Etu nkwado nwoke maọbụ nwaanyị ịlụ ibe ya si ebute esemokwu n’ụlọụka Anglịkan n’ụwa

Ndị Bishọp Ụka Anglịkan

Ebe foto si, Church of Nigeria/Facebook

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọụka Anglican nke Naịjirịa eyiela egwu na ha nwereike ikewapụta onwe ha site n’isi ụlọọụka Anglịkan nke ụwa dị na mba Briten a kpọrọ ‘Church of England’.

Nke a bụ maka na ndịisi ụlọụka a nwere ọgbakọ ma kwadoo ka ọlụụ nwoke na nwoke, nakwa nwaanyị na nwaanyị.

N’ọzi, ụlọụka Anglịkan nke Naịjirịa wepụtara n’ụbọchị 24 Julaị, 2024 bụ Achịbishọp Henry Chukwudum Ndukuba, onyeisi ha tinyere aka na ya kwuru na nke a megidere nkuzi na eziokwu dị n’akwụkwọ nsọ banyere ọlụlụ di na nwunye.

O kwuru na ọ bụrụ na Achịbishọp nke Canterbury na ụlọụka Anglịkan nke Ịngland gaa n’ihu kwadoo ka ndị ụkọchukwu soro n’emume nwoke ịlụ ibe ya na nke nwaanyị ịlụ ibe ya, na ha (Anglịkan nke Naịjirịa) ga-ekewapụta onwe ya site n’Anglịkan nke Ịngland.

Gịnị butere okwu a?

Okwu a malitere mgbe ndịisi ụlọụka Anglịkan n’ụwa mere ọgbakọ a kpọro ‘General Synod’ nke ụlọụka Ịngland n’ụbọchị 8 Julaị, 2024.

N’ọgbakọ ahụ a mere ntuliaka iji mara ma ụlọụka Anglịkan ọ ga-amalite ịkwado ọlụlụ nwoke na ibe nakwa ọlụlụ nwaanyị na ibe, tinyere inye ohere ka ndị ụkọchukwu soro n’ụdịrị alụmdina nwunye ahụ.

Na ntuliaka ahụ, ndị Bịshọp kwetere n’ụdịrị ọlụlụ di na nwunye a dị 22 ebe ndị jụrụ ịnabata ya dị 12.

Ndị ụkọchukwu nabatara ya dị 99 ebe ndị ụkọchukwu jụrụ ya 88

N’otu aka ahụ ndị Laity nabatara ụdịrị ọlụlụ a dị 95 ebe ndị jụrụ ya dị 91.

“Nke a gosiri ụlọụka nke ndị Bishọp ha gbahapụrụ okwu Chineke”

Onyeisi ụka Anglịkan na Naịjirịa bụ Achịbishọp Henry Chukwudum Ndukuba

Ebe foto si, Church of Nigeria/Facebook

Achịbishọp Ndukuba kwuru na mkpebi a na-egosi ụlọụka ndị Bishọp ha gbahapụrụ okwu Chineke ma wepụ ikikere dị n’akwụkwọ nsọ ma sorozie omenala ndị uwa.

“ọ dị mkpa ka a mata na ndị Achịbishọp na Bishọp a ṅụrụ iyi ịkwanyere iwu na-achịkọta ụka Anglịkan ugwu mgbe e duru ha n’iyi ọrụ mana site na mkpebi nke Synod banyere mmadụ ịlụ ụdịdị okike ya, ndị Bishọp ahapụla usoro niile a bụ nke ha kwupụtara n’ihu ọha.

“Ọ bụrụ na Achịbishọp nke Canterbury na Anglịkan nke Ịngland gaa n’ihu kwadoo ka ndị ụkọchukwu soro n’ụdịrị ọlụlụ nwoke na ibe ya nakwa nwaanyị na ibe ya ụlọụka Anglịkan nke Naịjirịa ga-ekewapụ site na njịkọta ha na ụka Anglịkan nke Ịngland.

Ọ gara n’ihu kwuo na Anglịkan nke Naịjirịa so otu ‘Church of England Evangelical Council (CEEC), GAFCON nakwa ndị Anglịkan ndị ọzọ na-akatọ mkpebi ụka Anglịkan nke Ịngland ka nwoke lụọ nwoke ibe ya nakwa nwaanyị ịlụ nwaanyị ibe ya.

Kedụ ihe nke a pụtara nye ụlọụka Anglịkan?

Achịbishọp nke Canterbury, Justin Welby

Ebe foto si, Getty Images

Mkpebi a ndịisi ụlọụka Anglịkan mere ịkwado ka nwoke lụọ ibe ya nakwa nwaanyị ịlụ ibe maọbụ ka ndị ụkọchukwu soro n’ụdịrị ọlụlụ a ga-ebute nnukwu mgbanwe nye ndị na-ekpere Chineke n’ụlọụka ahụ.

O dobeghi anya kpọmkwem mgbe a ga-etinye mkpebi ọhụrụ a n’ọrụ n’ụlọụka ahụ.

Mana a na-atụ anya na ọ bụ mgbe onyeisi ụlọụka Anglịkan n’ụwa bụ Achịbishọp nke Canterbury, Justin Welby tinyere aka n’ịkwado mkpebi ahụ.

Dịka ọ dị ugbua a mabeghi ma ọ ga-akwado ya maọbụ na ọ gaghị akwado ya.