A họputala Laurent Mbanda dịka onyeisi otu ụka Anglịkan kewapụtara ọhụrụ

A họpụtala onye ụkọchukwu Laurent Mbanda si mba Rụwanda dịka onyeisi otu ndị ụka Anglịkan kewapụtara ọhụrụ na-ahụtaghị ụka Anglịkan nọ na Canterbury dịka ndị isi ha.
E kewapụtara 'Global Anglican Council' (Gafcon) n'ime otu 'Anglican Communion'.
Mbanda, onyeisi ụka Anglịkan na Rụwanda bụ onye a họpụtara na nzukọ otu 'Gafcon' mere n'ụbọchị Wenezde.
Ntuliaka onyeisi otu 'Gafcon' bụ otu n'ime emume ndị a na-eme na nzukọ Gafcon 26 n'isiobodo Abuja nke Naịjirịa nke ọtụtụ ndị Anglịkan si mba dị iche iche bịa nke gụnyere 'North Amerịka, Australia na Afrịka.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a

Ihe dị iche n'otu 'Global Anglican Council' na 'Anglican Communion' bụ na ndị 'Global Anglican Council' ahụtaghị Achịbishọpụ ọhụrụ ahọpụtara na Canterbury dịka onye ndu ha.
Cheta na-ahọpụtara Dame Sarah Mullally dịka onyeisi ụka Anglịkan n'Ịngland mana Gafcon sị na ha anaghị emegide nhọpụta nwaanyị dịka onyeisi ụka ahụ kama ha boro ndị nọ n'isi ọchịchị ụka Anglịkan n'Ịngland ebubo itinye ihe mmụta na nkuzi n'edoghị anya n'okpukperechi ndị Anglịkan nke na-anọghị n'Akwụkwọ Nsọ.
Odeakwụkwọ mgbasa ozi nzukọ 'Gafcon 26 bụ Justin Murff gwara ndị ntaakụkọ n'ụbọchị Wenezde 4 Maachị 2026, na otu ha abụghị nke pụtara n'ime otu mba ụwa nke Anglịkan kama na ọ bụ ụlọụka nke Ịngland bụ nke si n'ime otu mba ụwa nke Anglịkan pụọ.



























