na Massob bido ọrụ nche n'Ugwu Awusa.
Ibegbu sị na ọdịghị mma ịnụ na ntị na ndị mba ọzọ ga-abụ ndị na-eche ala Igbo nche.
O kwuru sị "Ọ bụrụ na ndị ugwu ga-ekweta ka ndị Igbo bia chewe ha nche n'ala ha, mgbe ahụ anyị ga-ekweta ka Miyetti Allah bịa chewe ala Igbo nche."
Odeakwụkwọ otu Miyetti Allah bụ Alhaji Baba Ngelzarma bụ onye kwuputere ebumnuche otu ahụ n'ọgbakọ nchekwa e nwere n' Enugwu ụbọchị Tọọzdee nke otu 'South East Chambers of Commerce, Mines and Agriculture,' (SECCIMA) na otu jịkọrọ ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ jikọrọ aka were hiwe.
Oshiomhole adọọla gọvanọ Bauchi aka na ntị

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi party APC adọọla gọvanọ Bauchi steeti aka na ntị maka ndọrọndọrọ onye ga-abụ onyeisi ụloọmeiwu steeti ahụ.
Adams Oshiomole sị na aka gọvanọ Bala Mohammed, bu onye PDP, dị na emume mere eji nwee ndịisi Ụlọomeiwu abụọ na steeti ahụ.
Ndị Omeiwu iri na otu nke mmadụ asatọ n'ime ha bụ ndị PDP gara n'azụ ndị otu ha iri abụọ ọzọ ga họpụta Abubakar Suleiman ka onyeisi.
MMadụ iri abụo ndị ọzọ ahụ mechara họpụta onye bụbụ onyeisi Ụlọomeiwu steeti ahụ n'ọchịchị gara aga bụ Kawuwa Damina dị onyeisi nke ha.
N'Ofesi,

Ebe foto si, AFP
Ndị uweojii wuchiri be Boris Johnson bu otu n'ime mmadụ abụọ nwereike pụta dịka Prim Minister mba Briten.
Ndị uweojii si na ha gara ebe ahụ dịka ndị agbatobi Maazi Johnson kpọrọ ha na ha na-anụ kepu kepu esomokwu n'ime ụlọ ahụ. Uweojii si na onweghi ihe ha hụrụ na-eme ebe ahụ.
Samuel Kalu ga-adị mma - Dọkịnta

Ebe foto si, Getty Images
Onye Egwu Super Eagles Samuel Kalu dara n'ama egwuregwu n'Ijipt ụnyaahụ, mana ndị dọkinta sị ka obi daa ndị mmadụ juu na ọ ga-agbake.
Ihe mere dịka Naịjirịa na-ahazi izute Burundi taa na mmalite njem n'Iko Mba Afịrịka nke 2019.
Unyaahụ Ijipt ji otu ọkpụ ha gbara Zimbabwe mepe ụzọ asọmpị ahụ








