Ekpuru m isi mana ọ napụghị m inweta 'First Class' na mahadum UNN -Chidozie Obianyo

Otu nwata nwoke, Chidozie Obianyo bụ onye kpuru isi mana o ritere nzere mmụta “First Class” site na mahadum 'University of Nigeria Nsukka'(UNN).
Chidozie kọọrọ BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ya kpuru isi, mana nke a mere ya jiri ṅụọ iyi na ya ga-agụsi akwụkwọ ya ike ma gosi na ya na ndị na-ahụ ụzọ nwere ike maa aka.
Nwaamadị ahụ bụ onye kpuru isi site n’ọrịa anya a kpọrọ “glaucoma” kwuru ka onye ọbula nwere ọlụsị chọpụta ebe o nwere ike wee si na ya baara onwe ya uru ma wezuga ịrịọ arịrịọ.









