Kedụ ihe dị na nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ Amerịka na Ịran?
Iran na US ekwetala ịkwụsị ọgbaghara ha n'izu abụọ, nke a ga-eme ka a hapụ ụgbọ njem ụgbọ mmiri ime njem ọwara kpọrọ Strait of Hormuz.
Nke a na-abịa ka otu ọnwa gachara ka Amerịka na mba Israel malitere mwakpo a na-ahazi na Iran, kamgbe Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump yiri ha egwu "m ga-agbari ihe ọgbara ọhụrụ" ma ọ bụrụ na Iran emegheghị Strait of Hormuz.
Onyeisiala Pakistan Shehbaz Sharif, onye na-eme mkparịta ụka, kwuru n'isi ụtụtụ Wednesde na nkwụsị ahụ dị irè ozugbo.
Trump kwuru na ya ekwetala "ịkwụsịtụ ịtụ ogbunigwe na ịwakpo Iran ruo izu abụọ" ma ọ bụrụ na Tehran ga-ekweta ịmepeghachi Strait of Hormuz, ụzọ ụgbọ mmiri dị mkpa maka ire mmanụ na mbupụ na ngwa ahịa ndị ọzọ sitere na mpaghara Gulf.
Iran ekwetala na nkwekọrịta a, ma wepụta atụmatụ iri gụnyere ịkwụsị kpamkpam agha dị n'Iran, Iraq, Lebanon na Yemen nakwa "ịkwụzu ụgwọ" niile e ji arụzịgharị mba Iran.
Ozi ahụ kwukwara na "Iran aghaghị agbambọ inweta ngwa agha nuklia ọzọ."
N'aka nke ọzọ Praịm Minista mba Izrelụ bụ Benjamin Netanyahu kwuru, sị: "Izrel na-akwado mkpebi Onyeisiala Trump ịkwụsịtụ ọgụ megide Iran ruo izu abụọ ..."
Ozi ahụ gbakwụnyere na "nkwụsị ahụ agụnyeghị Lebanon", bụ ebe Israel nwere ndị agha ala.



