Mohbad anwụọla tupu e bute ya n'ụlọọgwụ anyị- Perez Medcare Hospital

Mohbad, Prez Medcare Hospital

Ebe foto si, Mohbad/Perez Medcare/Twitter

Ụlọọgwụ ebe a sịbu otiegwu Ilerioluwa Aloba, a ma dịka 'Mohbad' nọrọ tupu ọ nwụọ ekwuola na "e bubatara ya n'ozu".

N'akwụkwọ mgbasaozi ha wepụtara, na Tuzde, ụlọọgwụ, kwuru na Mohad anwụghị n'ụlọọgwụ ha, nke a na-elekọta ya kama e bubatara ya n'ozu.

Mohbad

Ebe foto si, Mohbad/Instagram

Ha kwuru na oge e butere ya ha nyocha ya ma ghụ na ọ nwụọla, na ha jụrụ ndị butere ya ese, were nụta na o nwere nọọsụ na-elekọta ya n'ụlọ bụ onye gbara ya ọgwụ

Ozi ahụ gara n'ihu sị, " Anyị nyere ha ndụmọdụ ka ha buru ya gawa n'ụl;ọọgwụ gọọmentị.

" Mohbad abụghị onye ọrịa anyị na-elekọta nke anyị ji lekọta ya."

Ozi Perez Medcare Hospital

Ebe foto si, Perez Medcare Hospital

Ozi si Perez Hospital

Ebe foto si, Perez Medicare /Twitter

Cheta na Mohbad gbara afọ 27 nwụrụ n'abalị 12 nke ọnwa Septemba, afọ 2023 n'ụlọọgwụ dịka a gbachara ya ọgwụ n'ọnọdụ ahụike edochaghị anya .

Kemgbe ọ nwụrụ, ndọrịtaụka so ọnwụ ya dịka ndị ntorobia mere ngagharịiwe na mpaghara dị iche iche na Naijiria na-akpọ oku ka enyocha etu o siri nwụọ.

Mohbad: Nọọsụ ndị uweojii nwụchiri bụ nọọsụ adigboroja-Otu jikọrọ ndị nọọsụ

Mohbad, nọọsụ

Ebe foto si, Mohbad/Others/Instagram

Otu jikọrọ ndị nọọsụ na Naijiria bụ 'National Association of Nigeria Nurses and Midwives' (NANNM) ekwuola na onye 'nurse' ndịuweojii nwuchiri maka ịgba otiegwu Ilerioluwa Aloba a ma ama dịka 'Mohbad' ọgwụ tupu ọ nwụọ abụghị onye otu ha.

Mohbad gbara afọ 27 nwụrụ n'abalị 12 nke ọnwa Septemba, afọ 2023 n'ụlọọgwụ dịka a gbachara ya ọgwụ n'ọnọdụ ahụike edochaghị anya .

N'ozi mgbasaozi ha nke odeakwụkwọ otu NANN na Legọs steeti bụ Toba Odumosu binyere aka nke rutere BBC Igbo aka, NANM kwuru sị, "Nchọpụta anyị mere gosiri na onye a sị na ndị uweojii nwuchiri maka ilekọta Mohbad abụghị nọọsụ aha ya dị n'akwụkwọ."

Otu ahụ kọwara na onye a ma dịka nọọsụ kwesịrị ịbụ onye gụrụ 'Nursing' afọ ise na mahadum ma nwekwa ọzụzụ n'ihu ọrụ otu afọ maọbụ onye nwetara ọzụzụ na kọleg maka ndị nọọsụ (College/School of Nursing) nwetara ikike n'aka ngalaba 'Nursing and Midwifery Council of Nigeria' (NMCN).

Cheta na ndị uweojii gbaburu ama na ha nwuchiri nọọsụ gbara Mohbad ọgwụ oge e bugara ya ụlọọgwụ tupu ọ nwụọ dịka ha malitere nnyocha ihe butere ọnwụ nwaamadị ahụ.

Mohbad candlelight procession: Ihe mere anyị ji were 'tear-gas'chụsaa ndị gbakọrọ na 'Lekki Toll Gate' ụnyahụ- Ndị uweojii Legọs

Ndị ihe Mohbad na-amasị

Ndị uweojii Legọs steeti akọwala na ihe mere ha ji were anwụrụ ose (teargas) chụsaa ndị na-eme emume ngarị maka ịkwanyere otiegwu Ilerioluwa Alaba a ma dịka 'Mohbad' ugwu ikpeazụ na Legọs bụ n'ihi na ha achọghị ka ihe mere n'oge Endsars afọ atọ gara aga mekwa ọzọ.

Ha kwuru na ihe butere ọgbụgba anwụrụ ose ahụ bụ na e nupuru isi n' iwu ha nyere banyere ọgbakọ ahụ.

N'ụbọchị Tozde, ndị uweojii ji anwụrụ ose chụsaa igwe mmadụ gbakọrọ na Lekii Toll Gate dịka a na-eme emume iji mpanaka gagharịa iji kwanyere nwa amadị ahụ nwụrụ na nsonso a ugwu ikpeazụ ma kpoo oku ka e nye ya ikpenkwụmọtọ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Ndị ntorobia ihe Mohbad na-amasị sitere na Lekki, Legọs gagharịa rue na Muri Okunola Park dị na Victoria Island, Legọs, ebe ụfọdụ ndị otiegwyu dịka Davido, Zlatan na Falz tiri egwu na ncheta Mohbad.

Ndị ihe Mohbad na-amasị
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

N'ozi nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs bụ Benjamin Hundeyin binyere aka ma wepụta ụbọchị Fraide, ndị uweojiio kwuru na ihe ha na ndị haziri mmemme ahụ kpara bụ na ọgbakọ ahụ agaghị agafe Elekere Asatọ nke abalị nakwa na ohere adịghị maka ha ịgbakọ na Lekki Toll Gate.

"Mana na ọ bụ ihe ịrụ afọ ịhụ na oge ọgbakọ ahụ bere n'ogige Muri Okunola dị na Victoria Island, ụfọdụ ndị mmadụ malitere gbakọwa na Lekki Toll Gate."

" Arịrịọ ndị uweojii na ndị haziri ọgbakọ ahu rịọrọ ọtụtụ awa amịtaghị mkpụrụ nke a mere ka ụzọ Lekki kpọchie, ụgbọala anaghị agalikwa."

" Ka igwe mmadụ si agbakọ n'ebe ahụ yitewere mmalite ụdị ihe merela n'ebe ahụ nke nwere ike ibute ọgbaghara.

"Ya mere, iji chekwa ndụ na akụnaụba ndị mmadụ, anyị hara iji usoro agaghị ebute nnukwu mmebi ihe ịchụsaa igwe mmadụ-anwụrụ ose- dịka okwu ọnụ amịtaghị mkpụrụ. A gbaghị otu mkpụrụ kpọwam ma ọlị."

Cheta n'abalị 20 nke ọnwa Oktoba afọ 2020, ndị agha Naijiria wụrụ ndị ntorobia gbakọrọ na 'Lekki Toll Gate' maka ngagharịiwe Endsars mgbọ nke gburu ụfọdụ mmadụ m a merụọ ndị ọzọ ahụ.

Mohbad candlelight procession: Ndị ntorobia amụnyela ọkụ maka otiegwu a nwụrụ

Ndị ntorobia na-eme ngagharịiwe maka Mohbad

Ndị ntorobia gụnyere otiegwu Davido, Falz na ndị ọzọ a ma a ma so na ndị mmadụ wujuru na Lekki, Legọs na mgbede taa bụ Tọzde maka mmemme 'Candlelight procession' iji kwanyere Ilerioluwa Aloba a ma dịka 'Mohbad' ugwu ikpeazụ ma kpọọ oku ka e nyocha ọnwụ ya.

Ndị ihe Mohbad na-amasị yi akwa ojii ma buru mpanaka a mụnyere ọkụ gbakọrọ na Lekki Toll Gate na mgbede Tọzde ebe Elekere Ise si ebe ahụ gaa na Muri Okunola Park ebe ụfọdụ ndị otiegwu kụrụ egwu ha ji were cheta nwa amadị ahụ .

Ndị ntorobia na-eme ngagharịiwe maka Mohbad

Ụfọdụ n'ime ndị ntorobia ahụ bu akwụkwọ ha deere ihe bụ uche ha nke gụnyere 'Onye gburu Mohad, "Nye Mohbad ikpenkwụmọtọ" wdg.

Ndị ntorobia na-eme ngagharịiwe maka Mohbad

Mohbad gbara afọ 27 nwụrụ n'ụlọọgwụ n'abalị 12 nke ọnwa Septemba, afọ 2023 site n'ọnọdụ ahụike edochaghị anya, e lie ya na-egbughị oge n'abalị 13 nke ọnwa Septemba,2023.

Ndị ntorobia na-eme ngagharịiwe maka Mohbad

Kemgbe ọ nwụrụ, ọtụtụ ụmụ Naijiria akpọọọla oku ka e nyocha etu o siri nwụọ.

Ndị ntorobia na-eme ngagharịiwe maka Mohbad
Ndị ntorobia na-eme ngagharịiwe maka Mohbad
Ndị ntorobia na-eme ngagharịiwe maka Mohbad
Mohbad: A bọpụtala ozu otiegwu aha ya na-akpọtụ
Mohbad na ili ya

Ebe foto si, Mohbad/Instagram/Screengrab

Dịka nnyocha na-aga n'ihu banyere etu otiegwu Ilerioluwa Aloba a ma ama dịka 'Mohbad' si nwụọ na-aga n'ihu, otu nnyocha pụrụ iche si Abuja gụnyere ndị uweojii na ndị uweojii nzuzo Naijiria bụ DSS n'ịchafụ abọpụtala ozu nwa amadi ahụ maka nnyocha.

Mohbad gbara afọ 27 nwụrụ n'ụlọọgwụ n'abalị 12 nke ọnwa Septemba, afọ 2023 site n'ọnọdụ ahụike edochaghị anya, e lie ya na-egbughị oge n'abalị 13 nke ọnwa Septemba,2023.

Mana ndị ọrụ nchekwa bọpụtara ozu ya dịka ọtụtụ ụmụ Naijiria na-eti mkpu ka e nyocha ihe gburu ya.

Ndị ihe ya na-amasị bụ ndị gbakọrọ dịka ndị ọrụ nchekwa gara ya bụ ije gosiri obi ụtọ ha na nnyocha banyere etu nwaamadi ahụ a ma dịka 'Imole' (nke pụtara 'ihe' n'asụsụ Igbo) amalitela.

Onu na-ekwuru ndị uweojii Legọs steeti bụ Benjami Hundeyin, onye gbara ama a n'ozi o wepụtara ụbọchị Tọzde n'akara oboozi ya na X(a mabu dịka Twitter), kwuru na ọ bụ iji nye ohere maka nnyocha ozu ahụ nke Bekee kpọrọ 'autọpsy'.

Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii anwụchiela nọọsụ a sị gbara ya ọgwụ n'ụlọọgwụ oge e bugara ya ụlọọgwụ.

Ndị na-eme ngagharịiwe maka ọnwụ Mohbad

Ebe foto si, Adedayo Okedare/BBC

Nkọwa foto, Ndị na-eme ngagharịiwe maka ọnwụ Mohbad na-akpo oku ka enye nwa amadị ahụ nwụrụ na nsonso a ikpenkwụmọtọ

Ngaghariiwe kpọtụrụ n'Delta, Ondo, Ogun, Legọs maka ọnwụ Mohbad

Ndị ihe otiegwu Oladimeji Alona a ma dịka "Mohbad" na-amasị emeela ngagharịiwe na mpaghara dị iche iche na Naijiria na-akpọ oku ka e nye nwamadị ahụ nwụrụ na nsonso a ikpenkwụmọtọ.

Ndị ntorobia yi akwa ojii na-agụ ụfọdụ egwu nwa amadi ahụ tiri wujuru ama n'Abeokuta, isiobodo Ogun steeti, Ibadan n'Oyo steeti, Asaba na Delta steeti, Akure n'Ondo steeti,Osogbo n'Osun steeti nakwa Legos steeti na-egosi iwe ha ma na-akpo oku ka e nyocha ọnwụ Mohbad.

Kemgbe ọ nwụrụ, soshal midia wuuru ọkụ dịka ụfọdụ na-eso ya na-ebo ebubo n'aka ndị nwe ụlọọrụ na-etipụta egwu a kpọrọ, 'Marlian Records' na otu n'ime ndi isi ọrụ ya bụ Samson Balogun,a ma dịka " Sam Larry", dị n'ọnwụ ya.

Marlian Records bụ ụlọọrụ na-etipụta egwu nke otiegwu Afeez Fashola a ma dịka Naira Marley nwe .

Ndị na-eme ngaharịiwe maka ọnwụ Mohbad

Ebe foto si, Adedayo Okedare/BBC

Naira Marley apụtala kwuo na ozi o wepụtara nna aka ya dị ọcha ma kpọọ ndị ọrụ cnhekwa oku ka ha nyọcha ọnwụ Mohbad.

Nke a na-abịa dịka ihe onyonyo dị iche iche na-egosi ebe a na-emekpa nwa amadi ahụ ahụ fegharịrị na soshal midia.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 3

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 4

Mohbad: Ịbọpụta ozu nwamadị a so n'ime nyocha ndị a ga-eme - Uweojii Legọs

Kọmishọna ndị uweojii na Legọs Steeti

Ebe foto si, OKAY.NG, @MOHBAD/INSTAGRAM

Ndị uweojii Legọs steeti ehiwela kọmitii mmadụ 13 ga-eme nyocha ịchọpụta ihe gburu oti egwu Oladimeji Alona nke e ji Mohbad maara.

Kamgbe nwamadị a nwụrụ n’ụbọchị 12 Sepụtemba, ọtụtụ ndị mmadụ ji aka #Justice4Mohbad na-akpọ oku na soshal midia sị ka e mee nyocha banyere ọnwụ ya.

Ozi si n’aka onye ndụmọdụ Gọvanọ Babajide Sanwolu nke Legọs steeti kwuru na ndị uweojii sị na ha ga-achọpụta ndị akaebe, ndị hụrụ ka ihe si mee nakwa ndị ọzọ chọrọ ịgba ama.

Nyocha ndị ha ga-eme gụnyere; ịbọpụta ozu ya, ‘autopsy/toxicology/histology’, ịga ebe ihe a mere, ụlọọgwụ ebe nakwa akwụkwọ nyocha ahụ ya, ndị a na-enyo enyo dgz.

Ozi ahụ kwuru na nyocha nke mbụ ga-apụta ihe n’ime izuụka abụọ.

Gọvanọ Sanwolu kwuru na ọ ga-anọ n’isi nyocha ahụ ịhụ na a chọpụtara ihe gburu nwamadị a.

Kedụ ndị so na kọmitii ahụ?

Kọmishọna ndị uweojii na Legọs Steeti

Ebe foto si, OK.ng

Ọ bụ mmadụ iri na atọ nọ na kọmitii ahụ ebe ACP Saheed Kassim ga-anọ n’isi ya.

Ndị ọzọ gụnyere; CSP Cris Oyeisi, SP Masta Alh. Bunu, SP Ibrahim A. Yusuf, DSP Ahmed Abdullahi, ASP Oderinde Galfar, ASP Alabi Bolanle, ASP Mohammed Yusuf, Inspector Adesida Adefisayo, Inspecor Ameh Michael, Inspector Oisa Roseline, Inspector Mayowa Owoeye, Inspector Babatunde Victor

Ndị ọkaiwu gụnyere; SP Cardoso Yetunde Esq, DSP Umar Bello Esq, ASP Augustine Nwabuisi Esq

Ndị ga-enyocha ahụ ya; DET. Csp Ayitu Akpama, DET. Inspr Elizabeth Olokode, DET. Inspr Queen Agofure.

Mohbad: Enyeghi nwamadị a nsi ọbụla n’ụlọọrụ anyị - NDLEA

Otiegwu a ma ama bụ Mohbad

Ebe foto si, Mohbad/Instagram

Ụlọorụ na-ebu agha megide ịtụmgbere ọgwụịke na Naịjirịa bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) agọọla na e nyeghi otiegwu Mohbad nsi ọbụla n’ụlọọrụ ha.

Dịka akụkọ banyere ọnwụ nwamadị a n’ụzọ na-edoghi anya pụtara ihe n’ụbọchị Tuzde gara aga, ihe onyonyo gosiri ebe nwamadị ahụ na-ebe akwa n’ụlọọgwụ nke mere ụfọdụ ndị Naịjirịa ji na-ebo ụlọọrụ NDLEA ebubo inye ya nsi oge ha nwuchiri ya.

N’ihe onyonyo ahụ, Mohbad kwuru na ụlọọrụ a nyere ya ihe dị mmiri mmiri n’ike sị ya ṅụọ, ma were isi egbe sụọ tupu ha mechaa sị ya lawa.

Mana ọnụ na-ekwuru NDLEA bụ Femi Babafemi kwuru na onweghi mgbe ha nwuchiri nwamadị ahụ ka ọ fọdụzie ịkpọchi ya.

O kwuru na o soghi n’otu n’ime ndị otu egwu Marlian Music ha nwuchiri n’afọ 2022, dịka ọtụtụ akụkọ si kwuo ma sị na ha enyeghi ya nsi ọbụla.

Babafemi gara n’ihu gosi akwụkwọ dere na ọ bụ mmadụ isii ka ha nwuchiri, ụmụnwoke anọ na nwaanyị abụọ.

Ndị a gụnyere; Oniyide Azeez (Zinoleesky), Owoeye Michael, Abimbola Ogbe, Dominica Chinwe, Olaolohun Shubomi Miriam na Ibrahim Alawo.

Cheta na onyeisi ndị uweojii enyela iwu sị ka e mee nyocha banyere ọnwụ Mohbad na-agbanyeghi na ezinaụlọ ya eliela ya n’ime otu ụbọchị ọ nwụchara.

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 5

Onye ọbụla nwere ozi ga-enyere anyị aka ịchọpụta etu Mohbad si nwụọ wetara anyị- Ndị uweojii Naijiria

Muyiwa Adejobi, Mohbad

Ebe foto si, BBC/Mohbad-Instagram

Lee ịhe nna ọgụ egwu na ewụ ewụ bụ Ilerioluwa Aloba, onye eji Mohbad mara were ịkwu maka ọwuụ nwa ya.

Na mparịtaụka emere n’ịhe oyonyo ubochi Satode, nna Mohbad kwụrụ:

‘’Maka ihe kwụrụ Mohbad nwam: ana m elọ na ọbụ ọgwụ agbara Mohbad kwurụ ya, na ezịa amaghị m ndị bugara Mohbad ụlọ ọgwụ ịhe nnụrụ bụ na mgbe ogbachara ọgwu ahụ agbara ya, obidoro gbọba agbọọ ya mere ha jiri buru ya gaa ba ụlọọgwụ.

Muna dokịta ekwughị,maka na esoghị m ha gaa ụlọọgwọ ebe ọnọ kwu, ahụrụ m ozụ Mohbad mgbe ha bulatara ya, Mgbe ahụ ka mụ siri ha bulatara m ozụ ya na Ikorodu ka m lịaa ya.

Okwukwe m bụ na ọbụ Chukwu wetere na Chukwu enwerego.

Maka Nsogbu ya na Naira Marley nwere: ịhe m nwere ịke ịkwu bụ na mgbe nwam na Naira Marey nwere nsogbu, ọweghị ịhe mere nwam mgbe ahụ. Mbochị ahụ ha were nsogbu, ejere m n’ụlọ Mohbad nwam, kpere ya ekpere, ka m kpechara ya ekpere, ọsịrị m na ọchụrọ ịpụ je hụ mmadu.

Mgbe ọna alọghachị,ọtụ enyi ya bia kwụtere m gwam na etiri Mohbad ịhe na ụlọ Marlians, ozịrị m ịhe akaebe mga eji kwete na ịhe ọna ekwu.

Onwere mgbe mu na Naira Marley kwụrụ na ekwu nti, mgbe nchọrọ ịkpọghachị ya, enweteghị m ya.

Dịka nkatọ na ụta na-arị ibe ya elu banyere ọnwụ otiegwu a ma ama bụ Oladimeji Aloba a ma dịka " Mohbad" , isiụlọụ ndịuweojii Naijiria arịọla ụmụNaijiria ka ha weta ozi ọbụla ga-eneyere ha aka ịchọpụta ime mere nwa amadị ahụ gwụrụ na nsonso a.

N'ozi ọnụ na ekwuru ndị uweojii Naijiria bụ Muyiwa Adejobi wepụtara na Twitter na nsonso a, o kwuru na "ndị uweojii Naijiria dị njikere ime nchọpụta zuru oke gbasara ọnọdụ ọnwụ ya, dịka enyerela Komishona Uweojii Legọs ntuziaka ka o nyochaa ka o siri nwụọ."

"Anyị na-agwa ndị ezinaụlọ ya maọbụ ndị ya na ya dị na mma nwere ozi dị mkpa ga-enye aka ga ha gakwuru Komishona ndị uweojii n=Legọs iji nyee aka mee nke a."

Skip X post, 6
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 6

 Benjamin Hundeyin na Mohbad

Ebe foto si, Benjamin Hundeyin /Mohabad/Twitter/Instagram

Ihe ndị uweojii kwuru maka ọnọdụ ọnwụ otiegwu a a ma ama

Ndị uweojii Legọs steeti ekwuola na ha ga-enyocha etu otiegwu a ma ma bụ bụ Oladimeji Aloba a ma dịka " Mohbad" si nwụọ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs steeti bụ Ben Hundeyin onye kwupụtara nke a n'ụbọchị Fraide dịka akụkọ nakwa ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia na-egosi ebe a na-eti ya ihe ma na amaja ya.

Mohad nwụrụ na nsonso a n'ọnọdụ edochaghị anya nke mere ka ọtụtụ ụmụ Naijiria malite ịkpọ oku ka ndị uweojii nyocha ka o siri nwụọ.

Oku ahụ kawanyere njọ dịka akwụkwọozi mkpesa Mohbad degara ndị uweojii na-ebeku ha ebubo na ndụ ya n'ihe egwu.

Nụmụ Naijiria malitere ịkatọ ndị uweojii sị na ha gbara nkịtị na emeghị ihe ọbụla oge nwaamadị ahụ nwụrụ bekuru ha, ma gbakwa nkịtị na-emeghị nnyocha ọbụla oge ọ nwụrụ

Mana n'ọsịsa ya, ọnụ na-ekwuiru ndị uweojii Legọs bụ Benjamin Hundeyin kwuru n'ozi o wepụtara n'ọbaozi X (Twitter) na ndị Mohmad wegara mkpesa bụ ndị isi ya na ya enweghị ike itinyeli nọnụ n'okwu ahụ dịka ọ dịịrịghị ya.

Skip X post, 7
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 7

Mohbad di m tara ahụhụ ruo oge ọnwu ya - Nwunye Mohbad

Mohbad na nwunye ya Wunmi

Ebe foto si, @_C33WHY_/INSTAGRAM

Nwunye oti egwu a ma ama bụ Oladimeji Aloba e ji Mohbad maara ekwụpụtala ahụhụ di ya tara tupu oge ọnwụ ya.

Nwada a a kpọrọ Wunmi kwuru nke a n'ihi onyonyo o mere n'Instagram dịka ọ na-eru uju di ya.

O kwuru na ọ tara ahụ maka na o nwere ọtụtụ ihe na-akpagbu ya tinyere ọtụtụ ndị na-eyi ya egwu.

Wunmi kwuru na di ya na-ebi ndụ n'ụjọ nakwa n'ịlụ ọgụ oge niile, "obi adịghị ya mma n'ime otu ụbọchị."

"Ha na-akpọ ya onye nwere isi mgbaka iji katọọ ya n'ihu ọha."

Nwada a gwara arịrị ma sị "ugbua abụrụla m nwaanyị ajadu n'afọ iri abụọ na anọ (24)."

Ọ gara n'ihu kwuo na o tebeghi anya ha ka mụrụ nwa ha nwoke bụ onye dị naanị ọnwa ise.

Ihe ezinaụlọ Mohbad kwuru banyere ọnwụ ya

Ezinaụlọ nwamadị a kwupụtara ọnwụ ya

Ebe foto si, Mohbad/Instagram

Ezinaụlọ Mohbad bụ nwamadị na-eti egwu a ma ama ekwupụtala maka ọnwụ ya.

N’ozi ha wepụtara n’akara soshial midia nwamadị a kwuru na “ọ bụ obi mwute ka anyị ji ekwupụta ọnwụ Promise Oladimeji Aloba e ji Mohbad (Imole)maara, nke nwụrụ taa 12 Sepụtemba 2023.

“Mohbad bụ ihe mgbe ọ dị ndụ ruo oge ọnwụ ya, dịka anyị na-eru uju ya, anyị na-arịọ ka onye ọbụla biko kwanyere ya na ezinaụlọ ya ugwu.”

N'ozi a ezinaụlọ ya wepụtara, ha ekwughi ihe ọbụla banyere etu o si nwụọ nakwa ihe gburu ya.

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of Instagram post

Ihe ụfọdụ ndị a ma ama na-ekwu maka ọnwụ Mohbad

N'abalị Tuzde ka akụkọ banyere ọnwụ ya malitere iwu aghara aghara na soshal midia.

Nke a mere ọtụtụ ndị a ma ama gụnyere ndị oti egwu ibe ya na ndị ọzọ jiri na-edepụta ozi banyere ọnwụ ya na soshal midia.

Olamide na-eti dere n'akara soshal midia X sị 'Chaị! Mohbad! ma sị ka mkpụrụobi ya laa na ndokwa.

Onye ọzọ na-eti egwu a kpọrọ Emeka Akumefule e ji Blaqbonez maara dekwara sị "Laa n'udo Mohbad, ka ị chọta udo."

N'otu aka ahụ oti mkpu a ma ama bụ Okechukwu Pascal e ji 'Cubana Chiefpriest' maara' dere n'Instagram ma sị na ya Mohbad nọ n'ụbọchị abụọ gara aga.

Ihe i kwesịrị ịma maka Mohbad

Mohbad bụ oti egwu a ma ama

Ebe foto si, Mohbad/Instagram

  • Mohbad so n'otu n'ime ndị Naịjirịa na-eti egwu ka na-amụke amụke, a mụrụ na Legọs n'afọ 1996.
  • O sobu n'otu egwu nke Naira Marley nwe a kpọrọ 'Marlian Records" mana ọ hapụrụ otu ahụ n'afọ 2022 n'ihi nghọtahie.
  • O kwuru ihe maka ihe butere esemokwu ha na mkparịtaụka ya na otu onye a ma ama bụ Tacha nwere na redio.
  • O kwuru na ha kewapụtara n'otu ahụ ma hiwe nke ya a kpọro 'Imolenization'. "Anyị chọrọ ị nọrọ onwe anyị mana ọ dịghị mfe."
  • O tipụtara efere egwu mbụ ya n'afọ 2020 bụ wuru ewu maka ụfọdụ ndị dị na ya gụnyere, Ponmo, Feel good na Ko Por Ke nke ya Rexxie so tie.
  • Ya na ọtụtụ ndị oti egwu a ma ama dịka Bella Shmurda, Small Doctor, Zlatan na ndị ọzọ etikọọla egwu.