Gọvanọ Ebonyi Steeti enyela iwu ka e mee nnyocha maka ogbugbu e gburu Eze Francis Igwe

Ebe foto si, Francis Nwifuru/Facebook
Aka na-achị Ebonyi steeti bụ Francis Ogbonna Nwifuru enyela iwu ka ndị ọrụ nchekwa malite ime nnyocha zuruoke n'ọnwụ Eze ọdịnala obodo Ndufu-Alike dị n'okpuru ọchịchị Ikwo bụ Eze Francis Igwe ndị ojiegbe tọọrọ ma gbuo.
Cheta na ndị ojiegbe tọọrọ Eze Francis Igwe n'ụbọchọ Sọnde 1 Maachị, 2026 oge ọ na-aga ụka n'ụtụtụ ụbọchị ahụ.
Ozi odeakwụkwọ Gọvanọ Nwifuru bụ Monday Uzor wepụtara, mere ka o doo anya na ọnwụ Eze Francis dị mwute nye obodo Ndufu-Alike nakwa Ebonyi steeti niile.
O kwuru na Gọvanọ Nwifuru kagburu ọgbakọ State Executive Council nke izuụka a iji nye ya ohere ịga hụ ndị ezinaụlọ Eze Francis na ndị obodo Ndufu-Alike ma tie ha aka n'obi.
Gọvanọ Nwifuru kwuru na ndị ọrụ nchekwa anụchiela ụfọdụ ndị a na-enye enyo n'aka ha dị n'ajọ agwa ahụ ma kwe nkwa na onye ọbụla aka ya dị n'ọnwụ Eze Francis ga-enweta ntaramahụhụ zuruoke dịka iwu si kwuo.
Nwa Eze Francis Igwe ma bụrụkwa onye bụbu osote Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Kelvin Igwe kelere Gọvanọ Nwifuru maka ịbịa leta ezinaụlọ ha n'oge iru uju a nakwa mbọ gọọmenti na-agba inwụchi ndị kpara ya bụ ajọ agwa.

Ebe foto si, Francis Nwifuru/Facebook
Ihe ndị uweojii kwuru

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii Ebonyi steeti kwuru na ha malitere ime nnyocha ngwangwa ha nwetara ozi banyere ọtịtọ a tọrọ Eze Francis Igwe nke mere ka ha nwụchie mmadụ itoolu e kwuru na aka ha dị na ya.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Joshua Ukandu kwuru na ndị ahụ ha nwụchiri gwara ndị uweojii na ha gburu Eze Francis n'ụbọchị Mọnde 2 Maachị, 2026 ma gosikwa ndị uweojii ebe ha liri ozu ya.
Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii gwupụtara ozu Eze Francis ma tinye ya n'ọba ozu dịka nnyocha ka na-aga n'ihu.





























