Enugu: Ihe gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi kpebiri maka mwakpo ụlọọrụ uweojii na-eme ebe ahụ n'Ọgọstụ 23

Ugwuanyi na ndị uweojii

Ebe foto si, Getty Images

Gọvanọ Enugu steeti bụ Ifeanyị Ugwuanyị adọọla aka na ntị ka ndị wakporo ụlọọrụ ndị uweojii n'Ogui nakwa Abakpa ma bukọrọ egbe ha, weghachi egbe ndị ahụ.

O kwekwara nkwa na ọ ga-eme ihe niile o nwereike iji chọpụta ihe kpatara ọgbaghara dapụtara n'Emene n'Ọgọstụ 23 ma gbochie ya ime ọzọ.

O kwuputara nke a na ngwụcha ọgbakọ gbata gbata ya na ndị isi nchekwa nwere na steeti ahụ.

Ugwuanyi gosiri mwute ya maka ndị tufuru ndụ ha n'ọgbaghara ahụ mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụlọọrụ gọọmenti ụnyahụ bụ Sepụtemba 1.

Ugwuanyị na ndị nchekwa

Ebe foto si, Louis Amoke

O kwuru na site na mpụtara ọgbakọ ya na ndị nchekwa mere, na ọ dị mkpa inyetu ndị na-eme nnyocha obere oge ka ha wee mechaa nnyocha ha na-eme.

Gọvanọ Ugwuanyi kwukwara na ọgbaghara nke Ọgọstu 23 nke weere ndụ ụfọdụ ndị nchekwa na ndị Enugu nakwa mwakpo ụlọọrụ ndị uweojii n'Ogui nakwa Abakpa (Ọgọstụ 28 na 30) ebe e buuru ụfọdụ ngwaagha, na-enye ya nchekasị.

Ugwuanyi kanyere nzụkọ ya na ndị igwe na ndị ụkọchukwu nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ụbọchị Sepụtemba 3.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: