Ihe anyị ma gbasara ụgbọala gbara ọkụ n'Enugwu steeti
Ihe anyị ma gbasara ụgbọala gbara ọkụ n'Enugwu steeti

N'ụbọchị ọle na ọle gara aga, ihe oyonyoo malitere na-efegharị n'ịntanetị nke gosiri ebe ụgbọala mmadụ gbara ọkụ.
Akụkọ ahụ kwuru n'ihe ọdachi a mere n'okpuru akwammiri dị n'okporoụzọ na-aga n'ọdụụgbọelu Enugwu Steeti, mgbe onye nọ n'ime ụgbọala ahụ si Enugwu alọghachi Abuja.
BBC News Igbo chọpụtara site n'ọnụ onye akaebe nọ mgbe ihe a mere na o mere oge mgbede ụbọchị Wenezdee abalị asaa nke ọnwa Jenụwarị.
Nwaanyị ahụ na-achọghị ka akpọ aha ya kwuru na ndị mmadụ nọ na-agafe bịara nyere ndị nwere ọdachi ahụ aka mana mbọ niile ha gbara bụ n'efụ.
N'agbanyeghị na ụgbọala ahụ rere ọkụ, ndị mmadụ nọ ya n'ime anwụghị.
Ka ha pụtara, ndị ọrụ ichekwa ụzọ 'road safety' mechara bịa meyụọ ọkụ ahụ.




