Ọ bụ ọzụzụ a zụrụ m dịka nwaanyị mere m ji bụrụ ezigbo osite - White Money

Aha onyonyo, Ọ bụ ọzụzụ a zụrụ m dịka nwaanyị mere m ji bụrụ ezigbo osite - White Money
Ọ bụ ọzụzụ a zụrụ m dịka nwaanyị mere m ji bụrụ ezigbo osite - White Money
    • Onye dere ya, Kelechi Anozia
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist

Onye a ma ama na-eme ihe nkiri, na-eti egwu ma bụrụkwa otu onye n’emume Big Brother Naija bụ Hazel Oyeze Onou e ji White Money maara akọwaala ihe mere o jiri maara nri esi.

Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, o kwuru na ọ mụtara ka e si esi nri site n’ọzụzụ e nyere ya mgbe ọ dị na nwata, na a zụrụ ya ọfụma ka e si azụ nwaanyị.

N’ihi nke a na ọ bụ mere o jiri maara etu e si esi nri, aza ụlọ, ehicha ụlọ nakwa idosa ebe obibi ọcha.

“O nweghi ihe nwaanyị maọbụ nwoke ọbụla ga-eji emere m nganga ma a bịa n’ọrụ imeụlọ.”

White Money

White gara n’ihu kwuo na ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị mmadụ na-akatọ ya n’itiegwu kama na ọ bụghị ya ga-eme ka ọ kwụsị iti egwu maka na ọ bụ onyinye Chineke nyere ya.

“Ọ bụ eziokwu na enweghi m olu e ji eti egwu dịka ‘R. Kelly’ maọbụ ‘West Life’ mana enwere ozi m na-ezi n’ime egwu m na-eti.”

Nwamadị a sara ndị na-ekwu na ọ hụghị ụmụnwaanyị n’anya ma sị na ihe ụmụnwaanyị na-amasị ya ebe ọ dị ukwuu, na ọ bụ ya mere o jiri tie egwu banyere ndị nne.

O kwuru na mbọ niile ọtụtụ ụmụnwoke na-agba bụ maka ụmụnwaanyị, na kedụ ihe mere ọ gaghị enwe mmasị n’ebe nwaanyị nọ.

White Money dụrụ ndị mmadụ ndụmọdụ ka ha ghara ige ntị n’ihe ndị mmadụ na-ekwu ma lekwasị anya n’ihe ahụ dịịrị ha.

Kirie ihe o kwuru n’uju ebe a;