Okpukperechi mmadụ o kwesịrị ibute okwu na ndọrọndọrọ ọchịchị?
Okwu gbasara okpukperechi na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa gbaliri elu ọzọ dịka Bola Tinubu, bụ onye na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na pati 'All progressives Congress' kpọpụtara Kashim Shettima dịka osote ya.
Tinubu na Shettima bụ ndị okpukperechi Islam, nke mere ka ọtụtụ mmadụ na-akatọ APC.
Naịjirịa bụ mba e ji okpukperechi dị icheiche mara, mana abụọ kacha ibe ha bụ okpukperechi Kraịst na nke Islam.
Mana gịnị kpatara okwu okpukperechi ji bụrụ nnukwu ihe na ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa.
Mana gịnị mere okpukperechi ji dị mkpa na ndọrọndọrọ ọchịchị?

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ mba ndị mepere emepe n'ụwa anaghị etinye uche n'okwu gbasara okpukperechi n'oge ndọrọndọrọ ọchịchị.
Iji maa atụ, Sadiq Khan, onye na-achị London, bụ isi obodo mba England, bụ onye Islam, n'agbanyeghị na England bụ obodo e ji okpukperechi Kraịst mara.
BBC kpọtụrụ Mazi Onwuasoanya FCC Jones, onye ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama nọ na pati APC.
"Mmepe Naịjirịa erubeghị ka nke London na mba ofesi ndị ọzọ," FCC Jones kwuru.
"Ọ dị mkpa ka ọchịchị ọbụla gosipụta nnabata okpukperechi dị icheiche."
"Ịhọrọ mmadụ abụọ si n'otu okpukperechi dịka onyeisiala na osote ya, egosighị nnabata okpukperechi nke ọzọ."
"Ọ pụtara na enweghị onye tozuru etozu n'okpukperechi Kraịst?"

Murtala Chukwuemeka, n'okwu nke ya, kọwara na okpukperechi dị mkpa n'ọchịchị obodo, ọ kachasị obodo dịka Naịjirịa.
Chukwuemeka bụ onye nkuzi n'okpukperechi Islam.
O kwuru sị: "Okpukperechi na-eduzi ndị mmadụ n'usoro dị mma iji kpaa agwa n'ihe niile."
"Mana ihe ka mkpa n'ọchịchị bụ ịhọpụta onye nwere mmụọ eziokwu na ịkwụba aka ọtọ, ma ọ bụ okpukperechi Kraịst ma ọ bụ nke Islam."
Ihe ndị mmadụ kwuru banyere nke a?

Ebe foto si, Getty Images

Ebe foto si, Screengrab

Ebe foto si, Screengrab

Ebe foto si, Screengrab
Otu ngụkọ e mere na 2018 gosiri na pasentị iri anọ na itoolu (49.3%) ndị bi na Naịjirịa bụ ndị okpukperechi Kraịst, ebe pasentị iri anọ na asatọ na ụma (48.8%) bụ ndị Islam.
Pasentị abụọ na ụma ndị ọzọ bụ ndị kwenyere n'okpukperechi ndị ọzọ dịka ofufe ọdịnala, Judaism, na ndị ọzọ.










