Ihe mere ụka Anglịkan ji gbarụọ ihu nye ụkọchukwu kpeere dịbịa ekpere

Foto gosiri ka Gideon Arinzechukwu Uzomechina nọ na-ekpere Akwa ọkụkọ ekpere

Ebe foto si, Screen Grab

Nkọwa foto, Foto gosiri ka Gideon Arinzechukwu Uzomechina nọ na-ekpere Akwa ọkụkọ ekpere n'emume mmepe ụlọ ndịna.

Otu ụka Anglịkan na Naịjirịa ezipụtala ozi na-ekwu na ha amaghị onye otu ụkọchukwu aha ya bụ Gideon Arinzechukwu Uzomechina bụ.

Nke a na-abịa dịka otu ihe onyonyo gbara na sochal midia na nso nso gosiri ka ya bụ ụkọchukwu nọ na-ekwu okwu ma na-ekpe ekpere n’emume mmepe ụlọ ndịna dịbịa a ma ama bụ Akwa Ọkụkọ.

Ozi ụka Anglịkan nke Naịjirịa kọwara na ha akwadoghi ya bụ agwa n’ihi na “ụkpụrụ ụka Kraịsti nke gbadoro ụkwụ n’akwụkwọ nsọ Baịbụlụ anaghị ahụta maọbụ enye ndị dịbịa ọdịnala ihe nrite ọbụla etu Ụkọchuwku Gideon Arinzechukwu Uzomechina nke ụka Messiah Anglican Church, New Jersey USA siri gosi”.

N’ihe onyonyo ahụ, ụkọchukwu ahụ kwuru na ọ na-akpọku Akwa ọkụkọ ka ọ bịa mba Amerịka nweta ihe nrite pụrụiche maka ọrụ ọma ọ na-arụrụ ndị obodo ya nakwa ndị ntorobịa.

Ozi a nke ọdeakwụkwọ ụka Anglịkan bụ Paul Dajur zipụtara kwuru na ha achọghị ka ọha jịkọọ agwa ụkọchukwu ahụ na ụkpụrụ ụka Anglịkan na Naịjrịa na-agbaso ma ncha.

Skip Facebook post
Hapụ Facebook ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Facebook. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Facebook iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of Facebook post

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Ụka Anglịkan na Akwa ọkụkọ

Ebe foto si, Getty Images/Akwa Okuko /Facebook

Gịnị mere na ya bụ emume kpọkwem?

Ihe onyonyo pụtara na soshal midia gosiri ka nwoke nke ụka Anglịkan si na aha ya bụ Gideon Arinzechukwu Uzomechina ebe ya na dịbịa Akwa ọkụkụ kwụ n’ihu ụlọ ndịna ọhụrụ.

Ndị mmadụ gbakọrọ ebe ahụ na ya bụ ihe dịka emume mmepe ma na-ege ya ntị ebe ụfọdụ nọ na-esete ihe na-eme.

Uzomechina kwuru ọtụtụ okwu mana ọ kọwara na oteela ọ matara onye Akwa ọkụkọ bụ. Na ha abụọ tokọrọ tupu ya onwe ya agwazie mba ofesi.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

O kọwara hoo ha na ọ ghọtara na ndị ụka na Naịjirịa anaghị anabata agwa ya mana ọ chọghị ima.

O kwuru:

“Anyị anaghị ele ndị mmadụ anya n’ihu maọbụ ndị ụka Naịjirịa”

“Ọ bụ ihe nkwanye oke ugwu na ọ kpọrọ ka m gbapere ya oke ụlọ a mara mma”

O kpere Akwa ọkụkọ ekpere ma gozie ya ma gaa n’ihu gụọ akwụkwọ nsọ Bịabụlụ n’ihu ya bụ ụlọ ndịna. Akụkụ akwụkwọ nsọ ọ gụrụ bụ nke a ma ama bụ akụkọ metụtara nwoke obi ọma sị mpaghara Samrịtan nke nyeere otu nwoke ndị omekome wakporo ma tọgbọ n’ụzọ.

Ọ hara n’ihu kwuo na Akwa Ọkụkụ bụ onye obi ọma dịka ọ wepụtara onwe ya ka onye na-enyere ọha aka.

Na nchịkọta o kwuru “Ụka, ụkọchukwu, ndị isi ụka Karịst agaghị ebuba gị ala Eze Chineke.”

Ọ gakwara n’ihu kpee ekpere megide ndị ọ sị nwereike ị bụ ndị ịrọ Akwa Ọkụkọ ‘Ha gbaa n’ụzọ a ị rụrụ, ha ga-ada ngwọrọ.”

O kwuru na ụka Anglịkan nke Naịjirịa na-akatọọ ma na nke a ahụ agbasaghị ya n’ihi ọ bụghị onye otu Ụka Anglịkan nke Naịjirịa kama ọ bụ onye otu ụka Anglịkan nke mba Amerịka.

 Ihe abụghị mbụ nwoke dịbịa a aha ya bụ Akwa ọkụkụ nakwa ndị ụka Kraịstị na-atakọta isi

Na mbịdọ afọ a, akụkọ pụtara na Gozie Okeke bụ otiegwu a ma ama na Naịjirịa ọkachasị n'etiti ndị okpukperechi Kraịst gụrụ Dịbịa afa bụ Akwa ọkụkọ egwu.

Ihe onyonyo fesara gosiri ka Okeke nọ na-agụrụ Akwa ọkụkọ egwu otito. Ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ ya ma kwuo na onye ụka Kraịsti na onye dịbịa ekwesịghị inwe mmekọ ọbụla.

Gozie ji iwe kwuo okwu n’ozi o wepụtara na soshal midia sị:

 "Ahụghị m ihe ọjọọ dị n'ihe m mere, Akwa bọrọ m ego, gosi m ịhụnaya nke mere m ji gụọrọ ya egwu otuto".

O jikwa iwe kwuo na ndị na-akatọ ya na-eme ka ọ bụ ha bụ ndị kacha ndị nsọ.

Bịshopụ Chinasa Nwosu na-agba arụsị ndị mmadụ ọkụ nke o kwuru megidere okpukerechi Kraịsti

Ebe foto si, The Royal Church

Nkọwa foto, Bịshopụ Chinasa Nwosu na-agba arụsị ndị mmadụ ọkụ nke o kwuru megidere okpukerechi Kraịsti

Gịnị mere agwa ụkọchukwu a jiri bụrụ okwu?

Ihe gbasara okpukperechi na mba Naịjirịa ebe okpukperechi bụ isi sekpụ nti n’ọtụtụ ihe bụ ihe na-akpatarị ọtụtụ okwu ma n’alụmdinanwunye, ezinaụlọ, ọchịchị, usoro ọrụ, ejiji nakwa ihe ndị ọzọ.

Ọ na-adị ụkọ ịhụ onye Naijiria na-adịghị esonye otu okpuruchiọbụla maọbụladị nke okpukperechi Kraịsti, nke ụka Alakụba maọbụ nke ọdịnala.

Enwere ndị na-eso okpukperechi ọdịnala mana ọnụ ọgụgụ ha ebughi ibu ugbua ka ọ dị bụ n’oge mbụ.

Ọdịnala bụbu isi okpukperechi ọtụtụ ndị mmadụ n’Ọwụwa anyanwụ Naịjirịa tupu ewebata iso Ụzọ Kraịst bụ nke ndị ọcha bubatara mgbe ha chịrị na Naịjirịa mana ugbua, enwela ndị na-eso ụzọ ọdịnala na-eselite isi ha na mpaghara ahụ ọzọ ọkachasị ndị ntorobịa.

Dịka ụka Kraịstị batara, ọtụtụ ndị Igbo hapụrụ ụkpụrụ ọdịnala ma sowezie ụzọ okpukperechi Kraịsti.

Nke a mere e ji gbakọta ọtụtụ omenala nakwa usoro ya bụ okpukperechi azụ ma na-ahụ ya ka ihe megidere ụzọ nakwa ụkpụrụ ụka Kraịsti.

N’ọtụtụ obodo ndị mmadụ agbaala arụsị ha ọkụ dịka ha na-ekwu na okpukerechi Kraịsti anaghị abata mmadụ ikpere Chukwu ụka ahụ ma na-ekpekwara arụsị.

Otu nwoke aha ya bụ Cletus Chukwuemeka Ogbodo gwara BBC na:

"Ndị ụkọchukwu na-agba ụlọ arụsị anyị ọkụ. Ndị pastọ na-agba ihe nka nakwa akụrụakpụ arụsị ndị nna nna anyị ọkụ n'oge emume mgbasaozi ụka ha bụ ‘Crusade’"

Nke a bụ ka ọ na-ekwu okwu banyere mwakpo ọ sị ndị ụka Kraịst na-awakpo ebe ofufe ndị ọdịnala.

O kwuru, sị, Ọ bụrụ na gọọmenti gbasoo usoro iwu Naịjirịa kwesịrị ichekwa okpukperechi onye ọbụla dịka ikike dịrị onye, na ọ ga-enyere ndị mmadụ aka n’inweike soro uzo okpukperechi sọrọ ha ma kpee ndị na-awakpo ụlọ arụsị ikpe dịịrị ha.