Emume Okorosha ndị Ụmụnweke Amaụlụ Mbieri dị n'Imo Steeti
Ihe a ị na-ekiri ugbua bụ okorosha ndị obodo ụmụnweke Amaụlụ Mbieri dị n'okpuru ọchịchị Mbaitoli n'Imo Steeti.
Okorosha bụ otu n'ime otu nzuzo dị iche iche e nwere n'omenala Igbo, dịka e siri nwee mmọnwụ, ọkọnkọ, ékpè na ndị ọzọ.
Ọ bụ naanị ụmụnwoke na-eti ma na-agbakwa Okorosha n'Ụmụnweke, mana e nwere ụfọdụ ụmụnwaanyị pụrụiche a na-echi echichi dịka nne Okorosha.
N'ime afọ abụọ ọbụla, umuokoroọbịa ọbara ndụ jụrụ ahụ na-agba Okorosha iji mee ndị mmadụ obi aṅụrị n'oge Ekeresimesi nakwa afọ ọhụrụ.
Okorosha Ụmụnweke anaghị apụta n'ọgbọ oge niile e wezuga ma o nwere emume pụrụiche a na-eme dịka iri iji na echimechi dị iche iche.
Ụfọdụ mgbe, ha na-agakwa emume ndị pụrụiche ma a kpọọ ha oku.
Ndị Ụmụnweke anaghị eji Okorosha ha ama aka ọgwụ, maọbụ kpaa ike ọjọọ n'obodo, kama ha na-eji ya akpa ndị mmadụ obiụtọ.
Ọtụtụ ndị njem nlegharịanya na-ejuputa n'obodo Ụmụnweke n'oge Ekeresimesi na afọ ọhụrụ iji kirie Okorosha.
Ma nwoke ma nwaanyị, okenye na nwata, ndị obodo na ndị mbịarambịa tinyekwara ụmụnwaanyị dị ime na-ekiri Okorosha ndị Ụmụnweke n'ihi na e jighị ọgwụ eti ya, kama, otu nsọ gbara ọkpụrụkpụ o nwere bụ na nwaanyị anaghị abanye n'akwụ ya tinyekwara nwoke ọbụla na-esoghị n'otu Okorosha.
Akwụ Okorosha bụ ebe Okorosha si apụta, ọ bụ ebe o ji mere ụlọ obibi.



