ASUU strike update: A sị anyị kwụọ ụgwọ ụlọ afọ abụọ - Nwa akwụkwọ Unizik

Unizik

Ebe foto si, Unizik/Facebook

Ụmụ akwụkwọ na Mahadum Nnamdi Azikiwe na-eti mkpu gbasara etu e si tinyere ha ego n'ụgwọ ụlọ, bịakwa na-amanye ha ka ha kwụọ ụgwọ afọ abụọ.

Nke a na-abịa dịka otu jịkọrọ ndị nkuzi mahadum bụ Academic Staff Union of Universities bụ ASUU n'ịchafụ kwụsịrị abụbụọrụ ọnwa asatọ ha bidoro gbawa kamgbe ọnwa Febuwarị afọ 2022.

Agụmakwụkwọ amalitela n'ụfodụ mahadum kama ọtụtụ ụmụ akwụkwọ na ndị nkuzi mahadum na-ekwu ọ bụghị etu ihe dị mgbe ha bidoro abụbọ ka ọ ka dị ugbua.

BBC garuru ụfọdụ ụlo akwụịkwọ ndị a ka ha mara ihe gbanwere n'ụlọ akwụkwọ mahadum kamgbe ọnwa asatọ.

Ọnọdụ Mahadum Nnamdi Azikiwe University, Ọka

Otu nwata akwụkwọ nke Nnamdi Azikiwe University BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ kọwara ọnọdụ ụlọ akwụkwọ ha nọ na ya dịka ha otu ASUU kwụsịrị abụbọ ọrụ ha.

O kwuru sị, " Anyị bidoro ịmụ ihe n'ụbọchị ASUU nyere iwu ka ebido agụmakwụkwọ na Mahadum".

"Kama e nwere ụfọdụ ihe nwata akwụkwọ hụtara mgbe ọ lọghachịrị nke mere ka obi daa ya mba. Nke mbụ bụ:

Ụgwọ ụlọ ha -

Nwata akwụkwọ ahụ kwuru sị, "Onye nwe ụlọ anyị bi na ya gbachiri ọnụ ụzo ụlọ anyị ma bulie ụgwọ ụlọ anyị na-akwụ.

"Ọ sị anyị kwụọ ya ụgwọ ụlọ afọ abụọ n'ihi na ọ maghị ma ndị ASUU a ga-agba abụbụọrụ ọzọ n'afọ na-abịa".

Akwụkwọ ozi onye nwe ụlọ degaara ụmụakwụkwọ ni n'ụlọ ya

Ebe foto si, OTHER

Nkọwa foto, Akwụkwọ ozi onye nwe ụlọ degaara ụmụakwụkwọ ni n'ụlọ ya

Nwata akwụkwọ si na e bulikwara ụgwọ ụlọ ha site na puku naịra iri asaa ruo otu nari puku naịra.

O kwukwara na ụgwọ ọkụ ha ji ndị ụlọọrụ na-enye okụ latrik gbalịrị elu.

Ọ kọwara na onye nwe ụlọ ha bi na ya sị na ya achọghị ịnụ akụkọ ọbụla maka na ihe o kwuru o kwuchaala ya.

Nke a na-eme agbanyeghị na otu jịkọrọ ụmụ akwụkwọ mahadum bụ 'Student Union Government' nke Unizik gwara ụmụakwụkwọ ka ha hapụ ịkwụ ụgwọ ụlọ ugbua ruo mgbe ha na ndị nwe ụlọ ndị a ga-enwe nzụkọ.

Akwụkwọ ozi onye nwe ụlọ degaara ụmụakwụkwọ ni n'ụlọ ya

Ebe foto si, OTHER

Nkọwa foto, Akwụkwọ ozi onye nwe ụlọ degaara ụmụakwụkwọ bi n'ụlọ ya
Akwụkwọ ozi otu jịkorọ umụakwukwọ depụtara maka ego okwu ego ụlọ

Ebe foto si, SUG Unizik

Nkọwa foto, Ọkwa otu jịkorọ ụmụakwukwọ depụtara maka ego nzụkọ gbasara ego ụlọ

Ọnụahịa nri

O kwuru na ihe ha na-azụ nrị ugbua abụghị ihe ha na-azụ ya tupu ebido abụbọ ọrụ.

Ọ kọwara sị, " Andị na-eji N300 azụta nrị ma ugbua, otu efere nrị bụzị N500".

Ọnụ ahịa njem ụgbọala

O kwukwara na nkem ụgboala tinyere N50 n'elu ya ebe ụfọdu ebe ruru N100.