Admission Racketeering: Mahadum UNN asaala Senator Nwaebonyi

Ebe foto si, BBC
Mahadum UNN asaala sinatọ Nwaebonyi si na ebubo “Admission Racketeering” oboro ha na sinate bụ okpotokpo asị
Onye isi ụlọ akwụkwọ mahadum University of Nigeria Nsukka bụ ọkammụta Charles Igwe agbarụọla ihu kwuo na ụlọ akwụkwọ UNN anaghị ere “admission” ma ọ bụ tinye aka ịnapụ nwata akwụkwọ ọbụla orubere ya.
Okwu a pụtara dịka sinatọ si Ebonyi steeti bụ Onyekachi Nwebonyi butara mkpesa na ụlọ omeiwu nnukwu bu sinati wee kwuo ma UNN na-eme mpụ na aghụghọ n’inye oher akpọrọ admission n’ụlọ akwụkwọ ahụ.
Sinatọ Nwebonyi nyere ọmumatụ kwuo na otu nwata nwaanyị Ekwe Princess Chinyere si Ebonyi steeti nwetara akara Jamb ruru ogo ịgụ akwụkwọ Medicine and surgery na UNN, mana ha napụrụ ya oher ahụ si ya gaa gụba Labouratory Science ma were ohere nwata ahụ nye ndị ọzọ.
Ebubo a mere ndị Jamb jiri guzobe kọmittee maka inyocha UNN na ka ha si eme nnabata ụmụ akwụkwọ.
BBC na Vice chancellor bụ Prof Charles Igwe nwere mkparitaụka ebe ọ nọrọ kọwaa na ezi okwu adịghị n’ihe Nwebonyi kwuru.

Ebe foto si, Nwebonyi Onyekachi/Facebook
Ọkammụta Charles Igwe kọwaara anyi na afọ 2019 ka nwata nwaanyị ahụ nwetara 291 nke mere na enyeghi ya ohere ịgụ medicine and surgery. Ụlọ akwụkwọ ahụ nyere ya ndị ọzọ ometutara Lab science ma cọọsụ ndị ọzọ ka ha gụbazịa.
Ya bụ nwata mechara dee akwụkwọ “change of course” mezuo usoro ya niile ma bidozia ya bụ medicine and Surgery.
Ka ọ dị ugbua Ekwe Princess Chinyere nọ n’afọ nke atọ na ngalaba Medicine and Surgery nke University of Nigeria Nsukka.
Prof Igwe kwuru na ọ bụ ihe nwute na Sinatọ Nwebonyi emeghị ezi nchọpụta tupu o boo UNN ebubo.
O kwuru na UNN bụ ụlọ akwụkwọ na akwụba aka ya ọtọ n’ihe ọbụla gbasara ịnabata ụmụ akwụkwọ ọkachasị na ka mgbe afọ anọ ọbatara n’ọkwa dịka Vice Chancellor.
Anyi akpọọla Sinato Nwaebonyi n’ekwe ntị ya, ma zigara ua ozi mana ọzaghị.










