Big Brother Naija 2021: Maria, Princess na ụmụasa Big Brother ndị ọzọ na-amụke ka ọnwa

Ebe foto si, Big Bro Naija/Instagram
Emume Big Brother Naija nke afọ 2021 malitere n'abalị Satọdee, ụbọchị iri abụọ na anọ nke, oge a kpọpụtara ụmụnwoke iri na otu ga-eso na ya bụ egwuregwu.
N'ụbọchị Sọnde ka a kpọpụtara ụmụnwaanyị iri na otu ga-esokwa na egwuregwu ahụ.
Nke a mere ya mmadụ iri abụọ na abụo nọ n'ime ụlọ ahụ nke mmadụ anọ n'ime ha bụ ndị Igbo
Aha ụmụ nwaanyị abụọ banyere ụlọ ahụ n'ụbọchị Sọnde bụ Princess Francis na Maria Chike Agueze.
Lee ụmụnwaanyị niile so n'emume BBNaija 2021
Maria

Ebe foto si, Big Bro Naija/Instagram
Maria Chike Agueze bụ onye na-ere ụlọ na ala nakwa onye na-arụbu ọrụ nleta n'ụgbọelu.
Ọrụ ahụ ebugala ya mba niile dị n'ụwa ma ewepu 'Antarctica'.
O kwuru na ịgba egwu, ịs nri, ịme ihe ejije nakwa imegharị ahụ na-amasị ya nke ukwu.
Ọ kọwara onwe ya dịka "ịhụnanya ghọrọ mmadụ".
Princess

Ebe foto si, Big Bro Naija/Instagram
Princess Francis bụ ọkwọ ụgbọala bi n'Abuja ma sikwa n'Imo steeti.
O kwuru na ihe kachasị wute ya na ndụ ya bụ mgbe ọ nụrụ na nna ya anwụọla.
O kwuru na ọ bụkwa onye na-eme 'drama' mgbe niile nke o si n'aka nne ya mụta.
Jackie

Ebe foto si, BBNaija
Jackie Bent bụ onye na-ahazi agbamakwụkwọ nakwa mmemme ndị ọzọ, bekee na-akpọ nke a 'events planner'.
O nwere otu nwa bụ nke ọ mụrụ mgbe ọ gara mba Briten ịgụ akwụkwọ.
Angel

Ebe foto si, BBNaija
Angel Smith bụ onye Akwa Ibom steeti kwuru na ịkọ akụkọ na-amasị ya.
Ọ bụkwa ọma mbem kwenyere na ọ dị mkpa ịrahụ ụra.
Liquorose

Ebe foto si, BBNaija
Ezigbo aha ya bụ Roseline Omokhoa Afije.
Ọ bụ ọgbaegwu a ma ama.
O kwuru na ime ka nwoke na-amasị ya nakwa na ọ bụ onye na-eme ejije.
Ịme njem na-amasị kwa ya dịka o si kwuo.
Beatrice

Ebe foto si, BBNaija
Beatrice Agba Nwaji bụ onye na-eji ahụ ya egosi akwa gụrụ akwụkwọ na Mahadum Pọtakọt.
Ọ kọwara na o nwereike ịme ọtụtụ ihe gụnyere ịgụ egwu, ịgba egwu, ịkpa isi nakwa ịgba bọọlụ na-amụghị ya amụ.
N'anya nke ya, ọ bụ aja pụrụiche ka Chineke jiri kee ya.
Peace

Ebe foto si, BBNaija
Peace Ogor bụ onye ji ego achụ ego dị afọ iri abụọ na isii si Potakọt.
O kwuru na ọ na-amasị ya iso ezinaụlọ ya nwee ezumike ma nweta onwe ya.
Saskay

Ebe foto si, BBNaija
Tsakute Jonah bụ onye ịgụ akwụkwọ na-amasị. Egwu dị icheiche na-amasị kwa ya.
Ọ dị afọ iri abụọ na-abụọ ma kwuo na o nwere mgbe achụpụrụ ya n'ụlọakwụkwọ sekọndrị n'afọ 2015.
Nini

Ebe foto si, BBNaija
Nini bụ Anita Singh amụrụ ma zụọ ya na Naịjirịa kemgbe afọ iri abụọ na asaa.
O nwere umunne anọ o kwuru na-enye nkwado mgbe niile.
Isee foto na-amasị ya.
Arinola Olowoporoku

Ebe foto si, BBNaija
Ọ bụ onye na-emepụta akwa toro na Legọs.
O dị afọ iri abụọ na itoolu ma kwuo na ọ na-amasị ya iyi ọla n'ebe niile n'ihu ya.
Tega

Ebe foto si, BBNaija
Tega Dominic bụ nwa ada si Cross River steeti
O kwuru na o teela aka ọ na-agbalị ịbanye ụlọ Big Brother tupu ahọpụta ya nke afọ.
Ọ na-amasị ya ma mmadụ bụrụ onwe ya mgbe niile.









