Etu ọkụ siri gbaa n'ogige ngwaahịa Nigerian Breweries, Aba

Aha onyonyo, Etu ọkụ siri gbaa n'ogige ngwaahịa Nigerian Breweries, Aba
Etu ọkụ siri gbaa n'ogige ngwaahịa Nigerian Breweries, Aba

Nnukwu ọdachi mere n'Aba n'ụbọchị Tọzde 9 Eprel 2026 dịka nnukwu ọkụ tiwapụrụ n'ogige ụlọọrụ mmanya Nigeria Breweries na-echekwa ngwaahịa ha.

E kwuru na ọkụ a fesara ma repịa puku kwuru puku ihe e ji achịkọ karama mmanya bụ crate.

Ndị hụrụ oge ọkụ ahụ na-agba kwuru na ọ bụ na mberede ka ọkụ ahụ tiwapụrụ ma fesaa n'ime nkeji ole na ole.

Ha kwuru na otu ihe ha maara mere ọkụ ahụ jiri mụbaa nke ukwuu bụ ọtụtụ ihe e ji achịkọ mmanya bụ crate, e chekwara n'ogige ahụ.

Ogogo ọkụ ahụ gbajiri aka ndị mgbanyụọkụ buuru ụzọ rute n'ogige ahụ, bụ nke mere ha jiri kpọọ oku enyemaka ozugbo.

Ka e mesịrị, otu ndị mgbanyụọkụ ọzọ zọchiri ma nyeere ndị nke nọ anọ aka ịgbanyụ ọkụ ahụ, ma gbochie ya ifesa n'ụlọ ndị nọ n'akụkụ ebe ahụ.

Ọ bụ eziokwu na ọkụ ọgbụgba ahụ mebiri ọtụtụ ngwongwo na akwụkwọ ndekọ, enweghị onye e kwuru merụrụ ahụ maọbụ nwụọ site n'ọdachi ahụ.

Ka ọ dị, ndị ọrụ gbatagbata ka nọkwa n'ogige ahụ na-akụnyụ ọkụ ndị fọrọ afọ, iji hụ na ọ maliteghị ọzọ.