Imeela!!
Daalụ maka etu ụnụ si sonyere anyị kamgbe ụbọchị iri na ise nke Jenụwarị 2020,dịka anyị wetere ụnụ ncheta etu agha Biafra si bie. Ka emesia, ya gaziere ụnụ oo.
Akụkọ, mmemme na ihe niile gbasara agha Biafra na mgbe o biri n'afọ 1970
Adline Okere, Chiagozie Nwonwu, Uche Akolisa and Chimamaka Ihenacho
Daalụ maka etu ụnụ si sonyere anyị kamgbe ụbọchị iri na ise nke Jenụwarị 2020,dịka anyị wetere ụnụ ncheta etu agha Biafra si bie. Ka emesia, ya gaziere ụnụ oo.
Gere ihe ndị dị omimi nwanne Kaduna Nzeogwu kwuru maka ya n'ihe nkiri a.
Lekwa ihe ndị ama ama kwuru maka agha Biafra.
Gụo ihe ndi bu umuaka oge agha Biafra kwuru naka ya ebe a.

Jenụwary 15, 1970 mere ya afọ iri ise agha Biafra biri.
Mana ọ bụkwa ụbọchị Okotba 7, n'afọ 1967 ka a kpọtara ndị ọgaranya n'Asaba, wee gbuo ha n'igwe.
Obi Ilomechina Amuwa gwara BBC Igbo ihe anya ya hụrụ n'ụbọchị ahụ na etu o siri zọọ ndụ ya n'ụbọchị ahụ.
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51132551

Ọtutụ ku nwa aka, ma ndị dị ime kọwara etu ụwa dị mgbe ahụ.
Ha ncha na-asị na ha achọghị iji anya ahụ agha ọzọ.
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51127960


Ebe foto si, Getty
Ndị ma ya kwuru na Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu bụ onye tụnyere ọkwa ya, oge ya nakwa ego nna ya maka ọdịmma Igbo bido n' oge agha Biafra rue n'ọnwụ ya.
Emeka bụ nwa a mụrụ n'obi ọgaranya n'abalị anọ nke ọnwa Novemba afọ 1933 n'Ugwu Awusa n'ebe a kpọrọ Zungeru dị na Niger steeti.
Nna ya, Louis Odumegwu Ojukwu, onye Umudim, Nnewi, Anambara steeti bụ nnukwu ọgaranya ka ibe ya n'Afrịka.
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51065330

Lee ihe ndị ji anya ha hụ agha Biafra nwere ikwu maka ihe ha gabigara.
Ị nụrụ maka mmadụ karịrị nari asaa a gbagburu n'Asaba n'afọ 1967?
Ndịagha Naịjirịa kpọpụtara ndị mmadụ n'obodo ahụ, sị ndị nwaanyị kwụrụ n'akụkụ nakwa ndị nke nwoke.
Ha ji mgbọ egbe wụkasịa ndị nke nwoke ahụ (akụkọ kwuru na ụmụaka dịcha ihe dị ka afọ 12 so na ndị a gbagburu).

Rolf Steiner
Steiner bụ onye mba Jamini, so ndị Igbo lụọ agha Biafra n'afọ 1967 ruo 1970.
N'oge agha a, o mechara si n'ọkwa Kọmpany Kọmanda rigoruo n'ọkwa Lt. Col.
Ọ lụrụ agha a na-anaghị ego ọbụla, dịka Chinua Achebe si dee n'akwụkwọ ya bụ 'There was a Country'.

Ebe foto si, Getty Images
Taffy Williams:
Williams bụ onye mba Wales sokwa lụọ agha Biafra.
O mechara bụrụ 'Major' na ndịagha Biafra.
Ọ bụ onye ọcha ikpeazụ lụrụ Biafra agha hapụrụ ha mgbe agha biri.

Ebe foto si, Getty Images
Jan Zumbach:
Zumbach bụ onye mba Swizaland so lụọ agha Biafra.
Ọ rụrụ dịka onye na-efe ụgbọelu.
O so na ndị bidoro ngalaba a ma dịka Biafra Air Force mgbe ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Carl Gustaf von Rosen:
Von Rosen bụ onye mba Swidin rụrụ dịka onye na-efe ụgbọelu.

Ebe foto si, Getty Images

Ebe foto si, Getty Images

Ebe foto si, Onyeka Onwenu
Ihe pụtara n'ọgbakọ Nzuko Ụmụnna mere maka ncheta Agha Biafra ka na-ewu.
Otiegwu a ma ama bụ Onyeka Onwenu kwuru na iwe ihe mere ndị Igbo oge Biara ka na-enwe ya.
O kwuru na ụta Agha Biafra adịghịrị ndị Igbo n'ihi na ọ bụ isi onwe ha ka ha na-azọ were gawa ọgụ.
Ọ gara n'ihu taa Naijiria ụta maka agwa ha gbasara ndị Igbo ma tawa ndị Igbo ụta maka ihe Igbo na-agabiga.
“Iwe Naijiria na-ewe m, Iwe Ndi Igbo na-ewe mana maka na onye a jụrụ anaghị ajụ.”

Ebe foto si, Ntanta/Instagram
Agha Biafra wetara nnukwu ihe mgbu, agụụ na ọnwụ nye ọtụtụ ndị Igbo. Mana ọ bụghịkwa naanị ihe ọghọm ka ya bụ agha wetara.

Otu ihe bara uru mmadụ nwere ike ikwu n'ọgụ Biafra wetara bụ azụ okporoko.
Gụọ ya n'uju ebe a: https://www.bbc.com/igbo/afirika-51102881
O bidoro site n'iweghara ọchịchị n'ike nke ụfọdụ ndị agha nke Chukwuma Nzeogwu mere ebe e gburu ụfọdụ ndị ọchịchị.
Iweghara ọchịchị n'ike ọzọ mere ka ọnwa isii gachara nke Muritala Muhammed nọ n'isi ya ebe e gburu ọtụtụ ndị Igbo n'Ugwu Naịjirịa.
Ha gbara ọsọ laa n'ala Igbo, ebe ha nọọ kwubie na ị gara onwe ha kara ha mma.
Mana Goomentị Naịjirịa busoro ha agha dịka ha jụrụ inye ha nnwereonwe ha chọrọ.
Mana ndị hụrụ agha ahụ na-ekwu ọzọ emela.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Igwe mmadụ pụtara n'emume "Never Again" nke e kpokọbara na Legọs mere ya bụ ncheta.
Ha gbachiri nkiti n'ime nkeji abụọ iji mee ncheta ma kwanyere ndị a uwgu.
Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu etinyela ọnụ na nweta Biafra.
Otu n'ime ha bụ Ọkaikpe Nkemdilim Izuako.
Lee okwu ya n'uju ebe a.