Whitemoney bbn biography: Ihe mere ndị mmadụ ejighị ya egwu egwu

Whitemoney

Ebe foto si, Whitemoney/Intsagram

Hazel Oyeze Onou e ji "Whitemoney" mara bụ otu onye ndị na-ekiri emume 'Big Brother Naija' nke 2021 na-akpụkarị n'ọnụ.

Ka ọ kwụ ugbua, a sị ka a tụọ vootu, Whitemoney so na ndị nwere ike turu ugo na ya bụ asọmpi.

Nke a mere dịka Pere na Maria kpọrọ aha Whitemoney n'ime ndị a ga-ewepu n'ụlọ Big Brother, ndi mmadụ kwuru na o nweghị ebe ọ na-aga.

Mana, ọ gịnị mere nwa amadi a ji bụrụ onye ndị mmadụ hụrụ n'anya ọfụma ọfụma?

Ọ dị ụzọ ihe ise e nwere ike sị na ọ bụ ha kpatara ọnọdụ a.

Ha gụnyere:

1: E ji omume ya eme ihe akaja na soshal midia

E nwere ihe ndị agba ọhụrụ na-akpọ "meme" nke pụtara ihe na-ada ebube nwere ike mee ka ndị mmadụ chịa ọchị maọbụ maa ọsụ.

Ndị agba ọhụrụ na-ekwu na Whitemoney dị "memeable", nke pụtara na ha nwere ike jiri ya mee foto akpamọchị nke Bekee kpọrọ, "meme".

2: Ọ na-akpa ọchị

Whitemoney na-akpa ọchị ọfụma, nke mere ka ọtụtụ mmadụ jiri ya n'anya.

Ebe ọbụla ọ nọ, ndị mmadụ ga na-achị ọchị maka ụdịrị agwa ọ na-akpa nakwa ihe ndị ọ na-ekwu.

3: Ndị mmadụ na-ahụ onwe ha n'ime ya

Whitemoney bụ onye ndị mmadụ na-ahụkarị onwe ha n'ime ya.

Nke bụ ọkachasị, ebe o siri metụta, ije ụwa ya na ihe banyere ọrụ maọbụ ịchụ nta ego.

4: Ọ dị 'igbotic'

Whitemoney anaghị ezo agbụrụ o si pụta. Ma etu o si ekwu okwu, ma eto o si erubere ndị mmadu isi, ruo etu o si akpa agwa, Whitemoney dị nnọọ ihe ndị mmadụ na-akpọ "igbotic."

Nke a mere ka ndị mmadu hụ ya n'anya ọfụma, ọtụtụ na-akpọ ya "Mazị" n'ihi nke a.

5: Ọ ma esekwu ọkụ

Whitemoney

Ebe foto si, Whitemoney

Nkọwa foto, Whitemoney bụ eze esekwu na Big Brother

Kemgbe ha batara n'ụlọ Big Brother Naija, ọ bụ Whitemoney were ọnọdụ n'ime usekwu ma bụrụ onye na-esiputa nri dị iche iche.

Ugbua, Pere bụ onyeisi ụlọ Big Brother chụpụrụ ya n'usekwu, mana ndị ọzọ ka na-achọkwa ka o siere ha nri, ma ya bụrụgodu n'ime abalị.

6: Ọ ma achọ mma

Whitemoney

Ebe foto si, Whitemoney/Instagram

Whitemoney nwere ọtụtụ ihe ọ na-eme ọfụma, mana ịchọ mma sokwa bụrụ nke kachasị dị ire.

Ị hụ Whitemoney, ị hụ mma nwoke. Site n'isi ya ebe o jiri agwa ọcha tee na ntutu ya, ruo n'ụkwụ ya, Whitemoney na-akpachara anya achọ onwe ya mma ọfụma.

7: Ọ gbanarịrị nchụpụ n'ụlọ Big Brother

Dịka anyị kwuru mbụ, Pere na Maria wepụtere aha Whitemoney ka a chụo ya n'ụlọ 'Big Brother' mana kama nke ahụ ga-enye ya nsogbu, o nyere ya aka dịka ọtụtụ mmadu gbatara ya ọsọ enyemaka.

Ugbua, ọtụtụ ndị a ma ama kwụnyere Whitemoney n'azụ.

Ịhụnanya a hụrụ Whitemoney amaghị agbụrụ, ihe ya na-amasị ndị si mpaghara dị iche iche na Naijiria na mba ndị ọzọ.

Ọbụladị ndị a ma ama na Naijiria gụnyere Tunde Ednut nakwa Funke Akindele nwere mmasị nwa afọ ahụ.