Enugu International Airport: E hiwela ihe iribama maka ncheta mmadụ 53 nwụrụ n'ọdọụgbọelu Enugwu n'afọ 1983

Aha onyonyo, Ncheta mmadụ 53 nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu mere n'ọdọụgbọelu Enugu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyị emepela ihe nribama e ji echeta mmadụ iri ise na atọ nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu n'ọdọụgbọelu Akanu Ibiam n'afọ 1983.

Ihe nribama a bụ ụgbọelu akpụrụakpụ nọ n'ama e si abata ọdọụgbọelu Akanu Ibiam.

Ụgbọelu akpụrụ akpụ

O mepere ụgbọelu ahụ ka e mepechara ọdọụgbọelu Akanu Ibiam n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Ọgọstụ afọ 2020.

Mmadụ iri ise na atọ a nwụrụ n'ihe mberede n'ụbọchị iri abụọ na asatọ nke Nọvemba, 1983 dịka ụgbọelu "Nigeria Airways F28-2000 aircraft" si Lagos aga Enugwu kpọkasiri n'ọdọụgbọelu Enugwu.

Ugwuanyị

Onụ na-ekwuru gọvanọ Ugwuanyị bụ Louis Amoke depụtara n'ozi o nyere ndị ntaakụkọ na ya bụ ụgbọelu kpọkasiri ka ọ ribatachara n'okporoụzọ ụgbọelu si fetu maọbụ fetu ma nwụrụ ọkụ.

Onwegh ihe m nwere ikwu maka ọdọụgbọelu ahụ- Abaribe

Akụkọ BBC Igbo

Ọnụ na-ekwuchitere Enyinnaya Abaribe gwara BBC na ya na onyeisi ya enweghi ihe ọbụla ha nwere ikwu gbasara mmepe emepegharịrị ọdọụgbọelụ Enugwu ụnyaahụ.

Uche Awom kwuru sị "anyị achọghị ikwu ihe ọbụla maka ya bụ ihe, ọ bịaghị bụ na ọ bịaghị"

Okwu a bịara dịka ndị mmadụ jisike ebu kepu kepu na Abaribe agaghị ya bụ mmemme ebe ndị isi ala Igbo juru eju iji gosi iwe ya maka "ogbugbu egburu ndị ntorọbịa IPOB n'Emene" n'izuụka gara aga.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

N'otu aka ahụ ọtụtụ ndị mmadụ banyekwara na soshal midia na-akatọ ọdọụgbọelụ ahụ na-ekwu na agbapere ebe arụchabeghị ọrụ.

Otu onye dịka Charles Ogbu kpọpụtara ihe ndị ezuchaghị ezu arụbeghi n'ebe ahụ

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Lee ihe Ogbu gwara BBC bụ iwe ya n'uju ebe a:

Ọdọụgbọelu Akanu Ibiam

Cheta na o wuru ewu na soshal midia mgbe agbapere ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu.

Ebe obi dị ụfọdụ ụtọ, ndị ọzọ na akatọ akaọrụ ndị ruru ya.

Ọtụtụ ndị bịara na ọbanzịkọrịta ozi BBC Igbo bụ sọ ọnụ ka ha na-akọ ya bụ ọdọugboelu riri ijeri Naịra iri (N10b) iji rụgharịa ya n'otu afọ.

Ọtụtụ na-ekwu ana ya bụ ego furu ọhịa ebe ndị ọzọ na-ekele Chukwua maka mmeghe ya bụ ọdọugboelu.

Ndị bịara ọdọugbọelụ Akanu Ibiam International Airport

Mmepe Ọdọụgbọlụ Enugwu
Nkọwa foto, Site n'akaekpe: Okwy Nwodo Gọvanọ Enugwu steeti na mbụ, Chief John Nnia Nwodo PG Ohaneze Ndigbo, onye bụbu Gọvanọ Anambra steeti na Minista ọrụ na ịnwe ọrụ, Chris Ngige, Onye bụbu osote onyeisioche na Sinate Ike Ekweremmadu, Onyenọchịte anya Isuikwato/Umunneochi Federal Constituency, Abia steeti n'ụlọ omeiwu nta Nkiru Onyejeocha, Gọvanọ Okezie Ikpeaz nke Abia state.

Ọtụtụ ndị nwere agba si ala Igbo nakwa Naịjirịa niile, agbakọọla n'Enugwu steeti maka imepe ọdọụgbọelu Akanu Ibiam bụ nke a rụziri ọhụrụ.

Ndị dịka Mịnịsta njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika, Obi nke Ọnịcha bụ Igwe Nnaemeka Achebe, Eze n'Ukpo bụ Arthur Eze nọcha na ya bụ mmemme nke na-aga n'hu ugbua.

Mmepe Ọdọụgbọlụ Enugwu
Ọdọụgbọelu

Ebe foto si, Felix Kelechi Ehenemba

Mana dịka ya bụ mmemme a na-aga n'ihu, BBC Igbo chọpụtara na nnukwu ọrọ ka na-aga n'ihu na ya bụ ọdọụgbọelu.

Ebe ụfọdụ a ka na-arụ arụ gụnyere:

Ọdọụgbọelu Enugu
Nkọwa foto, A rụchabeghị otu n'ime ụzọ ebe e si abata na ya bụ ọdọụgbọelu
Ọdọụgbọelu Enugwu
Nkọwa foto, A rụchabeghi ebe ndị njem si efepụ
Ọdọụgbọelu Enugwu
Nkọwa foto, Ọrụ ka na-agakwa n'ihu na mpaghara ebe ndị njem si abata

Ebe ndị a rụziri n'ọdọụgbọelu

Ọdọụgbọelu Enugwu
Nkọwa foto, Ebe ụgbọelu si efepụ nakwa efebata

BBC Igbo kpọtụụrụ Njinịa Felix Kelechi Ehenemba ka ọ kọwaara anyị ihe dị iche na ọdọụgbọele nke ọhụrụ a na nke ochie e mechiri n'ọnwa Ọgọst afọ 2019.

Kelechi Ehenemba so na ndị Njinịa rụrụ ọrụ n'ọdọụgbọelu ahụ.

O kwuru na ihe ndị a rụrụ gụnyere:

  • Okporoụzọ ebe ụgbọelu si efepu nakwa efebata nke Bekee kpọrọ 'runway'
  • Akụrụngwa na-enyere ụgbọelu aka ifetu n'abalị; Bekee na-akpọ ya 'night landing facilities'
  • Itinye ngwuru na gburugburu ọdọụgbọelu ahụ niile
  • Mpaghara ebe ndị na-aga mba ofesi maọbụ ndị si mba ofesi, maọbụ 'international wing' na Bekee
  • A rụgharịkwara akụrụngwa niile dị n'ọdọụgbọelu ahụ ka ha dịka ụdị ndị i nwere ike ịhụ ebe ọbụla n'ụwa

Etu mmemme mmepe ọdọụgbọelu Enugwu si aga

Ụmụnwaanyị na-eche ka mme a malite

Ndị ọbịa abiawala n'ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugu maka mgbape a ga-agbape ebe ahụ taa.

Ụmụnwaanyị yicha akwa na-egbuke egbuke so na ndị nọrọgoro ebe ahụ na-eche ka mmemme mgbape malite.

Aha onyonyo, Ọrụ amalitela n'Ọdọ Ụgbọelu Enugu?

Lee ka o si aga ebe n'uju:

Ọdọụgbọelu Akanu Ibiam

Ndị ọzọ nọgoro ebe ahụ gụnyere ndị ọrụ ọdọụgbọelu ahụ.

Ụfọdụ ndị ọrụ ọdọụgbọelu Akanu Ibiam

Sịnetọ Abaribe ọ jụrụ ịbịa mgbape ọdọụgbọelu Akanu Ibiam? Lee nke bụ eziokwu

Eyinnnaya Abaribe

Ọnụ na-ekwuru Sịnetọ Enyinnaya Abaribe bụ Uche Awom gwara BBC Igbo na onweghi mgbe Sịnetọ Abaribe kwuru na ọ jụrụ ịbịa mgbape ọdọụgbọelu Akanu Ibiam.

Ọ sị dịka onye enyemaka mgbasaozi Abaribe, ha agbasaghị ụdị ozi dị etu a nye onye ntaakụkọ ọbụla.

Awom sị na ozi di etu a kwesịrị isi n'ọnụ Sịnetọ Abaribe pụta bụ nke ọ ga-etinye aka na ya.

Akụkọ na-efegharị na soshal midia ugbua na-ekwu na Sịnetọ Abaribe jụrụ ịbịa oku a kpọrọ ya n'Enugwu maka mgbape ọdọụgbọelu a.

Mana amabeghi ebe onye kwuru nke a nakwa ebe o si malite na-efegharị.

Lee ụfọdụ ihe ndị arụrụ n'ọdọụgbọelu Akanu Ibiam

Okporoụzọ ebe ụgbọelu na

Ebe foto si, Felix Kelechi Ehenemba

Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika kwuputere maka mmepe ọdọụgbọelu Akanu Ibiam n'akara twitter ya ka ọ wụchiri n'ọdọụgbọelu ahụ a na-arụzi n'ụbọchị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Ọgọstụ.

Nke a na-abịa dịka arụzituru ya bụ ọdọụgbọelụ kamgbe ọnwa Ọgọstụ nke afọ 2019.

Ụfọdụ ihe ndị arụrụ gụnyere okporoụzọ ụgbọelu si feda, ihe na-eme ka ụgbọelu na-efetu maọbụ na-efedata n'abali, nakwa ngalaba ebe ụgbọelu mba ofesi ga na-efetu na-efebata.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ọgbọelu Akanu Ibiam

Ebe foto si, Felix Kelechi Ehenemba

A hụrụ Arthur Eze n'ọdọụgbọelu a na-akwado imepe?

Ọdọụgbọelu Akanu Ibiam
Nkọwa foto, Authur Eze so Hadi Sirika fetuo n'Akanu Ibiam ụnyahụ bụ Ọgọst 29 dịka a na-akwado imepe ebe ahụ ọzọ

Akụkọ na foto na-efegharị n'elu soshal midia na-egosi ebe Arthur Eze so mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika fetuo n'ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dịka ọ biara ime nyocha ikpeazụ tupu agbape ebe ahụ.

Cheta na gọọmentị etiti kwuru na ọ bụ ọnwa isii ka ha ga-eji rụzichaa ya bụ ọdọụgbọelu mana o ruola otu afọ.

Okporoụzọ ụgbọelu ji efeli maọbụ fetuo, ahịa dị n'akụkụ ọdọụgbọelu ahụ nke na-ebute ụmụ nnụnnụ imetụta mfetụ maọbụ mfeli ụgbọelu socha n'ihe kpatara e ji mechie ma na-arụzi ya bụ ọdọụgbọelu.

Ọdọụgbọelu

Ebe foto si, Felix Kelechi Ehenemba