Joseph Bassitome: Lee etu ụkọchukwu Catholic si hapụ ụka ma bụrụzia dibia

Foto ụkọchukwu na dibia

Ebe foto si, BBC/Getty Images

Otu ụkọchukwu akpọrọ Joseph Bassitome nọ na Catholic diocese dị na mba Togo agbahapụla ụka ma bụrụzia dibia.

Ndị isi ụka Catholic nọ na Togo kwuru ka ekpewara Bassitome ekpere makana ọ bụ naanị chukwu ga-ewere ọnọdụ n'isi ya.

Lee etu o si mee

Ụka catholic nọ na mba Togo kwuru na akụkọ, na Bassitome bụ onye nchịkọta ụka ''Saint Ferdinand de Vogan" eburula ofufe omenala bata ụka malitere ka kepu kepu.

Bishop Isaac Jogues Gaglo bụ onye nchịkọta diocese Aneho depụtara n'akwụkwọ ozi o zipụrụ ọha na ndị ụka Bassitome boro ya ebubo ịgwakọ ofufe omenala na ụka ọnụ ma na-agwa ndị ụka ya ha soro ụzọ ahụ.

"Ọ bụ n'ihi ọtụtụ kepu kepu anyị na-anụ mere anyị kwụọ ka anyị nwee nzuko maka ịsachapụ ahụ nke afọ 2021.

"E mechakwara m hụ okwu o kwuru n'igwe okwu, ebe ọ na-efe chi omenala. A kpọrọ m ya oku n'ihu TRP Vicar General nakwa TRP Episcopal Vicar na-ahụ maka ndị ụkọchukwu ka enyochaa ya bụ okwu.

Bishop Gaglo kwuru na Bassitome kwetere na ọ bụ ya nọ n'igwe okwu ahụ akpọku chi omenaala ma sikwa na ya bụ onye otu akpọrọ ""African Renaissance" .

"A gwara m ya ka ọ pụọ n'otu ahụ ozigbo nakwa na ọ ga-aga na "Dzogbegan monastery" maka nsacha nke mmụọ."

"A kpọkwara m ya ọkụ ọzọ, mgbe ahụ ka ọ gwara m na ọ na-agba arụkwaghịm ịbụ ụkọchukwu. O nyere m akwukwọ arụkwaghịm ya nke o ji aka ya depụta."

Bishop Gaglo gara n'ihu kwuo na ọ gwara ndị ndụmọdụ ya nakwa ndị ezinụlọ Bassitome maka etu o si gbaa arụkwaghị m.

N'ọnụ ya, "otebeghị aka anyị malitere usoro ọpụpụ ya tupu anyị hụwa foto ebe o yi uwe ndị dibia na-efegharị n'elu soshal midia."

Ndụmọdụ Bishop Gaglo nyere ndị ụka katọlik

Bishop Isaac Gaglo bu onyeisi Diocese Aneho

Ebe foto si, DioceseAneho.org

Nkọwa foto, Bishop Isaac Gaglo bu onyeisi Diocese Aneho

O kwuru na ọ dị mma ka ndị mmadụ mata na ụkọchukwu Joseph Bassitome abụghịzị ụkọchukwu.

N'ọnụ ya, ọ ka bụ nwanne anyị, anyị na-ekpekwa ekpere maka nchegharị ya."

"Mana etu ọ dị ugbua, inweghịke ịkpọzi ya ụkọchukwu Catholic. Ọ ga-adị mma ka ịghara ịma ya ikpe maọbụ katọọ ya."

Bishop Gaglo gara n'ihu gwa ndị mmadụ ha zere isonye otu ndị na-agwakọ ofufe omenala nakwa nke ụka makana ha kazi nkụ na soshal midia."