Etu ọkụ siri gbaa n'ogige ngwaahịa Nigerian Breweries, Aba
Nnukwu ọdachi mere n'Aba n'ụbọchị Tọzde 9 Eprel 2026 dịka nnukwu ọkụ tiwapụrụ n'ogige ụlọọrụ mmanya Nigeria Breweries na-echekwa ngwaahịa ha.
E kwuru na ọkụ a fesara ma repịa puku kwuru puku ihe e ji achịkọ karama mmanya bụ crate.
Ndị hụrụ oge ọkụ ahụ na-agba kwuru na ọ bụ na mberede ka ọkụ ahụ tiwapụrụ ma fesaa n'ime nkeji ole na ole.
Ha kwuru na otu ihe ha maara mere ọkụ ahụ jiri mụbaa nke ukwuu bụ ọtụtụ ihe e ji achịkọ mmanya bụ crate, e chekwara n'ogige ahụ.
Ogogo ọkụ ahụ gbajiri aka ndị mgbanyụọkụ buuru ụzọ rute n'ogige ahụ, bụ nke mere ha jiri kpọọ oku enyemaka ozugbo.
Ka e mesịrị, otu ndị mgbanyụọkụ ọzọ zọchiri ma nyeere ndị nke nọ anọ aka ịgbanyụ ọkụ ahụ, ma gbochie ya ifesa n'ụlọ ndị nọ n'akụkụ ebe ahụ.
Ọ bụ eziokwu na ọkụ ọgbụgba ahụ mebiri ọtụtụ ngwongwo na akwụkwọ ndekọ, enweghị onye e kwuru merụrụ ahụ maọbụ nwụọ site n'ọdachi ahụ.
Ka ọ dị, ndị ọrụ gbatagbata ka nọkwa n'ogige ahụ na-akụnyụ ọkụ ndị fọrọ afọ, iji hụ na ọ maliteghị ọzọ.



