End Sars Memorial: O nweghi akaebe gosiri na e gburu ndị mmadụ na Lekki Toll Gate - Lai Mohammed

Minista mgbasaozi na Naịjirịa bụ Lai Mohammed

Ebe foto si, Lai Mohammed

Gọọmentị etiti ekwuola na o nweghi ihe akaebe ọbụla gosiri na e gburu ndị na-eme ngagharịiwe na Lekki Toll gate n'ụbọchị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Ọktoba afọ 2020.

Minista na-ahụ maka mgbasaozi bụ Lai Mohammed gwara ndị ntaakụkọ nke a n'Abuja dịka ọtụtụ ndị ntoroọbịa na-eme ngagharịiwe iji icheta ụbọchị ahụ.

Mohammed sị na nyocha mgbọ egbe nke ngalaba na-ahụ maka ikike dịịrị onye n'Amerịka mere gosiri na ihe ndịagha kwuru na o nweghi ndị ha gbara egbe bụ eziokwu.

Ọ gara n'ihu kwuo na gọọmentị etiti nakwa nke steeti dị iche iche ga-agbakọ aka ọnụ ịhụ na a kwụrụ ezinaụlọ ndị mmkpagbu ndị uweojii metụtara ụgwọ iti aka n'obi.

Mohammed sị ka ụlọọrụ dịka CNN na Amnesty International rịọ mbaụwa mgbaghara maka ibu 'akụkọ ụgha' na e gburu ndị mmadụ na Lekki Toll Gate.

Otu na-ahụ maka ikike dịịrị onye n'ụwa bụ Amnesty International nke ngalaba Naịjirịa ekwuola na ndịagha nakwa ndị uweojii gburu ndị mmadụ ruru iri na abụọ bụ ndị na-eme ngagharịiwe EndSars n'afọ gaara aga.

Ozi si n'akara Facebook ha pụta na-akọwa na kamgbe ahụ na o nwebeghi onye a marala ikpe maka mmkpagbu dị iche iche ndị uweojii mesoro ndị mmadụ.

End Sars Memorial: Ihe mere mgbe Charlie Boy wuchiri na Lekki Toll Gate

Charlie Boy na-eme ihe onyonyo wuchiri na Lekki toll gate taa bụ October 20,2021
Nkọwa foto, Charlie Boy na-eme ihe onyonyo wuchiri na Lekki toll gate taa bụ October 20,2021

Charles Chukwuemeka Oputa e ji Charly boy wee mara wuchiri na Lekki toll gate n'ehihie taa bụ October 20, 2021.

Ndị uweojii ahụhala ya, bido gbawa anwụrụ ose ka ha chụsasia ndị mmadụ gbakọrọ ebe ahụ kamgbe ụtụtụ eme ngaghariwe.

Ha kwuru na ọ bụ makana ndị bu ngaghariwe End Sars n'isi gwara ha na ha ga-eme ngaghariwe bido n'elekere asatọ nke ụtụtụ ruo nke iri nke ụtụtụ ahụ kwa.

Nke a mere ka ha chụsịasia ndị bidoro pụtawa mgbe elekere iri kụchara, dịka onye ntaakụkọ anyị si chọpụta.

Aha onyonyo, Angela Okorie na-eme ejije sonyere ngagharịiwe END SARS n'Ebonyi steeti

'Njiji jiri mgbe anyị garuru n'Okpara Square dị n'Enugu n'ụtutụ a'- Ndị ntorọbịa na-eme ngaghariwe ncheta End Sars n'Abuja

Ndị Enugu na-eme ngaghariwe ncheta Endsars
Nkọwa foto, Ndị Enugu na-eme ngaghariwe ncheta Endsars

Ndị uweojii nwụchịrị ụfọdụ ndị ntorobịa nọ n'Enugu eme ngaghariwe ncheta End sars n'Okpara Square n'ụtụtụ a.

Onye ntaakụkọ anyị nọ ebe ahụ kwuru na mgbe ndị Enugu na-eme ngagjhariwe ruru n'Okpara square, ndị uweojii na ndị agha gbara ha okirikiri.

"Ha gwara anyị niile nọrọ n'ala n'okporoụzọ dịka ndị ori.", bụ ihe ntaakụkọ BBC kọwara.

Ndị ntoroọbịa nọ n'Enugu kwuru na ha chọrọ ka enye ndị niile nwụrụ n'oge End Sars maọbụ ndị uweojii gburula ikpe kwụ ọtọ.

Ha kwukwara na ha chọrọ ka e cheta ezinụlọ ndị nke ha nwụrụ n'October 20, 2020 maka End Sars.

Onye na-eme ncheta ngaghariwe n'Lagos anwụchiri
Nkọwa foto, Onye na-eme ncheta ngaghariwe nche End Sars na 'Lagos anwụchiri

Ndị na-eme ngaghariwe n'Abuja ji ozi ọzọ pụta

Ndị na-eme ncheta ngaghariwe n'Abuja

Ụfọdụ ndị na-eme ngaghariwe n'Abuja ji ọkọlọtọ e dere ozi dị iche iche wee mee nke ha.

Ozi ahụ kwuru na atụmaatụ EndSars bụ ụgha, ma na-ekwu na ndị hibere ya ji ya ememina gọọmenti nọ n'ọkwa ugbua.

Ozi ha na-ajụ "kedụ ebe ahụ ndị a agbagburu na ngaghariwe End sars nke afọ 2020 , abalị October 20 nọ ụgbụa?"

Ndị nọ n'Abuja eme ngaghariwe

Ụfọdụ ndị ọzọ pụtara n'Abuja na-ekwu na ha chọrọ ka akwụsị mmegbu ndị uweojii na-emeso ndị mmadụ na Naịjiria.

Ndị na-eme ncheta ngaghariwe End SARS n'Abuja

Ebe foto si, BBC

Falz, Mr Macaroni awụchiela n'ọgbọ Lekki toll gate ebe a na-eme ncheta ngaghariwe Endsars na Legọs

FALZ NA MR MACARONI

Otiegwu ama ama dịka Falz eigbo aha bụ Folarin Falana nakwa Mr Macaroni bụ ọkpaọchị ama ama bu ụgbọala ha gafee na Lekki toll gate.

Ha ji ọkolọtọ Naịjirịa n'akaa ma na-ekwu na ha chọrọ ka ndị uweojii kwụsị oke ogbugbu ndị aka ha dị ọcha.

Mr Macaroni kwuru na ndị uweojii ka na-egbu ụmụ mmadụ aka ha dị ọcha.

Ndị mmadụ jizi nwayọ rituo n'ụgbọala ha ma na-agụzị egwu, " ha ga-egbugide anyị ruo mgbe ike ga-agwụ ha."

Ndị uweojii biara nso ma na-arịọ ndị na-eme ngaghariwe ka ha ghara ịkwụ akwụ kama ha gawa n'ihu maka ibute kpachị kpachị.

Ngwa ọgụ anapụtara ndị bịara ncheta ngagharịiwe Endsars 2021
Nkọwa foto, Ngwa ọgụ anapụtara ndị bịara ncheta ngagharịiwe Endsars 2021

Etu e si nwụchie mmadụ abụọ na ncheta ngaghariwe End sars na-eme Lekki toll gate n'ututu a

Anwụchiela otu onye ntaakụkọ na ngaghariwe ncheta End Sars na-aga n'ihu na Lekki toll gate n'ututu a.

Ndị uweojii nwuyere ya n'ụgbọala "black maria" ma buru ya gawa ebe mmadụ amaghị.

Aha ya bụ Akinsola na-arụ n'ụlọọrụ ntaakụkọ akpọrọ Legit Nigeria.

Ndị uweojii nwụchikwara otu onye ha hụrụ bu akwụkwọ ngaghariwe ebe ahụ a na-amabeghị aha ruo ugbua.

Onye ntaakụkọ BBC nọ na Lekki toll gate ugbua gosiri onyonyo ndị ọrụ nchekwa nakwa ụgbọala ha juru ebe ahụ n'ụtụtụ a.

Igwe mmadụ agbakọghị ebe ahụ dịka e si eche.

Kama ndị mmadụ bu ụgbọala ha agafe ebe ahụ.

Protester

Ebe foto si, AFP

Kedụ etu e si nwụchie onye ntaakụkọ ahụ?

Ndị uweojii kwuru na onye ntaakụkọ ahụ egosighị njirimara ya.

Mana onye ntakụkọ BBC kwuru na ndị uweojii echeghị ka nwammadị ahụ wepụta akwụkwọ njirimara tupu ha nwuchie ha.

Akụkọ ka na-abia.