Maria Chike BBNaija interview: Ihe nwa ada a kwuru maka Liquorose, Whitemoney na Pere

Aha onyonyo, Maria Chike Benjamin

Maria so na ndị ọtụtụ mmadụ kacha hụ n'anya n'egwuregwu Big Brother Naija nke afọ a tupu e mechaa nye ya ọsọ.

Nwaada a bụ onye Ubaa Emii dị na Owere-North bụ elelewe ejeghị ọrụ, mma ya na-aba n'isi.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, o kwuru na ọ gaara amasị ya ma ọ bụrụ na ọ nọruru na ngwụcha egwuregwu BBNaija.

Oge anyị jụrụ ya mgbe ọ ga-alụ di, o kwuru sị: "Achọrọ m ịgba akwụkwọ mana amaghị m ma achọrọ m ịlụ di."

Gịnị ka nke a pụtara? Were ntị gị gere ya.

Ndị mere akụkọ a bụ Chimezie Ucheagbo na Nnamdi Agbanelo.