Mathias Ezeaku arrested : Lee onye ndu otu 'Omenala bu Uzọ Eziokwu' dịka a tọhapụrụ ya ọzọ

Ọkaiwu Mike Ozekhome, Mathias Ezeaku na ọkaiwu Malcolm Omoirhobo,

Ebe foto si, Mathias Ezeakụ/Facebook

A tọhapụla onye ndu otu Omenala a kpọrọ 'Omenala bụ Uzọ Eziokwu' bụ Mathias Ezeakụ ozo dịka e jichichara ya nke ụgbọro abụọ n’ Abuja maka ihe metụtara ozi ọ na-agbasa.

Osote ya bụ Chekwube Okwunwendu , onye gwara BBC n'ekwentị na ọ bụ eziokwu sị, "A tọhapụrụ ya n'ụbọchị Wenezde, maka ọ natabeghị , ọ ka nọ Abuja."

N'abalị 19, nke ọnwa Novemba, afọ 2023, ndị bu egbe yi akwa yiri nke ndị uweojii wakporo Amafor Hall Nkpor, Anambara steeti, gbakasịa egbe, ma nwuchie Ezeaku bụ onye ha kpụrụ gawa Abuja.

Mana ha tọhapụrụ ya Ezeaku ụbọchị Tuzde, abalị 21 nke ọnwa Novemba, ma mechaa kpọkwaya oku ọzọ.

E jichie ya ka ọ gara ịza ya bu oku.

Okaiwu Mike Ozekhome na Mathias Ezeakụ

Ebe foto si, Mathias Ezeaku/Facebook

Ndị otu ya boro ebubo na ọ bụ onye ozioma Ebuka Obi bụ onye nyere mkpesa sị gaa kpụrụ Ezeakụ mana Obi kwuru n'ozi ọ gbasara n'ọbaozi Facebook ya na aka ya adịghị na nnwụchi Ezeaku.

Lee ọnọdụ onye mgbọ tụrụ oge a wakporo ọgbakọ ndị Omenala Bụ Uzo Eziokwu

Alum Okorie

Ebe foto si, Chekwube Okwunwendu

Otu nwoke mgbọ tụrụ dịka ndị a na-enyo na ha bụ ndị uweojii wakporo ebe ọgbakọ ndị ụka omenala a kpọrọ 'Omenala Bu Ụzọ Eziokwu ka nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwụ.

Mgbọ tụrụ Alum Okorie, gbara afọ 31, onye ọzụahịa bi n'Anambara steeti oge ndị a sị bụ ndị uweojii wakporo ọgbakọ ha.

N'abalị 19, nke ọnwa Novemba, afọ 2023, ndị bu egbe yi akwa yiri nke ndị uweojii wakporo Amafor Hall Nkpor, Anambara steeti, gbakasịa egbe, ma nwuchie onye ndu ha bụ Mathias Ezeaku na Osote ya bụ Chekwube Okwunwendu.

Alum Okorie

Ebe foto si, Chekwube Okwunwendu

Otu nwoke mgbọ tụrụ dịka ndị a na-enyo na ha bụ ndị uweojii wakporo ebe ọgbakọ ndị ụka omenala a kpọrọ 'Omenala Bu Ụzọ Eziokwu ka nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwụ.

Mgbọ tụrụ Alum Okorie, gbara afọ 31, onye ọzụahịa bi n'Anambara steeti oge ndị a sị bụ ndị uweojii wakporo ọgbakọ ha.

N'abalị 19, nke ọnwa Novemba, afọ 2023, ndị bu egbe yi akwa yiri nke ndị uweojii wakporo Amafor Hall Nkpor, Anambara steeti, gbakasịa egbe, ma nwuchie onye ndu ha bụ Mathias Ezeaku na Osote ya bụ Chekwube Okwunwendu.

Okorie so na ndị merụrụ ahụ na girigiri dapụtara dịka ndị ọrụ nchekwa ahụ bịara.

N'okwu ọnọdụ ahụike Okorie bụ onye nọ n'ụlọọgwụ a kpọghị aha ya, Osote onyeisi otu Omenala Bu Eziokwu bụ Chekwube Okwunwendu kwụrụ sị, "Mgbọ tụrụ ya, gbajie ya ụkwụ.O si n'otu akụkụ banye, si n’akụkụ nke ọzọ pụọ."

" Ugbua, e kowere ukwu ya n’elu, dókita sí a aga. A waala ya ahụ mbụ, dọkịta sị na ọ bụ ọnya ahụ laa tupu a waa ya ọzọ maka idozi ọkpụkpụ gbajiri.

A tọhapụla onye ndu 'Omenala bụ Uzọ Eziokwu'

Mathias Ezeaku

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na a tọhapụla onye ndu otu 'Omenala bụ Ụzọ Eziokwu' bụ Mathias Ezeaku.

Ndị a na-enyo na ha bụ ndị uweojii wakporo ụlọ ọgbakọ ndị Omenala Uzọ Eziokwu dị n' 'Amafo Town Hall' dị na Nkpor, Anambra steeti n'ụtụtụ ụbọchị ụka, nwụchie Ezeaku na Osote ya bụ Chekwubechukwu Okwunwendu.

Mathias Ezeaku

Ebe foto si, Mathias Ezeaku/Facebook

Osote ya bụ Chekwube Okwunwendu , onye gbara BBC ama n'ekwentị n'ụtụtụ Tozde, kwuru na a tọhapụrụ ya ụbọchị Tuzde.

Ọ sịrị,"A tohapula Ezeaku. A tọhapuru ya nwanne ụnyahụ mana ọ bụ ụnyahụ ka ọ batara Anambara."

Okwunwendu onye e so nwuchie ya na Ezeaku ma mecha tọhapụ ya site na SARS Awkuzu na mgbede ụbọchị a nwuchiri ha kọwaa na "Ka a tọhapụchara m,na a kpụrụ Ezeakụ gawa Abuja."

Ọ gara n'ihu kwuo na Ezeakụ nọ n'ụlọọgwụ ugbua anata nleta.

Ọ bụghị m sị ka a nwụchie ya - Ebuka Obi

Ebuka Obi, Ezeaku

Ebe foto si, Zion Ministry/Mathias Ezeaku

Onye ndu otu 'Zion Ministry' dị na Legọs, bụ Ebuka Obi ekwuola na ọ bụghị ya nyere iwu ka a kpụrụ onye ndu otu Omenala bụ Ụzọ eziokwu bụ Mathias Ezeaku.

O kwuru na aka ya adịghị ya ma ncha.

O kwuru nke a n'ozi ya dịka ọ na-ezi oziọma n'ogige ụlọekpere ya dị n'Okota, Legọs, na mgbede Wenezde.

Onye oziọma ahụ kwuru na aka ya adịghị na nnwuchi Ezeakụ.

Ọ sịrị, "Etu a ụnụ si kirie ihe mere ọ na-eme, ka m si kirikwa ya, aka Ebuka Obi adịghị ya.”

Ọ kọwara na ihe mere e ji akpọ ya aha bụ maka okwu chuwu o kwuru izuụka abụo gara aga mere e ji kpụrụ otu nwata nwoke na Facebook maka okwu o kwuru megide ya.

Ọ sị na ọ rịọrọ ka atọghapụkwa nwa amadi ahụ ma kwusie ike na aka ya adịghị na nke a.

Ebuka Obi

Ebe foto si, Zion Ministry/Facebook

Ọ gbarụrụ ihu etu ụfọdụ ndị si Ọwụẁa Anyanwụ si emetọ aha ya,sị, "Ụmụ Igbo kwesịrị imepe anya ha. Ebuka Obi anọghịkwa ala Igbo, n’ala Yoroba ka m nọ."

" Ndị kwesịrị ị na-ebu m agha bụ ndị Yoroba. Kedụ ka o siri bụrụ ndị Igbo kpụ Ebuka Obi n’ọnụ?"

"Mgbe ị na-eche na ọ bụ Ebuka Obi, o nwere onye m nara ala obi nna ya?"

"O nwere onye m dinara nwunye ya? Eriri mnke e siri dobere gị?"

"Amụma chi m ka m na-ebu.”

Ọ gara n’ihu rịọ ndị jere ije ahụ sị, "Biko gbara nụ" ma sị, "Ozo emena.”

Cheta na n'ụtụtụ Ụbọchịụka, abalị 19 nke ọnwa Novemba afọ 2023, ndị a na-enyo na ha bụ ndị uweojii wakporo 'Amafo Town Hall' dị na Nkpor, Anambara steeti bụ ụlọ ọgbakọ otu, 'Omenala Bụ Uzo Eziokwu', nwụchie onyeisi ha bụ Mathias Ezeaku na osote ya bụ Chekwubechukwu Okwunwendu bụ onye ha mechara tọhapụ.

'Ọ bụ Ebuka Obi nyere mkpesa e ji nwụchie onye ndu anyị'

Mathias Ezeaku na Ebuka Obi

Ebe foto si, BBC/Zion Ministry

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ndị otu ụka omenala a kpọrọ ' Omenala bụ Ụzọ Eziokwu' arụọla onye ozioma a ma ama bụ Ebuka Obi nke Zion Ministry Legọs aka dịka onye na-akụrụ ndị nwuchiri onye ndu ha na nsonso a egwu ha na-agba.

N'ụtụtụ Ụbọchịụka, ,abalị 19 nke ọnwa Novemba afọ 2023, ndị a na-enyo na ha bụ ndị uweojii wakporo 'Amafo Town Hall' dị na Nkpor, Anambara steeti bụ ụlọ ọgbakọ otu, 'Omenala Bụ Uzo Eziokwu', nwụchie onyeisi ha bụ Mathias Ezeaku na osote ya bụ Chekwubechukwu Okwunwendu bụ onye ha mechara tọhapụ.

Na mkparịtaụka BBC Igbo na Okwunwendu nwere n'ụtụtụ Tuzde o kwuru nchọpụta ha mere gosiri na ọ bụ Ebuka Obi nke Zion Ministry Legọs ka aka ya dị na nnwuchi Ezeakụ maka ebubo ịkatọ onye oziọma ahụ.

Ọ sịrị, "Anyị nwetara ozi si n'aka ndị anyị zipuru maka ịhụ maka okwu onye ndu anyị. Ha kwuru na ọ bụ Ebuka Obi Zion Ministry bụ onye dunyere ndị uweojii bịara wakpoo anyị, kpụrụ onyeisi anyị site n' akwụkwọ mkpesa o dere."

" Ebubo ya bụ na ọ sị na anyị sị na ya na-eme ihe nrịbama ụgha."

"Ya bụ na o nwere ike isi n'aha Jesus gwa onye isi ọhụụzọ o mee, na ya anaghị eme ihe nribama ụgha."

N'ọsịsa ajụjụ ma o nwere ka Ezeakụ si kpọọ aha Ebukaobi n'ozi ndị ọ na-ezi, Okwunwendu , onye kwuru na Ezeaku na Obi na-akpọrịta onwe ha aha n'ozi ha gara n'ihu sị, "Ebuka Obi akpọọla ya aha ugboro ugboro,sị ya hapụ omenala."

Mbọ BBC Igbo gbara inweta ọnụ Ebuka Obi nakwa otu Zion Ministry amịtaghị mkpụrụ rue oge anyị ji bipụta akụkọ a.

Ha azaghị ekwentị nke ha na-asa ozi e zigara ha n'ekwentị nakwa site n'intanet.

"Ndị uweojii nwụchiri anyị kpụrụ anyị gawa SARS Awkuzu"

Mathias Ezeakụ na Osote ya bụ Chekwube Okwunwendu

Ebe foto si, BBC/ Chekwube Okwunwendu/Facebook

Otu 'Omenala Bụ Uzo Eziokwu' agbarụọla ihu etu ndị a na-enyo na ha bụ ndị uweojii si wakpoo ụlọ okpukperechi ha nwuchie onye ndu ha bụ Mathias Ezeaku ma gbajie otu onye otu ha ụkwụ.

Ndị a na-enyo na ha bụ ndị uweojii wakporo 'Amafo Town Hall' dị na Nkpor, Anambra steeti n'ụtụtụ ụbọchị ụka, nwụchie onyeisi otu, 'Omenala Bụ Uzo Eziokwu' bụ Mathias Ezeaku na Osote ya bụ Chekwubechukwu Okwunwendu.

Okwunwendu bụ onye e mechara tọhapụ gwara BBC Igbo na-ekwentị, "Etu ihe si kwuru ugbua, o weela anyị anya na ọbụ ndị uweojii kpụrụ Ezeakụ."

"Ebe elekere asatọ ka anyị gbakọrọ maka ọgbakọ etu anyị si eme. Anyị nọzị na-ele anya, ọtụtụ ụgbọala na-abata n'ike n'ebube."

"Mụ na Ezeakụ pụtara n'ọnụụzọ na-ajụ ha ihe ha bịara."

"Ha anwụchie Ezeaku, anyị na-ajụzi ihe mere, ndị otu anyị pụtazie na-ajụ ọ gịnị na-eme?

"Ha ebido gbaliwe egbe elu."

Okwunwendu gara n'ihu katọọ agwa ndị ahụ e chere bụ ndị uweojii kpara oge ha bịara ya bụ ije.

Ọ sịrị,"Mathias Ezeakụ bụ onye a ma ama, o nweghị ihe gbochiri ndị uweojii izitere ya akwụkwọ akpọmoku sị ya bịa karịa iwakpo."

"Gbawa egbe. Ka anyị na-eme mgbọ tụọ otu onye nke anyị ."

Kedụ ebubo e jiri nwuchie Ezeaku?

Osote Ezeaku bụ Okwunwendu kọwara na ndị ahụ nwuchiri ha kwuru na o nwere ndị detaara mkpesa megide Ezeaku na etu o si agbasa oziọma omenala ya.

" Ha sịrị na o nwere onye detaara ha akwụwkọ mkpesa megide ya, na ọ na-akpọ ha aha ma ọ na-ekwu okwu megide onye ahụ."

Ezeaku bụ onye a ma amaka maka ịkatọ ndị Ụka Kraisti maka ụfọdụ nkwenye bụ nke ọ kpọrọ nkwenye ndị 'ụka ọbịa'.

Etu ndị a siri nwuchie Mathias

Mathias Ezeaku Ejiofor

Ebe foto si, BBC/Mathias Ezeaku/Facebook

Mgbọ egbe atụọla otu nwoke n'ụkwụ dịka ndị a na-enyo na ha bụ ndị uweojii wakporo ebe okpukperechi omenala a kpọrọ 'Omenala Bụ Uzo Eziokwu' n'ụlọ ọgbakọ ha dị na Nkpor, Anambra steeti n'ụtụtụ taa bụ Ụka,nwụchiela onye ndu otu.

Ndị bu egbe yi akwa nwere akara ndị uweojii wakporo ogige ofufe a dị n' Amafo Town Hall Nkpor, dịka ofufe na-an'ihu nwuchie Mathias Ejiofor bụ onye ha kpụrụ n'ụgbọala gawa ebe a mabeghị.

Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ndị ahụ e chere bụ ndị uweojii bu egbe ji ụgbọala Siena abụọ na otu Toyota Camry wakporo ụlọokpukperechi ahụ n'ebe Elekere asatọ nke ụtụtụ n'ike nakwa ebube.

O doghị anya ihe mere e ji kpụrụ ya dịka ndị uweojii steeti ahụ kwuru na ha amaghị maka nnwuchi ya.

Oge BBC kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambara steeti bụ Tochukwu Ikenga n'ekwentị, o kwuru BBC na ọ nụbeghị maka ya bụ ihe dapụtara ma kwuo ka e nye ya ohere ka ọ jụọ ese.

Omenala bụ Uzọ Eziokwu

Ebe foto si, Screengrab

Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri ka obere ọgbaghara dapụtara dịka ndị bu egbe yi akwa yiri nke ndịuweojii wakporo ogige ofufe ndị Omenala bụ Ụzọ Eziokwu.

Ha na ndị okpukerechi omenala zọrọ Ezeaku dịka ha na-ana ndị ahụ bu egbe akwụkwọ gosiri na e nyere iwu ha bịa kpụta ya onye ndu ha.

Ndị ahụ bu egbe malitere ịgbali egbe elu, mgbọ tụọ otu onye bịara ọgbakọ ahụ.

Ka ọ dị ugbua, e bugala nwaamadi a gbara egbe ụlọọgwụ a mabeghị aha ya, ebe ndị okpukperechi omenala na-ama imi n'ala ịmata ebe a kpụgara onye ndu ha.

Onye bụdị Mathias Ezeaku Ejiofor?

Mathais Ezeaku

Ebe foto si, Mathias Ezeaku

Mathias Ejiofor bụ ojiegoachụego ma bụrụ onye ndu otu okpukperechi omeala kpọrọ onwe ha"Omenala bụ Ụzọ Eziokwu".

Onye Enugwu steeti, Ezeaku bụ onye a mụrụ n'ụka Katolik tupu , ọ laghachi n'ụka ọdịnala na ndị otu ya nwere nkwenye na ndị Igbo kwenyere na Chukwu tupu ndịọcha eweta okpukpwere ụka Kraisti.

Ezeaku bụkwa onye nwe otu abụghị nke gọọmentị na-enyere ndị uwe na-atụ n'ọnụ aka a kpọrọ "Igbo Love Themselves".