Big Brother Naija 2020: Onye ga-emeri n'afọ a?

Ndị meriri Big Brother Naija

Ebe foto si, Instagram/Katung,Efe,Miracle,Mercy

Ajụjụ ọtụtụ ndị na-eso emume a na-eme n'ihe onyonyo bụ nke a kpọrọ Big Brother Naija Lockdown na-ajụ bụ "onye ga-emeri nke afọ 2020"?

Dịka a banyerela izu abụọ n'ime izu iri ha ga-anọ n'ime ụlọ Big Brother, ndị na-elele ya bụ emume enweela ndị ha na-akwado nakwa ndị ha achọghị iji anya ahụ.

Ị chọọ Big Brother Naija Season 5 n'elu ịntanetị ugbua, a ga-agụta ihe ruru mmadụ asatọ maọbụ karịa bụ ndị a na-akpụkarị aha ha n'ọnụ n'ime mmadụ 20 nọ ya n'afọ a.

Ndị a gụnyere Nengi, Laycon, Ozo, Dorathy, Erica, Kiddwaya, Prince, Wathoni, Ka3na, wdgz.

Ọtụtụ ndị Big Brother na-amasị ekwuola na onye ga-emecha merie nke afọ a ga-esi n'ime mmadụ asatọ a pụta, ma ọ bụrụ na ihe niile gaa n'anya ya.

Mana kedụ etu ndị meriri n'afọ ndị gara aga si merie?

A bịa n'ihe gbasara emume a, ọ bụ iwu na ọ bụ ndị na-ewu ewu na-emeri?

N'afọ ndị gara aga, ọ bụ ndị kacha masị ndị na-elele ya n'onyonyo ha na-ekpebikarị (site n'ịtụnyere ha vootu) onye ga-emeri.

N'ime Katung, Efe, Miracle, na Mercy meriri nke afọ ndị gara aga, ọ bụghị ha niile malitere n'izu nke mbụ ha nọ n'ime ụlọ wuwe ewu.

Ndị dị ka Katung na Miracle mechara chakee dịka ụbọchị nọ na-aga, nke bụ na e nwekwara ike ọ gaghị abụ ndị nke na-ewu ugbua n'ụlọ Big Brother nke afọ 2020 ga-emecha merie.

Mana nke afọ a, ọ bụ ndị na-elele tụnyechaa vootu, ndị nọ n'ime ụlọ Big Brother esi n'ime mmadụ anọ ndị otu ha vootu ha kacha pee mpe họrọ ndị ga-ala.

Ndị ọbụla ndị otu ha kacha họrọ dịka onye ha chọrọ ka ọ laa, ka a ga-achụpụ n'ụlọ.

Akara ntụ-ntụ

Ndị meriri na mgbe ha meriri

Katung Aduwak:

Katung

Ebe foto si, Instagram/Katung

Nkọwa foto, Katung meriri n'afọ Ebuka Obi-Uchendu bụ onye na-achịkọta Big Brother Naija ugbua, sonyere na ya

O meriri Big Brother Nigeria nke e mere n'afọ 2006 (nke mbụ a na-eme na Naịjirịa).

Katung esoghidi ibe ya bata n'ụlọ n'isi mbido; o so na ndị batara ka a chụpụcharalarị mmadụ abụọ, mgbe izu atọ ya bụ emume malitere.

Efe 'Efemoney' Ejeba

Efe

Ebe foto si, Instagram/Efemoney

Efe meriri Big Brother Naija nke a kpọrọ See Gobbe, nke e mere n'afọ 2017.

Efe pụtara n'ọgbọ ebe a họpụtara ndị a ga-atụ vootu iji zọpụta, ugboro ise.

Miracle 'Flyboy' Ikechukwu Igbokwe

Miracle Ikechukwu

Ebe foto si, Instagram/MiracleIkechukwu

Ikechukwu meriri Big Brother nke e mere n'afọ 2018, nke a kpọrọ Double Wahala.

Miracle kpara ike site n'imeri ọtụtụ egwuregwu na asọmpi ndị ha mere n'ụlọ ahụ, ndị gụnyere Payporte Arena Games, Final Wager nakwa Pepsi Refresh Your Mix.

Ya na otu nwaanyị nọkwa n'ime ụlọ kwara iko ka ha ka nọ n'ime ụlọ, mana nke ahụ egbochighi ya imeri.

Mercy 'Lamborghini' Eke

Mercy

Ebe foto si, Instagram/Mercy

Eke meriri Big Brother nke e mere n'afọ 2019, nke a kpọrọ Pepper Dem.

Mmeri a mere Mercy na-akpọ onwe ya "queen of highlights" nwaanyị mbụ na-emeri emume a.

Ọ bụghị naanị ịgbabi 'wire' n'egwu ka e ji mara mgbe ahụ, ihe ọzọ e jikwa mara ya bụ na ọ chọtara ịhụnanya ka ọ nọ n'ime ụlọ ahụ.

Akara ntụ-ntụ

Kedụ onye ga-emeri nke afọ a?

Na nke afọ a, kepukepu na-ekwu na ụfọdụ ndị akwaala iko, ọtụtụ amịala ọnụ, mana ọ ga-enyere ha aka ka ọ ga-egbochi ha imeri?

Kedụ onye i che ga-emeri nke afọ a? Gịnị ka ị chere mere ọ ga-eji merie?