Ihe mere anyị ji mapụta N61.2m iji lie mmadụ 103 nwụrụ n'oge End Sars - Gọọmentị Legọs

End sars

Akwụkwọ ozi gọọmentị Legọs nke pụtara ihe na nsonso a egosila na gọvanọ steeti ahụ Babajide Sanwo-Olu mapụtara nde naịra iri isii na abụọ na ụma (N61.28m) maka olili ndị nwụrụ n'oge ngagharịiwe End SARS nke afọ 2020.

Mpụta ihe akwụkwọ ozi a kpalitere nrụrịtaụka na soshal midia Naịjirịa n'ụbọchị Sọnde, Julaị 23, n'ihi na gọọmentị Legọs Steeti gọburu agọ na onweghị ndị nwụrụ na ngagharịiwe ahụ, ọ kachasị na mpaghara Lekki Toll Gate, bụ ebe ndị agha gbara egbe ma chụsaa ọtụtụ ndị mmadụ.

Mana onye ji ọkwa 'Permanent Secretary' na ngalaba ahụike na Legọs steeti bụ Gboyega Akosile, kwuru na ndị ahụ a chọrọ ili "abụghị ndị nwụrụ na Lekki Toll gate, kama ha bụ ndị nwụrụ na mpaghara dị icheiche na Legọs n'oge ngagharịiwe ahụ".

Akwụkwọ ozi

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, Akwụkwọ ozi na-efesa na soshal midia gosiri ego ole gọọmentị Legọs mapụtara iji lie ndị nwụrụ na ngagharịiwe End SARS

Olee ndị a chọrọ iji N61m lie?

End sars

Cheta na Gọvanọ Sanwo-Olu kwuru na onweghị onye ọbụla mgbọ tụtara na Lekki Tollgate n'abalị ụbọchị 20 nke ọnwa Ọktoba 2020 dịka ndị agha ji egbe chụsaa ndị mmadụ.

O mechara kwuo na ọ bụ otu onye nwụrụ, mechakwaa, n'ebe ọzọ kwuo na ọ bụ mmadụ abụọ ka a ma nwụrụ.

Mana nnyocha nke ọtụtụ ụlọ ntaakụkọ, tinyere BBC, mere, nakwa akwụkwọ ozi nke otu dị icheiche na-azọ maka ikike dịịrị mmadụ dịka 'Amnesty International, gosiri na mgbọ tụgburu ụfọdụ mmadụ n'ụbọchị ahụ.

Kọmiti nke gọọmentị Legọs hibere iji nyochaa ihe mere n'ụbọchị ahụ, kwukwara n'eziokwu na ndị agha "kpochapụrụ ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe na-ejighi ngwaọgụ ọbụla".

N'akwụkwọ mpụtara nnyocha kọmiti ahụ, ha kwuru na ihe mere na Lekki Tollgate n'ụbọchị 20 nke ọktoba 2020 bụ 'massacre", mana gọmentị Legọs sị na ha ekweghị.

Nkọwa Mịnịstrị ahụike nyere

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Gboyega Akosile, so na ndị isi na ngalaba ahụike na Legọs steeti, kọwara site n'akara Twitter ya n'ụbọchị Sọnde, Julaị 23, 2023, na ndị na-ekwu na ọ bụ ndị nwụrụ na Lekki Toll Gate ka gọọmentị chọrọ ili na nzuzo, bụ ndị okwu ụgha nakwa ndị iro gọọmentị.

Akosile kwuru na ndị mmadụ nwụrụ na mpaghara dị icheiche na Legọs dịka ngagharịiwe End SARS na-aga n'ihu, mana onweghị kama otu ozu mmadụ e butere na Lekki Tollgate.

"Onweghị ihe akaebe ọbụla dị n'akwụkwọ nnyocha dị icheiche e mere nke kwuru na ọbụladị otu onye nwụrụ n'ọgbaghara dapụtara na Lekki," Akosile kwuru.

Ọ gara n'ihu kwuo na gọọmentị mara ọkwa ka onye ọbụla nwanne ya maọbụonye ezinụlọ ya nwụrụ n'oge ngagharịiwe End SARS gaa n'ụlọọgwụ LASUTH ga kọwaa onwe ya ma buru ozu onye nke ya, "mana onweghị onye ọbụla gara iburu ozu ndị ahụ".

Akosile kwuru na ozu ndị ahụ adọrọla n'ụlọozu ihe chọrọ iru afọ atọ ugbua, na-ewekọrọ ohere, nke mere o ji dị mkpa ibupu ha iji mee ka ohere dị.

O kwuru na gọọmentị gbasoro usoro ahụike nakwa usoro iwu niile e kwesịrị ịgbaso dịka ha na-eme nke a, ka ọ ga-abụ onwegodi onye bịara iburu ozu onye nke ya n'ọdịnihu, ọ ga-enweta nkọwa ga-eju ya afọ.

"Gọọmentị na-arịọ ndị na-akọ asịrị na soshal midia ka ha biko nye ohere ka ezinụlọ nwe ozu ndị ahụ na-abịaghị buru ha nweta mkpuchi ha kwesịrị," Akosile dere.

End SARS - Ngagharịiwe gbanwere Naịjirịa

End Sars
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ngagharịiwe End SARS malitere n'ihi aka ike ndị uweojii Naịjirịa ji emeso ndị ntorobịa ihe na mpaghara dị icheiche, ọ kachasị ngalaba ndị uweojii na-ebuso ndị ojiegbe esu ohi agha, a kpọrọ 'Specia Anti-Robbery Squad' (SARS).

Ndị mmadụ na-ekpesa na ndị uweojii a na-eji aka ike anapụ ndị mmadụ ihe, ibo ndị mmadụ ebubo ụgha iji napụ ha ego, nakwa mgbe ụfọdụ igbu ndị aka ha dị ọcha n'ụzọ iwu akwadọghi.

Nke a mere ka ọtụtụ ndị ntorobịa malite ngagharịiwe iji kpọọ oku ka e mechie ngalaba uweojii ahụ bụ Sars, ma kwụsịkwa mmekpa ahụ ndị uweojii.

Ngagharịiwe a fesara na steeti dị icheiche na Naịjirịa ma mekwaa ka obodo Naịjirịa niile maa jijiji.

Na Legọs, ụfọdị ndị ekperima weere ohere ngagharịiwe ahụ malite imebi ihe gọọmentị, ịgba ụlọ, ụgbọala nakwa akụrụngwa gọọmentị ọkụ, ịwakpo ụlọahịa ndị mmadụ, na ọtụtụ mpụ ndị ọzọ.

Nke a mere ka ndị agha pụta were egbe wakpo ebe ndị na-eme ngagharịiwe gbakọrọ na mpaghara Lekki, chụsasịa ndị nkịtị nọdụrụ ala, na-efe ọkọlọtọ Naịjirịa, ma na-ekwekwa ukwe njirimara Naịjirịa.

Kọmiti nyochara ihe a mere na Legọs kwuru na ndị agha gbagburu ọtụtụ ndị nkịtị na-eme ngagharịiwe n'ụbọchị ahụ, mana gọọmentị Legọs na gọọmentị etiti na agọ agọ ruo taa, na-ekwu na onweghị onye ọbụla ndị agha gburu na Lekki.

Ụbọchị 20 nke ọnwa Ọkụtoba afọ a ga-eme ya afọ atọ ndị agha mere mwakpo a na Lekki Tollgate.